ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị̀ GA-ANABATA ONYINYE KACHANỤ CHINEKE NYERE ANYỊ?
Gịnị Mere Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị Ji Dị Oké Ọnụ Ahịa?
Gịnị na-eme ka i jiri onyinye e nyere gị kpọrọ ezigbo ihe? E nwere ihe anọ nwere ike ịkpata ya. Ha bụ: (1) onye nyere ya, (2) ihe mere o ji nye ya, (3) ihe o furu ya, nakwa (4) uru ọ bara. Ọ bụrụ na anyị echebara ihe anọ ndị a echiche, ọ ga-eme ka anyị jiri ihe mgbapụta ahụ, ya bụ, onyinye dị oké ọnụ ahịa Chineke nyere anyị, kpọrọkwuo ihe.
ONYE NYERE YA
Anyị na-eji onyinye ụfọdụ e nyere anyị kpọrọ oké ihe n’ihi na onye nyere anyị ya nọ n’ọkwá ukwu, ma ọ bụkwanụ na ọ bụ onye anyị na-asọpụrụ. Anyị na-ejikwa onyinye ụfọdụ akpọrọ ihe n’ihi na ọ bụ onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ ezigbo enyi anyị nyere anyị ya, a sịgodị na ha adaghị ọnụ. Ọ bụ ya mere Jordan ahụ anyị kwuru gbasara ya n’isiokwu mbụ ji jiri ihe Russell nyere ya kpọrọ ihe. Olee otú ihe a si gbasa ihe mgbapụta ahụ?
E nwere ihe abụọ mere o ji gbasa ya. Nke mbụ bụ na Baịbụl kwuru na “Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya.” (1 Jọn 4:9) Ọ bụ n’ihi na ọ bụ Chineke nyere ihe mgbapụta ahụ mere o ji dị oké ọnụ ahịa. E nweghị onye ka Chineke. Ọ bụ ya mere otu ọbụ abụ bụ́ onye Hibru ji kwuo, sị: “Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” (Abụ Ọma 83:18) E nweghị onye ọzọ ka Chineke nwere ike inye anyị onyinye.
Ihe nke abụọ bụ na Chineke bụ “Nna anyị.” (Aịzaya 63:16) Olee otú o si bụrụ nna anyị? Ọ bụ ya nyere anyị ndụ. Ọ na-elekọtakwa anyị otú ezigbo nna si elekọta ụmụ ya. Mgbe Chineke na-agwa ndị ya okwu n’oge ochie, ọ kpọrọ ha Ifrem ma jụọ ha, sị: “Ọ̀ bụ na Ifrem abụghị nwa m hụrụ n’anya na nwa m na-apa apa? . . . Aghaghị m inwere ya ọmịiko.” (Jeremaya 31:20) Chineke anaghịkwa eji ndị na-efe ya taa egwu egwu. Ọ bụghị naanị na ọ bụ Onye kere anyị, nke pụrụ ime ihe niile, ọ bụkwa Nna hụrụ anyị n’anya na ezigbo Enyi anyị. Ihe ndị a ò kwesịghị ime ka anyị jiri onyinye ọ bụla o nyere anyị kpọrọ oké ihe?
IHE MERE O JI NYE YA
Ihe mere anyị ji ewere onyinye ụfọdụ ka ihe dị oké ọnụ ahịa bụ na onye nyere anyị ya enyeghị ya iji mezuo iwu, kama ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Onye na-eji obi ya niile enye mmadụ ihe anaghị atụ anya ka onye ahụ kwụghachi ya.
Ihe mere Chineke ji nye anyị Ọkpara ya bụ na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Ọ bụ site n’ihe a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ebe anyị nọ, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya.” Gịnị mere o ji zite ya? Ọ bụ “ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya.” (1 Jọn 4:9) Ọ̀ bụ iwu na Chineke ga-ezite Ọkpara ya maka anyị? Mbanụ. Chineke ji ‘ihe mgbapụta ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ’ gosi anyị ‘obiọma ya na-erughịrị mmadụ.’—Ndị Rom 3:24.
Gịnị mere onyinye a Chineke nyere anyị ji bụrụ ‘obiọma na-erughịrị mmadụ’? Baịbụl sịrị: “Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Ndị Rom 5:8) Anyị bụ ndị mmehie, anyị enweghịkwa ike ịgbapụta onwe anyị. Ma, n’ihi na Chineke hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, o nyere anyị Ọkpara ya. O nweghị ihe anyị meere ya o ji hụ anyị n’anya, anyị agaghịkwa akwụli ya ụgwọ ya. Onyinye a kacha onyinye ọ bụla e nyetụrụla anyị iji gosi na a hụrụ anyị n’anya.
