Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Rut

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Rut

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Rut

Ọ BỤ ihe nkiri na-enye obi ụtọ nke iguzosi ike n’ihe n’etiti ụmụ nwanyị abụọ. Ọ bụ ihe ndekọ banyere ekele maka Jehova Chineke na ịtụkwasị obi ná ndokwa ya. Ọ bụ akụkọ nke na-eme ka ọ pụta ìhè na Jehova nwere mmasị dị ukwuu n’eriri Mezaịa ahụ ga-esi na ya pụta. Ọ bụ akụkọ ọṅụ na iru újú nke otu ezinụlọ. Akwụkwọ Bible bụ́ Rut bụ ihe ndị a na ihe ndị ọzọ.

Akwụkwọ Rut na-akọ ihe mere n’ime afọ 11 “mgbe ndị ikpe na-ekpe” n’Izrel. (Rut 1:1) Ọ ga-abụrịrị na ihe omume ndị e dekọrọ na ya mere ná mmalite nke oge Ndị Ikpe, ebe ọ bụ na onyenwe ala bụ́ Boaz, otu n’ime ndị so n’ihe nkiri a mere eme, bụ nwa Rehab nke biri ndụ n’ụbọchị Jọshụa. (Joshua 2:1, 2; Rut 2:1; Matiu 1:5) O yiri ka ọ̀ bụ Samuel dere akụkọ a n’afọ 1090 T.O.A. Nke a bụ nanị akwụkwọ Bible bu aha nwanyị na-abụghị onye Izrel. Ozi dị na ya “dị ndụ ma na-akpa ike.”—Ndị Hibru 4:12.

“EBE Ị NA-EJE KA M GA-EJE”

(Rut 1:1–2:23)

Mgbe Naomi na Rut bịarutere Betlehem, anya mmadụ nile adịkwasị ha n’ahụ́. N’ikwu banyere onye nke ka mee okenye n’ime ha abụọ, ụmụ nwanyị obodo ahụ anọgide na-ajụ, sị: “Ọ̀ bụ Naomi, bụ nke a?” Naomi zaghachiri, sị: “Unu akpọla m Naomi, kpọọnụ m Mara: n’ihi na Onye nke pụrụ ime ihe nile meworo m ihe ilu nke ukwuu. Mụ onwe m, n’aka ojuju ka m jere, ma Jehova emewo ka m gbara aka lọta.”—Rut 1:19-21.

Mgbe ụnwụ nri dị n’Izrel mere ka ezinụlọ ya kwapụ site na Betlehem gaa n’ala Moab, ‘aka Naomi juru eju’ n’echiche bụ́ na o nwere di na ụmụ nwoke abụọ. Otú ọ dị, obere oge ka ha kwagasịrị na Moab, di ya bụ́ Elimelek anwụọ. Ka e mesịrị, ụmụ ya ndị nwoke abụọ ahụ alụọ ụmụ nwanyị Moab bụ́ Ọpa na Rut. Mgbe ihe dị ka afọ iri gasịrị, ụmụ ya ndị nwoke abụọ ahụ anwụọ n’amụtaghị nwa, na-ahapụ ụmụ nwanyị atọ ahụ nanị ha. Mgbe nne di ha, bụ́ Naomi, kpebiri ịlaghachi Juda, ndị nwunye nke ụmụ ya abụọ ahụ nwụrụ anwụ esoro ya. N’ụzọ, Naomi agbaa ndị nwunye ụmụ ya ume ịlaghachi Moab ma lụrụ di n’etiti ndị obodo ha. Ọpa ekweta. Otú ọ dị, Rut arapara Naomi n’ahụ́, na-ekwu, sị: “Ebe ị na-eje ka m ga-eje; ọ bụkwa ebe ị na-anọ ọnọdụ abalị ka m ga-anọ ọnọdụ abalị: ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.”—Rut 1:16.

