Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Chineke ọ̀ na-aza ekpere niile?

Ị̀ GA-ASỊ NA Ọ NA-AZA EKPERE . . .

  • Onye ọ bụla

  • Ụfọdụ ndị

  • Ka ị̀ ga-asị na ọ naghị aza onye ọ bụla?

IHE BAỊBỤL KWURU

“Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso, bụ́ ndị niile na-akpọku ya n’eziokwu.”—Abụ Ọma 145:18.

OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?

  • Chineke anaghị aza ndị na-enupụrụ ya isi ekpere. (Aịzaya 1:15) Ma, ha na Chineke nwere ike ‘ikpezi’ ma ọ bụrụ na ha agbanwee otú ha si ebi ndụ.—Aịzaya 1:18.

  • Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-aza anyị ekpere, anyị kwesịrị ịna-ekpe ya ka ọ daba n’ihe Baịbụl kwuru bụ́ uche ya.—1 Jọn 5:14.

Ò nwere otú pụrụ iche anyị kwesịrị ịnọ mgbe anyị na-ekpe ekpere?

ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU na mgbe ọ bụla ha na-ekpe ekpere na ha na-egbunye ikpere n’ala, hulata isi, ma ọ bụkwanụ jikọta aka ha ọnụ. Gịnị ka i chere?

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na e nweela ndị Chineke zara ekpere ha. Ụfọdụ n’ime ha ‘nọdụrụ ala,’ ma ọ bụ ‘bilie ọtọ’ mgbe ha na-ekpe ekpere. E nwekwara ndị nke ‘gbatịrị onwe ha n’ala,’ nweekwa ndị “gburu ikpere n’ala.” (1 Ihe E Mere 17:16; 2 Ihe E Mere 30:27; Ezra 10:1; Ọrụ Ndịozi 9:40) E nweghị otú o kwuru anyị kwesịrị ịnọ ma anyị kpewe ekpere.

OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?