Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gị na Ndị Enyi Gị?
Isi n’ekwentị na iimel ezirita ozi ma ọ bụ isi n’Ịntanet akparịta ụka emeela ka ọ dị mfe mmadụ na ibe ya ịkparịta ụka ọ bụrụgodị na ha nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ihe ndị a e ji akparịta ụka na-abara ndị ji ha eme ihe otú dị mma uru.
Ma, ọ bụrụ na ọ bụ naanị ihe ndị a ka mmadụ na ndị enyi ya na-eji akparịta ụka, o nwere ike ime ka onye ahụ . . .
-
ghara ịna-enwere ndị enyi ya ọmịiko.
-
na-eche na o nweghị uru ọ bara.
-
na-echekarị gbasara onwe ya kama iche gbasara ndị ọzọ.
IHE NDỊ I KWESỊRỊ ỊMA
INWE ỌMỊIKO
Ihe ga-enyere mmadụ aka inwere onye ọzọ ọmịiko bụ iwepụta oge, wetuo obi ala chee banyere onye ahụ. Ma, ime ihe a ga-esi ike ma ọ bụrụ na ihe anyị ji oge anyị niile na-eme bụ izipụ ozi na ịgụ ozi ndị ọzọ zitere nakwa ile ihe ndị ha tinyere n’Ịntanet.
Ọ bụrụ na i nwere ọtụtụ ozi ị ga-azaghachi, o nwere ike isiri gị ike ịzaghachi ozi ezigbo enyi gị ziteere gị. Ihe ga-abụzi mkpa gị bụ ịzaghachi ozi niile e ziteere gị. O nwere ike ị gaghịzi ama na o nwere enyi gị chọrọ ka i nyere ya aka.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú ị ga-esi gosi na ihe banyere ndị enyi gị ‘na-emetụ gị n’obi’ mgbe gị na ha na-akparịta ụka n’Ịntanet?—1 PITA 3:8.
MMADỤ ICHE NA O NWEGHỊ URU Ọ BARA
Otu nchọpụta e mere gosiri na ọtụtụ ndị anaghị enwe obi ụtọ ma ha lechaa ihe ndị ọzọ tinyere n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet. Ndị mere nchọpụta ahụ kwuru na mmadụ jiri oge ya niile lechaa foto na ihe ndị ọzọ ndị mmadụ tinyere, na o nwere ike “ịdị onye ahụ ka o nweghị ihe bara uru o ji oge ahụ mee.”
Ihe ọzọ bụkwa na mmadụ lechaa foto ndị ọzọ tinyere, o nwere ike ime ka o jiri onwe ya tụnyewara ndị ahụ. O nwere ike ịdị onye ahụ ka ihe ọ̀ na-agaziri ndị ọzọ, mana ọ naghị agaziri yanwa.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ị nọrọ n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, olee otú ị ga-esi zere iji onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ?—NDỊ GALESHIA 6:4.
MMADỤ ỊNA-ECHEKARỊ BANYERE ONWE YA
Otu onye nkụzi kwuru na ihe ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ya na-echekarị banyere ndị enyi ha bụ ihe ndị enyi ha ga-emere ha. * Ihe ụmụ akwụkwọ ndị a na-eche bụ naanị ihe ha ga-erite n’aka ndị enyi ha. Ihe a nwere ike ime ka mmadụ na-ele ndị enyi ya anya ka ngwá ọrụ nkịtị. O jiri ha rụchaa ọrụ, ya atọgbọ ha.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ihe ndị ị na-etinye n’Ịntanet hà na-egosi na ị chọrọ ịka ndị ọzọ ma ọ bụ na ị na-echekarị gbasara onwe gị?—NDỊ GALESHIA 5:26.
IHE I NWERE IKE IME
LEBA ANYA N’OTÚ I SI APỊ EKWENTỊ NA IHE NDỊ YIRI YA
Ọ bụrụ na ekwentị gị bụ odibo gị kama ịbụ ọga gị, ọ ga-enyere gị aka iso ndị enyi gị na-akparịta ụka, gị na ha adịkwuokwa ná mma.
AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: ‘Ịhụnanya anaghị achọ ihe ga-abara naanị ya uru.’—1 NDỊ KỌRỊNT 13:4, 5.
Họrọ ihe ndị dị n’okpuru ebe a ị ga-achọ ime, ma ọ bụkwanụ gị edee ihe ndị gịnwa ga-achọ ime.
-
Gbalịa ka gị na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu ihu na ihu (kama ịna-ezigara ha ozi naanị n’ekwentị ma ọ bụ n’iimel)
-
Dowe ekwentị gị ebe ọzọ (ma ọ bụ gị agbanye ya otú ọ na-agaghị eme mkpọtụ) ma gị na ndị ọzọ na-akparịta ụka
-
Belata oge i ji ele ihe ndị mmadụ tinyere n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet
-
Mụtakwuo ịna-ege ndị ọzọ ntị nke ọma
-
Kpọtụrụ enyi gị ihe na-esiri ike
^ par. 17 E kwuru ihe a n’akwụkwọ aha ya bụ Reclaiming Conversation.