Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE BAỊBỤL KWURU

Ego

Ego

Ego ọ̀ bụ mgbọrọgwụ ihe ọjọọ?

“Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.”—1 Timoti 6:10.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ego bụ mgbọrọgwụ ihe ọjọọ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọ bụ “ịhụ ego n’anya” na-akpata nsogbu, ọ bụghị ego n’onwe ya. Eze Sọlọmọn nwere ezigbo ego n’oge ochie. Ma, o kwuru nsogbu atọ ndị hụrụ ego n’anya na-enwe. Nke mbụ bụ iche oké echiche. “Ọtụtụ ihe onye ọgaranya nwere adịghị ekwe ya ka ọ rahụ ụra.” (Ekliziastis 5:12) Nke abụọ bụ na afọ anaghị eju ha. “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.” (Ekliziastis 5:10) Nke atọ bụ na ọnwụnwa na-abịara ha ka ha mee ihe ọjọọ. “Onye ọ dị ngwa ngwa ịba ọgaranya agaghị abụ onye aka ya dị ọcha.”—Ilu 28:20.

 Olee uru ego bara?

“Ego bụ ihe nchebe.”—Ekliziastis 7:12.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ego na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ, obi eruokwa ya ala.

IHE BAỊBỤL KWURU

Mmadụ iche na ego ga-eme ka o nwee obi ụtọ, obi eruokwa ya ala bụ otu n’ime ụzọ akụnụba si aghọ mmadụ aghụghọ. (Mak 4:19) N’agbanyeghị nke a, “ego na-egbo mkpa niile.” (Ekliziastis 10:19) Dị ka ihe atụ, anyị na-eji ego azụta ihe ndị dị anyị mkpa dị ka nri ma ọ bụ ọgwụ anyị na-aṅụ ma ahụ́ adịghị anyị.—2 Ndị Tesalonaịka 3:12.

Anyị na-ejikwa ego elekọta ndị ezinụlọ anyị. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịa, ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe anyị.”—1 Timoti 5:8.

Olee otú ị ga-esi jiri ego na-eme ihe bara uru?

‘Buru ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu.’—Luk 14:28.

IHE BAỊBỤL KWURU

Jiri ego gị na-eme ihe bara uru. (Luk 16:9) Anyị ekwesịghị ịna-emefusị ego. Anyị kwesịkwara ịna-akwụwa aka ọtọ n’ihe ọ bụla anyị ji ego eme. (Ndị Hibru 13:18) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-ekowe akpa anyị ebe aka anyị ruru, anyị ekwesịghị ịhụ ego n’anya.—Ndị Hibru 13:5.

Baịbụl ekwughị na ibiri mmadụ ego adịghị mma kama, ọ sịrị: ‘Onye gbaziiri ihe bụ ohu onye gbazinyere ya ihe.’ (Ilu 22:7) Anyị ekwesịghị ịna-eme ihe ọ bụla anyị hụrụ anyị azụrụ maka na “onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.” (Ilu 21:5) Kama ịna-azụ ihe ọ bụla anyị hụrụ, anyị kwesịrị ịna-ewepụta ego anyị ga na-edebe, ka anyị nwee ike inwe ego anyị ga-eji na-eme ihe ndị dị mkpa.—1 Ndị Kọrịnt 16:2.

Baịbụl gwara anyị ka anyị na-enye ndị ọzọ ihe. (Luk 6:38) Ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-emesapụ aka maka na “Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” (2 Ndị Kọrịnt 9:7) N’ihi ya, “echefukwala ime ihe ọma na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.”—Ndị Hibru 13:16.