Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Ị Ga-esi Ekpe Ekpere Chineke Anụ Ya?

Olee Otú Ị Ga-esi Ekpe Ekpere Chineke Anụ Ya?

Jehova Chineke bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2) Anyị nwere ike ịgwa ya okwu n’ebe ọ bụla na n’oge ọ bụla. Anyị nwekwara ike ịgwa ya okwu n’ime obi anyị ma ọ bụ kwupụta ya ekwupụta. Jehova chọrọ ka anyị na-akpọ ya “Nna.” Ọ bụkwa ya bụ Nna kachanụ anyị nwere ike inwe. (Matiu 6:9) Jehova ji obi ya niile na-akụziri anyị otú anyị ga-esi ekpe ekpere ka ọ nụ ya.

NA-EKPEGARA JEHOVA CHINEKE EKPERE N’AHA JIZỌS

“Ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye ya unu n’aha m.”Jọn 16:23.

Ihe a Jizọs kwuru gosiri na Jehova achọghị ka anyị si n’aka ndị sent, ndị mmụọ ozi, ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ jiri ihe oyiyi na-ekpegara ya ekpere. Kama, ọ chọrọ ka anyị na-ekpe ekpere n’aha Jizọs Kraịst. Anyị kpegara Chineke ekpere n’aha Jizọs, anyị na-egosi na anyị ghọtara na ihe mere Chineke ji anụ ekpere anyị bụ maka ihe Jizọs meere anyị. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.”—Jọn 14:6.

SI N’OBI GỊ NA-AGWA CHINEKE OKWU

“Wụpụnụ obi unu n’ihu ya dị ka mmiri.”—Abụ Ọma 62:8.

Anyị kpegawara Jehova ekpere, anyị kwesịrị ịgwa ya okwu otú ahụ anyị si agwa nna anyị hụrụ anyị n’anya okwu. Kama ịgụwara ya ihe e dere n’akwụkwọ ma ọ bụ gwawa ya ihe anyị bu n’isi, anyị kwesịrị iji nkwanye ùgwù gwa ya okwu, gwakwa ya ihe dị anyị n’obi.

NA-EKPE EKPERE OTÚ DABARA N’UCHE CHINEKE

“Ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”—1 Jọn 5:14.

Na Baịbụl, Jehova Chineke gwara anyị ihe ọ ga-emere anyị na ihe ọ chọrọ ka anyị meere ya. Anyị chọọ ka Chineke nụ ekpere anyị, anyị kwesịrị ikpe ya “dị ka uche ya si dị.” Ka anyị nwee ike ime ya, anyị kwesịrị ịmụ Baịbụl ka anyị mata Chineke nke ọma. Anyị mee otú ahụ, ekpere anyị ga na-atọ ya ụtọ.

OLEE IHE ANYỊ NWERE IKE IKPE N’EKPERE?

Na-arịọ Maka Ihe Ndị Dị Gị Mkpa. Anyị nwere ike ịrịọ Chineke maka ihe ndị dị anyị mkpa kwa ụbọchị, dị ka nri, uwe na ebe obibi. Anyị nwekwara ike ịrịọ Chineke maka amamihe ka anyị nwee ike ime mkpebi dị mma, rịọkwa ya ka o nye anyị ike iji na-edi nsogbu ndị na-abịara anyị. Anyị nwere ike rịọ ya ka o nye anyị okwukwe, gbaghara anyị mmehie anyị, nyekwara anyị aka.—Luk 11:3, 4, 13; Jems 1:5, 17.

Na-ekpe Ekepere Maka Ndị Ọzọ. Obi na-atọ ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya ụtọ ma ụmụ ha hụ ibe ha n’anya. Jehova chọkwara ka ụmụ ya nọ n’ụwa na-eche banyere ibe ha. Ọ dị mma anyị ikpe ekpere maka di ma ọ bụ nwunye anyị, ụmụ anyị na ikwu na ibe anyị. Jems, onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “Na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere.”—Jems 5:16.

Na-ekele Chineke. Baịbụl kwuru gbasara Onye Okike anyị bụ́ Chineke, sị: “O mere ihe ọma, na-enye unu mmiri ozuzo site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enyekwa unu nri n’ụba, na-emekwa ka unu nwee obi ụtọ.” (Ọrụ Ndịozi 14:17) Anyị chee banyere ihe niile Chineke meere anyị, ọ ga-eme ka anyị na-ekele ya n’ekpere anyị. Ụzọ ọzọ anyị ga-esi na-ekele Chineke bụ irubere ya isi.—Ndị Kọlọsi 3:15.

