Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Egwuregwu Ndị Nwere Ike Ịta Isi Mmadụ Ọ̀ Dị Mma?

Egwuregwu Ndị Nwere Ike Ịta Isi Mmadụ Ọ̀ Dị Mma?

IHE MERE ỤFỌDỤ JI EME YA

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Leon kwuru, sị: “M gara kwụrụ n’akụkụ ụgbọ okporo ígwè na-agba oké ọsọ n’okpuru ala. Ụdị akpata oyi wụrụ m n’ahụ́ mere ka ọ dị m ka mụ enweghịzi nsogbu ọ bụla.” *

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Larissa, kwuru sị: “Mgbe ọ bụla m si n’ọnụ ọnụ ugwu maba n’ime mmiri, ahụ́ na-ada m jii. Ime ihe a na-atọ m ụtọ, ma, ọ na-atụkwa m ụjọ mgbe ụfọdụ.”

Dị ka Leon na Larissa, ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwetakarị obi ụtọ pụrụ iche ma ha mee ihe ndị nwere ike ịta isi ha. Ọ̀ na-agụ gị agụụ iso mee ụdị ihe ndị a? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ndị e kwuru n’isiokwu a ga-abara gị uru.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Igwu ụdị egwuregwu a nwere ike ịmara mmadụ ahụ́. Otú o si na-atọ gị ụtọ nwere ike ime ka ịchọwa imekwu ya. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Marco, onye gara nọrọ n’akụkụ ụgbọ okporo ígwè, otú ahụ Leon mere, kwuru, sị: “O siiri m ike ịkwụsị ime ya. Obi ụtọ m na-enweta na ya na-eme ka m chọwa nke ka ya m ga-eme.”

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Justin na-eyiri akpụkpọ ụkwụ nwere taya, jide ụgbọala na-agba ọsọ aka, soro ya na-aga. O kwuru, sị: “Otú ime ihe a si atọ m ụtọ na-eme ka m na-achọkwu ime ya. M chọrọ ka ndị mmadụ na-eto m. Ma, m mechara nweta onwe m n’ụlọ ọgwụ.”

Ịchọ ime ka ndị ọgbọ gị nabata gị nwere ike ime ka i chefuo onwe gị. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Marvin kwuru, sị: “Ndị enyi m nyere m nsogbu ka m jiri aka rịa ahụ́ ụlọ otu ụlọ elu toro ogologo. Ha nọ na-asị m: ‘Rịwa, rịwa, ị ga-emeli ya.’ Ọ kachaghị m obi. M nọkwa na-ama jijiji mgbe m bidoro ịrị ya.” Larissa anyị kwuburu gbasara ya ná mmalite kwuru, sị: “M na-eso ndị ọzọ eme ihe ọ bụla ha na-eme.”

Ụfọdụ ndị chọrọ ito ndị na-eme ụdị ihe a ma kpalie ndị ọzọ ime ya, na-etinye vidio na ihe ndị ọzọ ga-eme ka ọ yie ihe na-adịghị ize ndụ n’Ịntanet. N’ihi otú ọtụtụ ndị si ele vidio ndị ahụ, ndị na-eme ya ghọziri ndị ama ama.

Di ka ihe atụ, e nwere ụfọdụ vidio na-egosi ebe ndị mmadụ na-amagharị n’elu mgbidi, ụlọ, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ nwere ike ịta isi mmadụ. Ha na-enwe ike isi n’elu otu ihe mafere n’ọzọ n’ejideghị ihe ọ bụla aka. Ile vidio ndị a nwere ike ime ka mmadụ chewe na: (1) Ọghọm adịchaghị na ya, na (2) Onye ọ bụla na-eme ya. Ihe ga-esizi n’ime ya pụta bụ na: O nwere ike gụwa gị agụụ ka i mee ihe ndị ahụ nwere ike ịta isi mmadụ.

E nwere otú kacha mma mmadụ nwere ike isi mata ebe ike ya ruru. Baịbụl kwuru, sị: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara ntakịrị uru.” (1 Timoti 4:⁠8) Ma, ọ gwakwara gị ka ị “na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè.” (Taịtọs 2:12) Olee otú i nwere ike isi mee ya?

IHE I NWERE IKE IME

Leba anya ná nsogbu ndị dị na ya. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke maara ihe ga-eji ihe ọmụma mee ihe, ma onye nzuzu ga-agbasa nzuzu ya ebe niile.” (Ilu 13:16) Tupu gị emee ihe ọ bụla, buru ụzọ chọpụta ọghọm dị n’ihe ahụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ihe a m chọrọ ime ò nwere ike ịkpatara m ọnwụ ma ọ bụ mmerụ ahụ́?’​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 14:⁠15.

Meta ndị ji ndụ kpọrọ ihe enyi. Ezigbo ndị enyi agaghị agba gị ume ka i mee ihe nwere ike igbu gị ma ọ bụ ihe ị na-achọghị ime. Larissa kwuru, sị: “Ezigbo ndị enyi nyeere m aka ịhọrọ egwuregwu ndị na-adịghị ize ndụ. Ndị enyi m nwere ugbu a mere ka ndụ m ka mma.”​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 13:⁠20.

Jụọ onwe gị, sị, ‘Ihe a m chọrọ ime ò nwere ike ịkpatara m ọnwụ ma ọ bụ mee ka m merụọ ahụ́?’

Otú ị ga-esi mee ihe ndị na-amasị gị n’emerụghị ahụ́. Otu akwụkwọ aha ya bụ Adolescent Risk Behaviors kwuru na mmadụ na-eto, ọ “na-amụtakwu ihe ndị o kwesịrị ime na ebe ike ya ruru.” Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ebe ike gị ruru, jiri ihe ndị ga-egbochi mmerụ ahụ́ mee ya.

Ka obi na-atọ gị ụtọ n’ihe ndị ị ga-emeli. Ihe ga-eme ka ndị mmadụ na-akwanyere gị ùgwù abụghị ihe i mere ka ndị ọzọ hụ gị, kama, otú i si emeri nsogbu ndị i nwere. Larissa kwuru, sị: “Isi n’ọnụ ọnụ ugwu maba n’ime mmiri bụ ihe mbụ nwere ike ịta isi mmadụ m mere. Ọ gaara akacha mma ma a sị na m jụrụ ime ihe ndị ahụ.”

Ihe ị ga-eburu n’obi: Kama itinye aka n’egwuregwu ndị nwere ike ịta isi gị, i nwere ike ịhọrọ egwuregwu ndị na-agaghị akpatara gị nsogbu.”​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 15:24.

^ para. 4 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.