Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú egwú dịruru mkpa n’Izrel oge ochie?

EGWÚ dị ezigbo mkpa n’Izrel oge ochie. Ọtụtụ ugboro, Baịbụl kwuru banyere ndị na-akụ ngwá egwú na ndị na-abụ abụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na e kee Akwụkwọ Nsọ ụzọ iri, otu ụzọ bụ abụ. Dị ka ihe atụ, e dere akwụkwọ Abụ Ọma, Abụ Solomọn, na Abụ Ákwá ka a na-abụ ha abụ. Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ nke kwuru gbasara egwú n’oge a na-ede Baịbụl ji kwuo na Baịbụl mere ka o doo anya na ndị Izrel na-abụ abụ ma na-akụ egwú n’ọtụtụ ihe ha na-eme ná ndụ.

Ịbụ abụ na ịkụ egwú n’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị. Ndị Izrel na-akụ egwú ma na-abụ abụ iji gosi otú obi dị ha. (Aịza. 30:29) Ụmụ nwaanyị na-eji obere ịgbà kụọ egwú, jiri obi ụtọ na-abụ abụ, gbaakwa egwú n’oge ha na-eme ememme, dị ka mgbe a na-echi mmadụ eze, mgbe ndị agha meriri n’agha, nakwa mgbe a na-eme ememme ndị e ji efe Chineke. (Ikpe 11:34; 1 Sam. 18:6, 7; 1 Eze 1:39, 40) Ndị Izrel na-abụkwa abụ iru uju mgbe mmadụ nwụnahụrụ ha. (2 Ihe 35:25) O doro anya na dị ka otu akwụkwọ si kwuo, ndị Izrel ji egwú na ịbụ abụ kpọrọ ezigbo ihe.

Ịkụ egwú na ịbụ abụ n’obí eze. Ige egwú na-atọ ndị eze Izrel ka mmanụ aṅụ. Eze Sọl kpọtara Devid n’obí ya ka ọ na-akụrụ ya egwú. (1 Sam. 16:18, 23) Mgbe Devid mechara bụrụ eze, o mepụtara ngwá egwú dị iche iche, dee abụ ndị na-atọ ụtọ, haziekwa ndị ga na-akụ egwú n’ụlọ nsọ Jehova. (2 Ihe 7:6; Emọs 6:5) Eze Solomọn nwekwara ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị na-abụ abụ n’obí ya.​—Ekli. 2:8.

Egwú e ji efe Chineke. Nke kacha mkpa bụ na ndị Izrel ji egwú fee Jehova. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere puku mmadụ anọ (4,000) ndị na-akụ egwú n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. (1 Ihe 23:5) Ha kụrụ ájà, kpọọ ụbọ akwara na une, fụọkwa opi. (2 Ihe 5:12) Ma ọ bụghị naanị ndị a bụ́ ndị aka ochie ji egwú fee Chineke. O doro anya na ọtụtụ ndị Izrel na-abụ Abụ Mgbago mgbe ha na-aga Jeruselem ịga mee ememme ndị ha na-eme kwa afọ. (Ọma 120–134) Ihe ndị Juu dere n’oge ochie kwuru na ndị Izrel bụrụ Abụ Ọma Halel a n’oge ha na-eri nri Ememme Ngabiga.

Ịkụ egwú na ịbụ abụ ka dịkwa ndị Chineke mkpa taa. (Jems 5:13) Anyị na-abụ abụ mgbe anyị na-efe Chineke. (Efe. 5:19) Ịbụ abụ na-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. (Kọl. 3:16) Ọ na-emekwa ka anyị nwee obi ike mgbe ihe siiri anyị ike. (Ọrụ 16:25) Ọ bụ ụzọ magburu onwe ya anyị si egosi na anyị nwere okwukwe na Jehova nakwa na anyị hụrụ ya n’anya.

a Ihe ndị Juu na-akpọ Abụ Ọma nke 113 ruo 118 bụ Abụ Ọma Halel. Ha na-abụ ya iji too Jehova.