NA-ENWE NDIDI, NỌGIDEKWA NA-EKPE EKPERE

Mgbe ụfọdụ, anyị si n’obi anyị kpee ekpere ma Chineke azaghị ya ngwa ngwa, o nwere ike iwute anyị. Ànyị ga-eji maka ya sị na Chineke anaghị eche banyere anyị? Mbanụ. Ka anyị tụlee ihe atụ ndị gosiri na ịnọgide na-ekpe ekpere bụ ihe o nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee.

Steve anyị kwuru okwu ya n’isiokwu mbụ dị n’Ụlọ Nche a, sịrị: “A sị na mụ anọgideghị na-ekpe ekpere, ọ gaara abụ na nke m na-eme agwụla kemgbe.” Gịnị nyeere ya aka ịgbanwe otú o si ele ekpere anya? Ọ malitere ịmụ Baịbụl, ma mụta na ọ dị mkpa ikpe ekpere na ịnọgide na-ekpe ya. Ọ sịrị: “M kpegaara Chineke ekpere, kelee ya maka otú ndị enyi m si nyere m aka. Obi dị m ezigbo ụtọ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ.”

Oleekwanụ maka Jenny, onye chere na ya erughị eru ka Chineke nụ ekpere ya? Ọ sịrị: “N’oge ọ kacha dị m ka abaghị m uru, m rịọrọ Chineke ka o nyere m aka ịghọta ihe mere o ji adị m otú ahụ.” Olee otú ihe a o mere si nyere ya aka? Ọ sịrị: “Ịgwa Chineke okwu emeela ka m na-ele onwe m anya otú Chineke si ele m anya. O meela ka m mata na ọ bụrụgodị na obi m na-ama m ikpe, Chineke anaghị ama m ikpe. O meekwala ka ike ụwa ghara ịgwụ m.” Olee uru ọ baara ya? Ọ sịrị: “Ekpere emeela ka m mata na Jehova dị adị, na ọ hụrụ m n’anya, na-eche banyere m, bụrụ Nna m, Enyi m, nakwa Onye na-enyere m aka mgbe ọ bụla m kpọrọ ya ma ọ bụrụhaala na mụ anọgide na-eme ihe ọ chọrọ.”

Isabel sịrị na ọ hụ Gerard nwa ya nwoke ka ọ na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na o nwere nkwarụ, na ya ‘na-aghọta n’eziokwu na Jehova ji ya za ya ekpere’

Tụleekwa banyere akụkọ Isabel. Mgbe ọ dị ime, dọkịta ya gwara ya na nwa ya ga-ebu ezigbo nkwarụ pụta ụwa. Obi gbawara ya. Ụfọdụ ndị gwadịrị ya ka o tee ime ahụ. Ọ sịrị: “Ọ dị m nnọọ ka m̀ na-aga ịnwụ n’ihi otú obi si gbawaa m.” Gịnị ka o mere? Ọ sịrị: “M kpere ekpere ọtụtụ ugboro ka Chineke nyere m aka.” O mechara mụọ nwa nwoke aha ya bụ Gerard, o nwekwara nkwarụ. Isabel ò chere na Chineke zara ekpere ya? Ee. Gịnị mere o ji chee otú ahụ? Ọ sịrị: “Ọ na-abụ m na-ele nwa m nwoke a dị afọ iri na anọ ugbu a anya ka ọ na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na o nwere nkwarụ, m na-aghọta n’eziokwu na Jehova ji ya za m ekpere, ọ bụkwa ya bụ ngọzi kachanụ Jehova nyere m.”

Ụdị okwu a o si n’ala ala obi ya kwuo na-eme ka anyị chee banyere ihe otu ọbụ abụ kwuru. Ọ sịrị: “Jehova, biko, nụrụ arịrịọ ndị dị umeala n’obi na-arịọ gị. Dozie obi ha. Jiri ntị gị nụrụ.” (Abụ Ọma 10:17) Ihe ndị a bụ ezigbo ihe ndị kwesịrị ime ka anyị nọgide na-ekpe ekpere.

E dere ọtụtụ ekpere ndị Jizọs kpere na Baịbụl. Nke a kacha mara bụ nke ahụ ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. È nwere ihe anyị nwere ike ịmụta na ya?