Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inọk na Chineke Yịkọrọ Jegharịa n’Ụwa nke Na-adịghị Asọpụrụ Chineke

Inọk na Chineke Yịkọrọ Jegharịa n’Ụwa nke Na-adịghị Asọpụrụ Chineke

Inọk na Chineke Yịkọrọ Jegharịa n’Ụwa nke Na-adịghị Asọpụrụ Chineke

EKWENSU na-azọrọ na ya pụrụ ịdọpụ mmadụ nile n’ebe Chineke nọ, mgbe ụfọdụkwa, ọ pụrụ iyiwo ka a ga-asị na ọ na-enwe ihe ịga nke ọma. Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ ise Ebel nwụsịrị, ọ dịghị onye gosipụtara onwe ya dị ka ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi. Kama nke ahụ, mmehie na asọpụrụghị Chineke bụ ihe juru ebe nile.

Ọ bụ n’oge ahụ rụrụ arụ n’ụzọ ime mmụọ ka Inọk pụtara n’ụwa. Usoro ọgụgụ oge Bible gosiri na a mụrụ ya na 3404 T.O.A. N’adịghị ka ndị ya na ha bikọrọ ndụ, Inọk ghọrọ onye Chineke nabatara nke ọma. Pọl onyeozi gụnyere ya ná ndị ohu Jehova bụ́ ndị okwukwe ha bụụrụ ndị Kraịst ihe nlereanya. Ònye bụ Inọk? Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka ọ na-aghaghị iche ihu? Olee otú o si merie ha? Uru dịkwa aṅaa ka iguzosi ike n’ezi ihe ya baara anyị?

N’oge Enọsh, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ anọ tupu oge Inọk, “a malitere ịkpọku aha Jehova.” (Jenesis 4:26) E jiwo aha Chineke na-eme ihe kemgbe mmalite nke akụkọ ihe mere eme mmadụ. N’ihi ya, ihe àmà na-egosi na ihe a malitere ime mgbe Enọsh nọ ndụ abụghị iji okwukwe na ofufe dị ọcha na-akpọku aha Jehova. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta asụsụ Hibru na-ekwu na ihe Jenesis 4:26 kwesịrị ịgụ bụ “a malitere imerụ” ma ọ bụ “mgbe ahụ ka mmerụ malitere.” Ọ pụrụ ịbụwo na ndị mmadụ zara aha Jehova ma ọ bụ kpọọ ya mmadụ ndị ọzọ ha na-eme ka a ga-asị na ha si n’aka ha agakwuru Chineke n’ofufe. Ma ọ bụkwanụ ikekwe ha na-akpọ arụsị aha Ya.

‘Inọk na Ezi Chineke ahụ Yịkọrọ Jegharịa’

Ọ bụ ezie na asọpụrụghị Chineke gbara Inọk gburugburu, ya ‘na ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, yịkọrọ na-ejegharị.’ A sịghị na ndị nna ya ochie—Set, Enọsh Kenan, Mahalalel, na Jered—na Chineke yịkọrọ jegharịa. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ha emerughị ya otú Inọk meruru, bụ́ onye o doro anya na ụzọ ndụ ya mere ka ọ dị iche n’ebe ha nọ.—Jenesis 5:3-27.

Iso Jehova na-ejegharị pụtara ịmara Chineke nke ọma na iso ya na-enwe mmekọrịta chiri anya bụ́ nke kwere Inọk omume nanị n’ihi na o biri ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke. Jehova nabatara nraranye Inọk. N’ezie, Septuagint nke Grik na-ekwu na ‘ihe Inọk dị Chineke ezi mma,’ bụ́ echiche Pọl onyeozi kwupụtakwara.—Jenesis 5:22; Ndị Hibru 11:5.

Isi ihe mere ka Inọk na Jehova nwee mmekọrịta dị mma bụ okwukwe ya. Ọ ghaghị ịbụ na o gosipụtara okwukwe ná “mkpụrụ” nke “nwanyị” Chineke ahụ e kwere ná nkwa. Ọ bụrụ na Inọk maara Adam n’onwe ya, ọ pụrụ inwetawo ihe ọmụma ụfọdụ banyere otú Chineke si mesoo di na nwunye mbụ ahụ nọrọ n’ogige Iden ihe. Ihe ọmụma Inọk nwere banyere Chineke mere ka ọ bụrụ ụdị mmadụ nke “na-achọsi ya ike.”—Jenesis 3:15; Ndị Hibru 11:6, 13, NW.

