Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Amamihe Na-akpọ Òkù—Ị̀ Na-anụ Ya?

Amamihe Na-akpọ Òkù—Ị̀ Na-anụ Ya?

“Amamihe ọ́ nọghị na-akpọ òkù, nghọta ọ́ nọghịkwa na-eti mkpu? N’elu ebe dị elu, n’akụkụ ụzọ, n’ebe e si agafe n’okporo ụzọ, ka o guzo. . . . N’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá, ka ọ nọ na-eti mkpu n’oké olu.”ILU 8:1-3.

AMAMIHE bara ezigbo uru. Ọ bụrụ na mmadụ amaghị ihe, ihe niile ọ na-eme ga na-aga aka ekpe aka ekpe. Ma, olee ebe anyị ga-esi nweta amamihe? Amamihe onye dere akwụkwọ Ilu bu n’obi bụ amamihe na-enweghị atụ Chineke nwere. E dere banyere amamihe Chineke n’otu akwụkwọ pụrụ iche. Akwụkwọ ahụ bụ Baịbụl. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ mmadụ niile ka o ruru aka. Ka anyị tụlee otú amamihe si akpọ òkù:

  • Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na e nweghị akwụkwọ zuru ụwa ọnụ ka Baịbụl. O kwukwara na a sụgharịala ya ọtụtụ ugboro, nakwa na ọ dị n’ọtụtụ asụsụ karịa akwụkwọ ọ bụla. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na Baịbụl dị na puku asụsụ abụọ na narị isii, ma ndị nke bụ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik ma ndị nke bụ ma Akwụkwọ Nsọ Grik ma nke Hibru. N’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ụwa ka Baịbụl na-erughị aka.

  • E nwekwara ụzọ ọzọ amamihe si “na-eti mkpu n’oké olu.” Matiu 24:14, kwuru, sị: ‘A ga-ekwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.’

“Ozi ọma” a bụ amamihe n’ihi na ọ na-ekwu na Chineke ga-eji Alaeze ya mee ka nsogbu ụmụ mmadụ bie. Alaeze ahụ bụ ọchịchị Chineke nke ga-achị ụwa niile. (Daniel 2:44; 7:13, 14) Ọ bụ ya mere Jizọs Kraịst ji kpee ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:9, 10.

Obi dị Ndịàmà Jehova ụtọ na ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ná narị mba abụọ na iri atọ na itoolu. N’eziokwu, amamihe nke si n’aka Chineke “na-eti mkpu” n’ebe niile, ọbụna “n’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá.” Ị̀ na-anụ ya?