ỤWA ANYỊ A Ọ̀ GA-ADỊGIDE?
Oké Ọhịa
E KWUOLA na ọ bụ ọhịa ji ihe ndị dị n’ụwa ndụ, e nwekwaranụ ezigbo ihe mere e ji kwuo otú ahụ. Osisi na-amịkọrọ ikuku kabọn dayọgzaịd (carbon dioxide). A sị na ọ bụghị ya, ikuku a gaara akpatara anyị nsogbu. Osisi na-ewepụtakwa ikuku ọksijin (oxygen). Ikuku a so n’ihe dị mkpa dị n’ezigbo ikuku anyị na-ekuru. E kee ahịhịa na anụmanụ niile e nwere n’ụwa a ụzọ iri, ebe a ga-ahụ ụzọ asatọ n’ime ha bụ n’oké ọhịa. Ọ bụrụ na oké ọhịa adịghị, anyị agaghị adịli ndụ.
Ihe Ndị Na-emebi Oké Ọhịa
Kwa afọ, a na-egbutu ọtụtụ nde osisi. Isi ihe mere e ji egbutu ha bụ ka a hụ ebe a ga-akọ nri. Kemgbe ihe dị ka afọ iri asaa na ise gara aga, a sụọla ọkara oké ọhịa ndị e nwere n’ụwa.
A sụọ oké ọhịa, a na-egbu ahịhịa na anụmanụ niile bi na ya.
E Kere Ụwa Anyị A Ka Ọ Dịgide
E nweela ụfọdụ oké ọhịa ndị a sụchara, ha ejiri aka ha ruteghachi. Ndị ọkachamara chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya otú oké ọhịa ndị a sụkpọrọ si toghachi n’onwe ha, bụrụkwa ezigbo oké ọhịa. Ihe a ha chọpụtara tụrụ ha n’anya. Legodị ihe atụ ndị a:
-
E nwere oké ọhịa ndị a sụchara ka a kọọ ugbo na ha, mana e mechaa hapụ ha, ha atọgbọrọzie nkịtị. Ndị na-eme nchọpụta tinyere anya n’ebe ndị ahụ ka ha mara ihe ga-emenụ. Ala ndị ha mere nchọpụta a dị puku abụọ na narị abụọ (2,200) n’Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu nakwa n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Ihe ha chọpụtara gosiri na ala nwere ike ịbụrụghachi oké ọhịa n’ime afọ iri.
-
Otu magazin aha ya bụ Science kwuru na ndị na-eme nchọpụta ekwuola na n’ime otu narị (100) afọ, ala a sụchara ọhịa dị na ya nwere ike inwe ụdị osisi dị iche iche na ihe ndị ọzọ dị ndụ na-adị n’ezigbo oké ọhịa.
-
Na nso nso a, ndị ọkà mmụta sayensị e nwere na Brazil mụrụ gbasara otú ala si eji aka ya aghọ oké ọhịa nakwa otú ala ndị mmadụ dọrọ osisi na ha si aghọ oké ọhịa.
-
Akụkọ si n’aka National Geographic kwuru ihe ndị ọkà mmụta ahụ chọpụtara. Ọ sịrị: “Obi tọrọ ha ụtọ ịchọpụta na ọ dịghị mkpa ịdọ osisi ọ bụla.” Naanị n’ime afọ ise, “osisi ndị e nwere n’obodo ahụ juru” n’ala ndị ahụ n’enweghị onye dọrọ ha.
Ihe Ndị Mmadụ Na-eme Ka Nsogbu A Kwụsị
N’ụwa niile, ndị mmadụ agbaala mbọ ka e chekwaa oké ọhịa ndị dị adị nakwa ka e mee ka ndị nke a na-achọ ịsụkpọ dịghachi otú ha dịbu. Ozi si n’aka Òtù Mba Ụwa kwuru na n’ihi mbọ a a na-agba, “mgbukpọ a na-egbukpọ oké ọhịa n’ụwa niile ejirila pasent iri ise belata” kemgbe afọ iri abụọ na ise gara aga.
Ma, mbọ ndị a a na-agba ezubeghị iji chebe oké ọhịa anyị. Nchọpụta otu ụlọ ọrụ aha ya bụ Global Forest Watch bipụtara kwuru, sị: “Oké ọhịa ole a na-egbukpọ kemgbe afọ ole na ole ugbu a ebelatabeghị.”
Ịwa osisi n’anataghị gọọmenti ikike bụ ihe ọtụtụ ndị ji akpa ezigbo ego. Ọ ka bụkwa isi ihe na-akpata mgbukpọ a na-egbukpọ oké ọhịa.
Ihe Mere Obi Ga-eji Sie Anyị Ike—Ihe Baịbụl Kwuru
“Jehova a Chineke wee mee ka osisi ọ bụla nke dị mma ile anya, nke mkpụrụ ya dịkwa mma oriri, puo n’ala.—Jenesis 2:9.
Onye kere ọhịa niile kere ha ka ha nwee ike iji aka ha pụteghachi ma mmadụ si na ha gburu osisi ọ ga-eji mee ihe bara uru. Chineke chọrọ ka oké ọhịa niile na ihe ndị dị ịtụnanya dị na ha dịgide.
Baịbụl gosiri na Chineke ga-eme ka mmebi a na-emebisị ụwa na ihe ndị dị n’ime ya kwụsị. Gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide.” Ọ dị na peeji nke 15.
a Jehova bụ ezigbo aha Chineke—Abụ Ọma 83:18.