Ịdị Nwayọọ n’Obi Ga-egosi na Ị Ma Ihe
E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Antonia. Ọrụ ya bụ ilekọta ndị agadi. Otu ụbọchị, ọ kụrụ aka n’ụzọ, otu nwaanyị dị́ ihe dị ka afọ iri ise apụta bawara ya mba, na-akparị ya maka na o chere na ọ bịaghị n’oge ilekọta mama ya merela agadi. Nke bụ́ eziokwu bụ na Antonia bịara mgbe o kwesịrị ịbịa. Ma, o weturu obi rịọ nwaanyị ahụ mgbaghara maka na ọ ghọtaghị ihe merenụ.
MGBE Antonia bịara n’ụbọchị ọzọ, nwaanyị ahụ baara ya mba ọzọ. Gịnị ka Antonia mere? Ọ sịrị: “Ọ dịghịrị m mfe. O kwesịghị ịgwawa m okwu ọjọọ.” Ma, Antonia rịọkwara ya mgbaghara, gwa ya na ya ghọtara ahụhụ ọ na-ata.
A sị na ị bụ Antonia, gịnị ka ị gaara eme? Ị̀ gaara egosi na ị dị nwayọọ? Ọ̀ gaara esiri gị ike ijide onwe gị? Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ọ gaghị adịrị mmadụ mfe ijide onwe ya ma ụdị ihe a mee. Anyị chegbuwe onwe anyi ma ọ bụ a kpasuo anyị iwe, ọ naghị adị mfe ijide onwe anyị.
Ma, Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha na-adị nwayọọ n’obi. N’eziokwu, Okwu Chineke kwuru na onye dị nwayọọ n’obi nwere amamihe. Jems jụrụ, sị: “Ònye maara ihe ma nwee nghọta n’etiti unu? Ya jiri ịdị nwayọọ nke e ji mara amamihe gosi ọrụ ya site n’ime omume ọma.” (Jems 3:13) Olee otú onye dị nwayọọ n’obi si egosi na o nwere amamihe sí n’elu? Oleekwa ihe ga-enyere anyị aka ịmụta àgwà a dị́ Chineke mma?
IHE GOSIRI NA ONYE DỊ NWAYỌỌ N’OBI MA IHE
Ịdị nwayọọ n’obi nwere ike ime ka iwe dajụọ. Ilu 15:1 kwuru, sị: “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.”
Iwe nwere ike ime ka nsogbu ka njọ n’ihi na ọ ga-adị ka ịwụnye mmanụ n’ọkụ. (Ilu 26:21) Ma, ịdị nwayọọ n’obi na-emekarị ka iwe dajụọ. O nwedịrị ike ime ka obi jụrụ onye chọrọ ịlụso anyị ọgụ.
Antonia hụrụ ka ụdị ihe ahụ mere. Mgbe nwaanyị ahụ hụrụ otú Antonia si wetuo obi gwa ya okwu, ọ malitere ibe ákwá, kwuo na nsogbu zuru ya ahụ́, ma nsogbu nke ya ma nke ezinụlọ ya. Antonia ziri ya ozi ọma, malite ịmụrụ ya Baịbụl n’ihi na Antonia weturu obi ma gosi na ya bụ onye udo.
Ịdị nwayọọ n’obi nwere ike ime anyị obi ụtọ. Matiu 5:5 kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.”
Gịnị mere obi ji adị ndị dị nwayọọ n’obi ụtọ? E nwere ọtụtụ ndị na-ewebu iwe ọkụ, ma obi dịzi ha ụtọ n’ihi na ha adịla nwayọọ n’obi. Ndụ ha akala mma. Ha makwa na ha ga-enweta oge magburu onwe ya n’ọdịnihu. (Kọl. 3:12) Otu onye nlekọta sekit na Spen aha ya bụ Adolfo kọrọ otú ndụ ya dị tupu ya abata n’ọgbakọ.
Adolfo kwuru, sị: “Ndụ m enweghị isi na ọdụ. M na-ewekarị iwe ọkụ, nke mere ka ụfọdụ ndị enyi m na-atụ m ụjọ maka na m dị mpako, na-alụkwa ọgụ. Otu ihe mere ka ndụ m gbanwee. N’otu ọgụ anyị lụrụ, a mara m ọnụ mma isii, ya afọ obere ka ọbara gbagbuo m.”
Ma, ugbu a, Adolfo ji okwu ọnụ na omume ya na-akụziri ndị ọzọ ka ha na-adị nwayọọ n’obi. Àgwà ọma ya na-eme ka ọtụtụ ndị na-abịazi ya nso. Adolfo kwuru na obi dị ya ụtọ maka otú o si gbanwee. Ọ na-ekelekwa Jehova maka otú o si nyere ya aka ịna-adị nwayọọ n’obi.
Ịdị nwayọọ n’obi na-eme Jehova obi ụtọ. Ilu 27:11 kwuru, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.”
Ekwensu, bụ́ onyeisi ndị iro Jehova, na-akwa Jehova emo. Ụdị mkparị ahụ kwesịrị ime ka iwe na-ewe Chineke, ma Baịbụl gwara anyị na Jehova ‘adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.’ (Ọpụ. 34:6) Ọ bụrụ na anyị ana-agba mbọ iṅomi Chineke ma ghara ịna-ewe iwe ọsọ ọsọ, dịkwa nwayọọ n’obi, ọ pụtara na anyị na-eme ihe gosiri na anyị ma ihe, obi ga-adịkwa Jehova ezigbo ụtọ.—Efe. 5:1.
Ọtụtụ ndị kpọrọ ibe ha asị n’ụwa taa. Anyị nwere ike ịna-ahụ “ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, . . . ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike.” (2 Tim. 3:2, 3) Ma, ihe ndị a ekwesịghị ime ka Onye Kraịst ghara ịdị nwayọọ n’obi. Baịbụl gwara anyị na ‘amamihe nke si n’elu na-eme udo, nweekwa ezi uche.’ (Jems 3:17) Ọ bụrụ na anyị bụ ndị udo, nweekwa ezi uche, anyị ga-eme ka ndị mmadụ ghọta na Chineke enyela anyị amamihe. Ụdị amamihe ahụ ga-eme ka anyị dịrị nwayọọ n’obi ma a kpasuo anyị iwe. Ọ ga-emekwa ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma. Ọ bụ ya na-enye amamihe kachanụ.