N’ọnọdụ Inọk nakwa na nke anyị, iso Jehova na-enwe mmekọrịta dị mma chọrọ ihe karịrị nanị ịmara Chineke. Ọ bụrụ na ọ dị onye anyị ji mmekọrịta nke anyị na ya kpọrọ nnọọ ihe, ọ́ bụghị eziokwu na otú onye ahụ si ele ihe anya ga na-emetụta otú anyị si eche echiche ma na-eme omume? Anyị ga na-ezere ikwu ma ọ bụ ime ihe ga-emebi ọbụbụenyi ahụ. Ọ bụrụ na anyị na-eche echiche ime mgbanwe ụfọdụ n’ọnọdụ anyị, ọ̀ bụ na anyị adịghịkwa echebara otú nke a pụrụ isi metụta mmekọrịta ahụ echiche?

N’otu aka ahụ, ọchịchọ ịnọgide soro Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya na-emetụta ihe anyị na-eme. Otu ihe dị oké mkpa iji mee nke a bụ inwe ezi ihe ọmụma nke ihe ndị ọ na-anakwere na ihe ndị ọ na-adịghị anakwere. Mgbe ahụ, ọ ga-adị anyị mkpa ịbụ ndị ihe ọmụma ahụ na-eduzi, anyị ga na-agbalịsikwa ike ime ihe na-atọ ya ụtọ n’echiche na n’omume.

Ee, iji soro Chineke na-ejegharị, anyị aghaghị ịdị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. Nke ahụ bụ ihe Inọk mere ruo ọtụtụ narị afọ. N’ezie, ụdị ngwaa Hibru nke na-egosi na Inọk sooro Chineke ‘jegharịa’ na-enye echiche nke ihe e mere ugboro ugboro n’esepụghị aka. Nwoke ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nke ya na ‘Chineke yịkọrọ jegharịa’ bụ Noa.—Jenesis 6:9.

Inọk bụ nwoke ji ezinụlọ, onye nwere nwunye ma mụọ “ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.” Otu n’ime ụmụ ya ndị ikom bụ Metusela. (Jenesis 5:21, 22) Ọ ghaghị ịbụ na Inọk mere ihe nile ọ pụrụ ime iji chịa ezinụlọ ya nke ọma. Otú ọ dị, n’ihi asọpụrụghị Chineke nke gbara ya gburugburu, ọ dịrịghị ya mfe ijere Chineke ozi. Ọ pụrụ ịbụwo na ọ bụ nanị Lemek, bụ́ nna Noa, bụ onye ya na ya bikọrọ ndụ nke gosipụtara okwukwe n’ebe Jehova nọ. (Jenesis 5:28, 29) N’agbanyeghị nke ahụ, Inọk ji obi ike fee ezi ofufe.

Gịnị nyeere Inọk aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o soghị ndị na-emerụ aha Jehova ma ọ bụ ndị ọzọ bụ́ ndị na-ekwesịghị ka ha na onye na-efe Chineke bụrụ enyi, kpakọrịta. Ọ ghaghịkwa ịbụ na ịchọ enyemaka Jehova site n’ekpere mere ka mkpebi siri ike Inọk mere izere ihe ọ bụla pụrụ ịkpasu Onye Okike ya iwe, sikwuo ike.

Amụma Megide Ndị Na-adịghị Asọpụrụ Chineke

Ịnọgide na-enwe ụkpụrụ dị elu na-esi nnọọ ike mgbe ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke gbara anyị gburugburu. Ma Inọk zikwara ozi ikpe dị ike megide ndị na-emebi iwu. N’ịbụ onye mmụọ Chineke duziri, Inọk kwupụtara n’ụzọ amụma, sị: “Lee, Onyenwe anyị bịara, Ya na ndị nsọ Ya a na-apụghị ịgụta ọnụ, ikpe mmadụ nile ikpe, na ịtụ ndị nile ndị na-asọpụrụghị Chineke ihe n’anya, bụ́ ọrụ nile nke asọpụrụghị Chineke ha nke ha rụrụ n’asọpụrụghị Chineke, ha na okwu dị ike nile nke ndị mmehie ndị na-asọpụrụghị Chineke kwugidere Ya.”—Jud 14, 15.

