Baịbụl Ga-akacha Enyere Anyị Aka Ikpebi Ihe Bụ́ Ihe Ọma na Ihe Ọjọọ
Ọ bụrụ ihe anyị chere ma ọ bụ ihe ndị ọzọ chere ka anyị na-agbakwasị ụkwụ na ya ekpebi ụdị àgwà anyị ga na-akpa, anyị agaghị ejideli n’aka na àgwà anyị na-akpa agaghị aghọ anyị ahịa. Baịbụl kwuru ihe mere o ji dị otú ahụ, gwakwa anyị ihe ndị ọzọ. Ọ na-eme ka anyị mata ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Anyị mata ya, ndụ anyị na-aka mma, anyị na-enwekwa obi ụtọ.
ANYỊ KWESỊRỊ IKWE KA CHINEKE NA-EDUZI ANYỊ
Na Baịbụl, Jehova a Chineke kwuru na o kere ụmụ mmadụ ka yanwa na-eduzi ha, ọ bụghị ka ha na-eduzi onwe ha. (Jeremaya 10:23) Ọ bụ ya mere o ji si na Baịbụl na-agwa anyị àgwà ndị dị mma na ndị nke na-adịghị mma. Ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, chọọkwa ka ha ghara ime mkpebi na-adịghị mma nke ga-akpatara anyị nsogbu na ahụhụ. (Diuterọnọmi 5:29; 1 Jọn 4:8) Ihe ọzọ bụ na ebe ọ bụ ya kere anyị, o nwere amamihe ọ ga-ejili enye anyị ndụmọdụ ga-akacha abara anyị uru. (Abụ Ọma 100:3; 104:24) Mana, Chineke anaghị amanye ndị mmadụ ka ha na-eme ihe o kwuru.
Jenesis 1:28, 29; 2:8, 15) Ọ gwakwara ha ihe ha kwesịrị ime na ihe ha na-ekwesịghị ime, tụọkwa anya na ha ga-erubere ya isi. Ma, ọ hapụrụ ha ka ha jiri aka ha kpebie ma hà ga-eme ihe o kwuru ma ọ bụ na ha agaghị eme. (Jenesis 2:9, 16, 17) Ọ dị mwute na Adam na Iv họọrọ ime ihe hanwa chọrọ kama ime ihe Chineke chọrọ. (Jenesis 3:6) Gịnị mechara mee? Mkpebi ụmụ mmadụ kpebiri ime ihe dị ha mma ò mere ka ihe kara ha mma? Mba. Ihe ndị merela kemgbe ọtụtụ afọ gosiri na ileghara iwu Chineke anya anaghị eme ka mmadụ nwee udo na obi ụtọ na-adịgide adịgide.—Ekliziastis 8:9.
Jehova nyere nwoke na nwaanyị mbụ bụ́ Adam na Iv ihe niile ga-eme ka ha na-enwe ezigbo obi ụtọ. (N’agbanyeghị ebe anyị bi ma ọ bụ ezinụlọ anyị si, Baịbụl na-enye anyị ntụziaka ka anyị nwee ike ikpebi àgwà dị mma anyị ga na-akpa na ndị nke anyị na-ekwesịghị ịkpa. (2 Timoti 3:16, 17; gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Akwụkwọ E Dere Maka Mmadụ Niile.”) Ka anyị leba anya n’otú Baịbụl si eme ya.
Mụtakwuo ihe mere e kwesịrị iji kpọọ Baịbụl “okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalonaịka 2:13. Lee vidio bụ́ Uche Ònye Ka E Dere na Baịbụl? Ọ dị na jw.org.
BAỊBỤL KWURU IHE CHINEKE CHỌRỌ KA ANYỊ NA-EME
Baịbụl kọọrọ anyị otú Jehova na ụmụ mmadụ sirila mekọrịta ihe kemgbe ụwa. Ihe ndị ọ kọrọ bụkwa eziokwu. Ihe ndị ahụ na-eme ka anyị ghọta ihe Jehova weere ka ihe ọma na ihe ọjọọ, ihe o weere ka ihe bara uru na ihe na-abaghị uru. (Abụ Ọma 19:7, 11) Baịbụl na-enyekwa anyị ndụmọdụ ndị na-enyere anyị aka ime mkpebi ndị dị mma kwa ụbọchị.
Dị ka ihe atụ, legodị ndụmọdụ dị n’Ilu 13:20: “Onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” Ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu n’oge anyị a otú ọ bụkwa eziokwu n’oge ochie. Ndụmọdụ ndị bara ezigbo uru juru eju na Baịbụl.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ndụmọdụ Baịbụl Na-aba Uru Mgbe Niile.”
Ma, i nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee otú m ga-esi jide n’aka na ndụmọdụ Baịbụl nyere gbasara ihe mmadụ kwesịrị ime na ihe ọ na-ekwesịghị ime ka bara uru n’oge anyị a?’ Isiokwu na-eso nke a ga-akọrọ anyị ihe ụfọdụ ndị chọpụtarala.
a Jehova bụ ezigbo aha Chineke.—Abụ Ọma 83:18.