Amamihe nke Ga-eme Ka Ị Na-enwe Obi Ụtọ
“Ọ bụ eziokwu na ihe ọjọọ ndị dị n’ụwa a, dị ka agha, ịda ogbenye, ọrịa, na mmegbu a na-emegbu ụmụaka na-ewute m, ma ugbu a, enwere m olileanya.”—RANI. *
Rani malitere inwe ezigbo obi ụtọ mgbe ọ mụtara banyere Onye na-eme ka mmadụ nwee amamihe, ya bụ, Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ka ị na-agụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a, chọpụta otú ihe Chineke na-akụziri anyị ga-esi nyere gị aka . . .
ka obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ gị
ka gị na ndị ọzọ na-adị n’udo
ka ihe i nwere na-eju gị afọ
ka ị mata ihe mere anyị ji ata ahụhụ ma na-anwụ anwụ
ka i nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu
ka ị mata Onye kere anyị ma bịaruo ya nso
Ị ga-amatakwa na Chineke anaghị enye ndị ụfọdụ amamihe ya ma hapụ ndị ọzọ, kama ọ na-enye ya ndị niile chọrọ inweta ya.
^ par. 2 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’akwụkwọ a abụghị ezigbo aha ha.