Mmetụta dị aṅaa ka ozi dị otú ahụ ga-enwe n’ahụ ndị na-ekweghị ekwe kpọrọ ekwo nkụ? Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na okwu ndị ahụ na-agba agba ná ntị mere ka a kpọọ Inọk asị, ikekwe na-akpata ịkwa ya emo, ime ya akaje, na iyi ya egwu. Ọ ghaghị ịbụ na ụfọdụ chọrọ igbu ya. Otú ọ dị, e menyelighị Inọk ụjọ. Ọ maara ihe mere onye ezi omume bụ́ Ebel, dịkwa ka ya, Inọk kpebisiri ike ijere Chineke ozi, n’agbanyeghị ihe ga-emenụ.

“Chineke Kuuru Ya”

Ihe àmà na-egosi na ndụ Inọk nọ n’ihe ize ndụ mgbe “Chineke kuuru ya.” (Jenesis 5:24) Jehova ekweghị ka onye amụma ya kwesịrị ntụkwasị obi taa ahụhụ n’aka ndị iro na-eme ihe ike bụ́ ndị iwe juru obi. Dị ka Pọl onyeozi si kwuo, ‘e bubigara Inọk ka ọ ghara ịhụ ọnwụ.’ (Ndị Hibru 11:5) Ọtụtụ ndị na-ekwu na Inọk anwụghị anwụ—na Chineke kuuru ya gaa eluigwe, bụ́ ebe ọ nọgidere na-adị ndụ. Otú ọ dị, Jisọs kwuru hoo haa, sị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgoworo n’eluigwe, ma ọ bụghị Onye siri n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ.” Jisọs bụ ‘onye bu ụzọ’ ná ndị nile gara eluigwe.—Jọn 3:13; Ndị Hibru 6:19, 20.

Ya mere, gịnị mere Inọk? Ya ịbụ onye ‘e bubigara ka ọ ghara ịhụ ọnwụ’ pụrụ ịpụta na Chineke mere ka ọ nọrọ nnọọ n’ọhụụ ma mezie ka ọ nwụọ mgbe ọ ka nọ n’ọnọdụ ahụ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, Inọk agaghị anụ ụfụ ọnwụ. Mgbe ahụ, “a hụghịkwa ya” n’ihi na, dị ka ihe àmà na-egosi, Jehova liri ozu ya, ọbụna dị ka o liri nke Mosis.—Deuterọnọmi 34:5, 6.

Inọk biri ndụ afọ 365—o rudịghị ọkara afọ ndụ nke ndị ya na ha dịkọrọ ndụ. Ma ihe dị ndị hụrụ Jehova n’anya mkpa bụ ka ha jeere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ nke ndụ ha. Anyị maara na Inọk mere otú ahụ n’ihi na “mgbe a ka-ebubigaghị ya a gbaworo ya àmà na ihe ọ na-emerịị na-atọ Chineke ụtọ.” Akwụkwọ Nsọ ekwughị otú Jehova si gwa Inọk nke a. Otú o sina dị, tupu Inọk anwụọ, e mesiri ya obi ike na o nwere nnwapụta Chineke, anyị pụkwara ijide n’aka na Jehova ga-echeta ya ná mbilite n’ọnwụ.

Ṅomie Okwukwe Inọk

N’ụzọ kwesịrị ekwesị, anyị pụrụ iṅomi okwukwe nke ụmụ mmadụ ndị na-asọpụrụ Chineke. (Ndị Hibru 13:7) Ọ bụ okwukwe ka Inọk ji jee ozi dị ka onye amụma mbụ kwesịrị ntụkwasị obi nke Chineke. Ụwa nke oge Inọk dị ka nke anyị—nke na-eme ihe ike, nke rụrụ arụ, na nke na-adịghị asọpụrụ Chineke. Otú ọ dị, Inọk dị iche. O nwere ezi okwukwe ma bụrụ onye nlereanya kwesịrị nṅomi n’ịsọpụrụ Chineke. Ee, Jehova nyere ya ozi ikpe dị ike ka ọ kpasaa, ma o wusikwara ya ike ịkpọsa ya. Inọk ji obi ike rụọ ọrụ e nyere ya, Chineke lekọtakwara ya mgbe o chere mmegide ndị iro ihu.

