Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
Gịnị bụ Amagedọn?
Ụfọdụ ndị na-ekwu . . .
na ọ ga-abụ mbibi a ga-eji ngwá agha ọgwụrụ mba bibie ụwa ma ọ bụkwanụ mgbe ọdachi ndị na-emere onwe ha ga-ebibi ụwa a. Gịnị ka i chere?
Ihe Baịbụl kwuru
Amagedọn bụ “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” ga-eji ebibi ndị ajọ omume.—Mkpughe 16:14, 16.
Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?
Ihe mere Chineke ga-eji alụ agha Amagedọn abụghị ka o bibie ụwa, kama, ka o chebe ya ka ụmụ mmadụ ghara ibibi ya.—Mkpughe 11:18.
Agha Amagedọn ga-akwụsị agha niile.—Abụ Ọma 46:8, 9.
Ò Nwere Ndị Agha Amagedọn Na-agaghị Egbu?
Gịnị ka ị ga-aza?
Ee
Mba
O nwere ike
Ihe Baịbụl kwuru
“Oké ìgwè mmadụ” ndị si ná mba niile agaghị anwụ “n’oké mkpagbu ahụ.” Agha Amagedọn bụ ihe ikpeazụ ga-eme “n’oké mkpagbu ahụ.”—Mkpughe 7:9, 14.
Olee ihe ọzọ anyị ga-amụta na Baịbụl?
Chineke chọrọ ka ọtụtụ ndị ghara ịnwụ n’Amagedọn. Ma, ọ ga-egbu ndị ajọ omume n’ihi na ha achọghị ichegharị.—Ezikiel 18:32.
Baịbụl kwuru ihe anyị ga-eme ka a ghara ibibi anyị n’Amagedọn.—Zefanaya 2:3.