IHE O FURU YA
Ihe mere ụfọdụ onyinye ji dị oké ọnụ ahịa bụ na ha furu onye nyere ha ezigbo ihe. Mmadụ nye anyị ihe dị ya ezigbo mkpa, anyị ga-eji ihe ahụ kpọrọ ihe n’ihi ihe o furu ya.
Chineke “nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya.” (Jọn 3:16) O nweghị onye ọzọ o nwere ike inye anyị karịrị ya. N’ogologo oge ahụ Chineke ji kee eluigwe na ụwa, o nyeere ya aka kee ihe. Jizọs bịaziri “bụrụ onye ihe ya masịrị ya karịsịa.” (Ilu 8:30) Jizọs bụ “Ọkpara nke ịhụnanya” Chineke na “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya.” (Ndị Kọlọsi 1:13-15) E nweghị ndị hụtụrụla ibe ha n’anya otú Jehova na Jizọs hụrụ ibe ha.
N’agbanyeghị ya, Chineke ‘azọghị ọbụna Ọkpara ya.’ (Ndị Rom 8:32) Jehova nyere anyị ihe kacha mma o nwere. O nweghị onyinye furu ya ihe karịa Ọkpara ya o nyere anyị.
URU Ọ BARA
Ihe mere ụfọdụ onyinye ji adị oké ọnụ ahịa bụ na ha gbooro onye e nyere ya mkpa ji ya n’olu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ na-arịa ọrịa nwere ike igbu ya, ma o nweghị ego o ji agwọ ya, onye ọzọ akpọrọ ya gaa ụlọ ọgwụ ma kwụọrọ ya ụgwọ ụlọ ọgwụ, ọ ga-ekele onye ahụ ezigbo ekele. Ọ gaghị eji ihe ahụ e meere ya egwu egwu.
Baịbụl kwuru, sị: “Dị nnọọ ka mmadụ niile na-anwụ n’ime Adam, otú ahụkwa ka a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.” (1 Ndị Kọrịnt 15:22) Anyị niile “na-anwụ” anwụ n’ihi na anyị bụ ụmụ Adam, anyị enweghịkwa ike ịgbanahụ ọrịa na ọnwụ. Anyị agaghị emeli ka anyị na Chineke dịrị ná mma, gharazie ịbụ ndị mmehie. Ebe anyị bụ ndị mmehie, enweghị ihe anyị ga-emeli n’onwe anyị ka anyị dị ndụ ma ọ bụ mee ka ndị ọzọ “dị ndụ.” Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Ọ dịghị otu n’ime ha pụrụ ịnapụta nwanne ya ma ọlị, ọ dịghịkwa nke pụrụ inye Chineke ihe mgbapụta maka ya . . . Ọ dịghị adị ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 49:7, 8) Anyị chọsiri ike ka e nyere anyị aka n’ihi na anyị enweghị ike ịkwụ ụgwọ a ga-eji gbapụta anyị. A hapụ anyị, nke anyị agwụla.
Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, o ji aka ya kwụọ ụgwọ ahụ. Ọ ga-eji àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ mee ka “mmadụ niile dị ndụ.” Olee otú ihe mgbapụta ahụ ga-esi mee ka mmadụ niile dị ndụ? Baịbụl kwuru na “ọbara Jizọs bụ́ Ọkpara ya na-asachapụ anyị mmehie niile.” Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’ọbara Jizọs wụsara iji gbapụta anyị, 1 Jọn 1:7; 5:13) Olee uru ihe mgbapụta ahụ ga-abara ndị ikwu na ibe anyị nwụrụla anwụ? Baịbụl kwuru, sị: “Ebe ọnwụ si n’aka otu onye, mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ sikwa n’aka otu onye [ya bụ Jizọs].”—1 Ndị Kọrịnt 15:21. *
Chineke ga-agbaghara anyị mmehie, anyị ga-adịkwa ndụ ebighị ebi. (E nweghị onye ka Chineke nyetụrụla anyị onyinye, ma ọ bụ onye nyerela anyị onyinye n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya karịa nke Chineke nyere anyị, ya bụ, àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ. O nwetụbeghị onye onyinye o nyere anyị furu oké ihe karịa ihe onyinye a Jehova Chineke nyere anyị furu ya. E nwekwanụghị onyinye baara anyị uru karịa àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ iji gbapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. N’eziokwu, enwetụdịghị onyinye baara anyị uru a ga-eji tụnyere uru na-enweghị atụ ihe mgbapụta ahụ baara anyị.
^ para. 19 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nkwa Chineke kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, gụọ isi nke asaa nke akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. Ọ dịkwa na www.mt1130.com/ig.