Ọ bụrụ na anyị egosipụta okwukwe dị ka Inọk mere, Jehova ga-ewusi anyị ike ịkpọsa ozi ya na mgbe ikpeazụ a. Ọ ga-enyere anyị aka iji obi ike na-anagide mmegide, nsọpụrụ anyị na-asọpụrụ Chineke ga-eme ka anyị dị nnọọ iche n’ebe ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke nọ. Okwukwe ga-enyere anyị aka iso Chineke na-ejegharị ma na-akpa àgwà n’ụzọ ga-eme ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11) Site n’okwukwe, onye ezi omume bụ́ Inọk nwere ihe ịga nke ọma n’isoro Jehova na-ejegharị n’ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke, anyị pụkwara inwe ihe ịga nke ọma otú ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 30]

Bible Ọ̀ Na-ehota Okwu Site n’Akwụkwọ Inọk?

Akwụkwọ Inọk bụ ihe odide nke apọkrịfa na nke pseudepigrapha. E kwuru n’ụzọ na-abụghị eziokwu na ọ bụ Inọk dere ya. Ikekwe n’ịbụ nke e dere n’ihe dị ka narị afọ nke abụọ na nke mbụ T.O.A., ọ bụ nchịkọta nke akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme nke ndị Juu bụ́ nke e tinyere nnu na ose, nke ihe àmà na-egosi na ọ bụ nkọwa sara mbara banyere aka dị mkpirikpi Jenesis zoro n’ebe Inọk nọ. Nanị nke a ezuola ime ka onye hụrụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ n’anya jụ ihe odide ahụ.

N’ime Bible, ọ bụ nanị akwụkwọ Jud bu okwu amụma nke Inọk, bụ́: “Lee, Onyenwe anyị bịara, Ya na ndị nsọ Ya a na-apụghị ịgụta ọnụ, ikpe mmadụ nile ikpe, na ịtụ ndị nile ndị na-asọpụrụghị Chineke ihe n’anya, bụ́ ọrụ nile nke asọpụrụghị Chineke ha nke ha rụrụ n’asọpụrụghị Chineke, ha na okwu dị ike nile nke ndị mmehie ndị na-asọpụrụghị Chineke kwugidere Ya.” (Jud 14, 15) Ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-ekwu na e si kpọmkwem n’Akwụkwọ Inọk hota amụma Inọk buru megide ndị ya na ha dịkọrọ ndụ bụ́ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ò kwere omume na Jud ga-esi n’akwụkwọ apọkrịfa a na-apụghị ịdabere na ya nweta ihe o dere?

E kwughị otú Jud si mara banyere amụma Inọk n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ pụrụ ịbụ nnọọ na o hotara ya site n’ihe odide a ma ama a pụrụ ịdabere na ya bụ́ nke dịwara eri oge gboo. Ihe àmà na-egosi na Pọl mekwara ihe yiri nke ahụ mgbe o kwuru na aha ndị majik ahụ na-anọ n’obí eze Fero a na-akpọghị aha ha bụ́ ndị megidere Mosis, bụ Janis na Jambris. Ọ bụrụ na onye dere Akwụkwọ Inọk nwere ike inweta ihe odide oge ochie dị otú a, gịnị mere Jud apụghị inweta ya? *Ọpụpụ 7:11, 22; 2 Timoti 3:8.

Otú Jud si nweta ihe ọmụma banyere ozi Inọk ziri megide ndị ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke bụ obere okwu. Eziokwu ahụ bụ́ na Jud dere ihe odide ya site n’ike mmụọ nsọ Chineke nwapụtara na ọ bụ ihe a pụrụ ịdabere na ya. (2 Timoti 3:16) Mmụọ nsọ Chineke duziri ya ka ọ ghara ikwu ihe ọ bụla na-abụghị eziokwu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 28 Onye na-eso ụzọ bụ́ Stifen nyekwara ihe ọmụma nke na-adịghị ebe ọ bụla ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. O metụtara agụmakwụkwọ Mosis n’Ijipt, ya ịbụ onye dị afọ 40 mgbe ọ gbapụrụ n’Ijipt, afọ 40 ọ nọrọ na Midian, na òkè mmụọ ozi keere n’inye Iwu Mosis.—Ọrụ 7:22, 23, 30, 38.

[Foto dị na peeji nke 31]

Inọk ji obi ike zie ozi Jehova