Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ịkpọasị Ga-akwụsị Kpamkpam

Mgbe Ịkpọasị Ga-akwụsị Kpamkpam

Ọ bụrụgodị na anyị ewepụ ịkpọasị n’obi anyị, anyị agaghị emeli ka ndị nọ anyị gburugburu kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. Ndị aka ha dị ọcha ka na-ata ahụhụ n’ihi na a kpọrọ ha asị. Oleezi ihe ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ịkpọ ibe ha asị kpamkpam?

Ọ bụ naanị Jehova Chineke nwere ike ime ka ịkpọasị kwụsị kpamkpam. Ọ bụkwa ihe o kwere anyị nkwa na Baịbụl na ọ ga-eme.​—Ilu 20:22.

CHINEKE GA-EWEPỤ IHE NDỊ BỤ́ ISI MERE NDỊ MMADỤ JI AKPỌ IBE HA ASỊ

  1. 1. SETAN BỤ́ EKWENSU. Setan, bụ́ mmụọ ozi ahụ nupụụrụ Chineke isi, bụ isi sekpụ ntị na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị taa. Chineke ga-ebibi Setan na ndị niile na-akpọ ndị ọzọ asị ka ya.​—Abụ Ọma 37:38; Ndị Rom 16:20.

  2. 2. ỤWA EKWENSU ỊKPỌASỊ JURU. Chineke ga-ebibi ndị niile na-akpata ịkpọasị n’ụwa a, ma ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-arụrụ aka ma ndị isi okpukpe na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị. Chineke ga-ebibikwa ndị ahịa dị anyaukwu, n’ihi na ha na-arụrụ aka, na-aghọgbukwa ndị mmadụ.​—2 Pita 3:13.

  3. 3. EZUGHỊ OKÈ. Baịbụl kwuru na mmadụ niile ezughị okè. Ezughị okè na-eme ka ndị mmadụ na-echekarị ihe ọjọọ, na-emekwa ya eme. (Ndị Rom 5:12) Dị ka ihe atụ, ọ na-eme ka ndị mmadụ na-akpọ ndị ọzọ asị n’obi ha ma na-eme ihe ndị gosiri na ha kpọrọ ndị ọzọ asị. Chineke ga-enyere ndị mmadụ aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị a ezughị okè mere ka ha na-akpa. Mgbe ahụ, ịkpọasị ga-ala ka naị.​—Aịzaya 54:13.

BAỊBỤL KWERE ANYỊ NKWA NA E NWERE MGBE ỊKPỌASI NA-AGAGHỊZI ADỊ N’ỤWA

  1. 1. E NWEGHỊ ONYE A GA-EMEGBU. Ọ bụ Alaeze Chineke ga na-achị ụwa n’oge ahụ. Ọ ga-esi n’eluigwe na-achị, meekwa ka mmegbu kwụsị kpamkpam. (Daniel 2:44) E nweghịzi onye ga-akpọ ibe ya asị. Chineke ga-edozi nsogbu niile ịkpọasị kpataara ndị mmadụ taa.​—Luk 18:7.

  2. 2. MMADỤ NIILE GA-ADỊ N’UDO. O nweghị onye ga na-ata ahụhụ n’ihi agha ma ọ bụ tigbuo zọgbuo. (Abụ Ọma 46:9) Obi ga-eru ndị niile bi n’ụwa ala n’ihi na onye ọ bụla na ibe ya ga-adị n’udo.​—Abụ Ọma 72:7.

  3. 3. MMADỤ NIILE GA-ADỊ NDỤ EBIGHỊ EBI N’ỤWA NSOGBU NA-ADỊGHỊ NA YA. Mmadụ niile bi n’ụwa ga-eji obi ha hụ ibe ha n’anya. (Matiu 22:39) E nweghị onye ga-enwe nsogbu ọ bụla. E nweghịkwa onye ga na-echeta ihe ndị ga-eme ka obi na-ajọ ya njọ. (Aịzaya 65:17) N’oge ahụ, mmadụ niile nọ n’ụwa agaghịzi na-akpọ ibe ha asị. “Obi ga-adịkwa ha ezigbo ụtọ maka na ha ga-anọ nnọọ n’udo.”​—Abụ Ọma 37:11.

Ị̀ ga-achọ ibi n’ụdị ụwa a? Ọtụtụ ndị n’ụwa ugbu a na-esi na Baịbụl amụta ihe ndị na-enyere ha aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. (Abụ Ọma 37:8) Ọ bụ ihe a ka ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa niile na-eme. Ha niile hụrụ ibe ha n’anya, dịrịkwa n’udo n’agbanyeghị na ha si n’ebe dị iche iche, omenala ha adịkwa iche iche.​—Aịzaya 2:2-4.

Ndịàmà Jehova ga-achọ ịkụziri gị ihe ha mụtara na-enyere ha aka ma a na-emegbu ha ma ọ bụkwanụ kpọọ ha asị. Ihe ndị ha ga-akụziri gị ga-enyere gị aka ka i jiri nwayọọ nwayọọ kwụsịchaa ịkpọ ndị ọzọ asị ma na-ahụ ha n’anya. Ị ga-amụta otú ị ga-esi jiri obiọma na-emeso ndị ọzọ, ma ndị na-anaghị eji ihe i meere ha kpọrọ ihe ma ndị kpọrọ gị asị. I mee ihe ndị a, obi ga na-adịkwu gị ụtọ, gị na ndị ọzọ ga na-adịkwukwa ná mma. Nke kachanụ bụ na ị ga-amụta ihe ị ga-eme ka i nwee ike ibi n’Alaeze Chineke, bụ́ ebe ịkpọasị ọ bụla na-agaghị adị.​—Abụ Ọma 37:29.