Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Milfọd Sound

OBODO NA NDỊ BI NA YA

Mgbe M Gara Niu Ziland

Mgbe M Gara Niu Ziland

O NWERE ike ịbụ n’ihe dị ka nari afọ asatọ gara aga ka ndị Maori si n’obodo Polineshia mee njem ihe karịrị ọtụtụ puku kilomita n’osimiri bịa biri na Niu Ziland. Mgbe ha rutere Niu Ziland, ha chọpụtara na e nwere ihe dị iche n’ala ahụ n’obodo ha si bịa, bụ́ obodo mmiri gbara gburugburu. E nwere ọtụtụ ugwu, mmiri kpụkọrọ akpụkọ, snoo na mmiri ọkụ si na nkume na-agbapụta n’ọtụtụ ebe na Niu Ziland. Mgbe ihe dị ka narị afọ ise gachara ndị Maori bịara Niu Ziland, agbụrụ ọzọ si Yurop bịakwara n’obodo a. Taa, ọtụtụ ndị Niu Ziland na-eme ma omenala ndị Yurop ma omenala ndị Polineshia. E kee ndị bi n’obodo a ụzọ iri, ụzọ itoolu n’ime ha bi n’obodo mepere emepe. Isi obodo Niu Ziland bụ Welintịn. Otu ihe kacha pụọ iche gbasara obodo Welintịn bụ na ọ bụ ya bụ isi obodo kacha dịrị n’ebe ndịda n’ụwa niile.

Apịtị na-agbọ agbọ n’Agwaetiti nke Ugwu Niu Ziland

Ọ bụ eziokwu na Niu Ziland nọ n’ebe dịpụrụ adịpụ n’ụwa, ma, mma ọ mara mere ka ihe dị ka ndị njem nde atọ na-abịa na ya kwa afọ iji legharịa anya.

Osisi a azụ akwụkwọ ya na-acha ọlaọcha ọlaọcha nwere ike ito ogologo karịa mita iri

Tupu afọ 1948, e cheburu na nnụnụ takahe na-anaghị efe efe anwụchaala

Niu Ziland nwere ọtụtụ ụmụ anụmanụ ndị ọdịdị ha dịtụ iche n’anụmanụ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, e nwere ọtụtụ nnụnụ ndị na-anaghị efe efe n’obodo a karịa n’obodo ndị ọzọ. E nwekwara otu anụ yiri ngwere a na-akpọ tuatara. O nwere ike ịdị ndụ ruo otu narị afọ. Ụfọdụ anụmanụ ndị na-enye nwa ara dị n’obodo a bụ ụsụ na anụ mmiri ndị dị ka weel na dọlfịn.

Ndịàmà Jehova eziwela ozi ọma na Niu Ziland kemgbe ihe dị ka otu narị afọ na iri abụọ gara aga. Ha na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ihe karịrị asụsụ iri na itoolu. Ụfọdụ n’ime asụsụ ndị ahụ bụ: Polineshian, Niuean, Rarotongan, Samoan, na Tongan.

Ebe ndị Maori yi efe ọdịnala ha na-agba egwú