Ụmụ nwanyị abụọ ahụ di ha nwụrụ, bụ́ Naomi na Rut, abịarute Betlehem ná mmalite oge obibi ọka bali. N’iji ndokwa dị n’Iwu Chineke mee ihe, Rut amalite ịchịkọta ọka n’ubi nke otu onye ikwu Elimelek—bụ́ onye Juu merela agadi aha ya bụ Boaz. Rut enweta ihu ọma Boaz ma nọgide na-achịkọta ọka n’ubi ya ruo ọgwụgwụ nke “obibi ọka bali na obibi ọka wit.”—Rut 2:23.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:8—Gịnị mere Naomi ji gwa ndị nwunye ụmụ ya ka ha laghachi “nwanyị ọ bụla n’ụlọ nne ya” kama ịlaghachi n’ụlọ nna ya? E kwughị ma nna Ọpa ọ̀ ka dị ndụ n’oge ahụ ma ọ̀ bụ na ọ dịghịzi. Otú ọ dị, nna Rut ka dị ndụ. (Rut 2:11) N’agbanyeghị nke ahụ, Naomi kwuru banyere ụlọ nne ha, eleghị anya na-eche na ịkpọtụ nne ha aha ga-eme ka ha cheta nkasi obi nke ịhụnanya nne ha ga-ewetara ha. Nke a ga-akasi nnọọ ụmụ nwanyị a na-eru újú n’ihi ịhapụ nne di ha ha hụrụ n’anya obi karịsịa. Ọ pụkwara ịbụ na okwu ahụ na-enye echiche bụ́ na n’adịghị ka Naomi, nne Rut na nke Ọpa nwere ebe obibi ndị dị mma.

1:13, 21—Jehova ò mere ka ndụ Naomi luo ilu ma kpatara ya ihe mgbu? Ee e, Naomi eboghịkwa Chineke ebubo ihe ọjọọ ọ bụla. Otú ọ dị, n’ihi ihe nile ọ gabigara, o chere na Jehova na-emegide ya. Iwe ji ya, ya enweekwa nkụda mmụọ. E wezụga nke ahụ, n’oge ahụ, a na-ewere mkpụrụ nke afọ dị ka ngọzi Chineke, na-ewerekwa amụghị nwa dị ka nkọcha. N’ịbụ onye na-enweghị ụmụ ụmụ na onye ụmụ ya ndị nwoke abụọ nwụrụ, o nwere ike ịbụ na Naomi chere na ya ziri ezi iche na ọ bụ Jehova wedara ya ala.

2:12—Olee ‘ụgwọ ọrụ zuru ezu’ Rut nwetara site n’aka Jehova? Rut mụtara nwa nwoke ma nweta ihe ùgwù nke ịghọ onye so n’usoro ọmụmụ kasị mkpa e nwere n’akụkọ ihe mere eme—nke Jizọs Kraịst.—Rut 4:13-17; Matiu 1:5, 16.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

1:8; 2:20. N’agbanyeghị ọdachi ndị dakwasịrị ya, Naomi nọgidere na-enwe obi ike n’obiọma sitere n’ịhụnanya nke Jehova. Anyị kwesịkwara ime otu ihe ahụ, karịsịa mgbe anyị na-eche ule ndị siri ike ihu.

1:9. Ebe obibi ekwesịghị ịbụ nanị ebe ndị òtù ezinụlọ na-anọ eri nri ma na-ehi ụra. O kwesịrị ịbụ ebe dị n’udo nke a na-enweta ezumike na nkasi obi na ya.

1:14-16. Ọpa ‘laghachikwuuru ndị ya, laghachikwurukwa chi ya.’ Rut emeghị otú ahụ. Ọ hapụrụ ahụ́ iru ala na nchebe ọ ga-enwe n’ala nna ya ma nọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova. Ịzụlite ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke na igosipụta mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà ga-enye aka chebe anyị pụọ n’ịdaba n’ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na ‘ịsụla azụ gaa ná mbibi.’—Ndị Hibru 10:39.

2:2. Rut chọrọ iji ndokwa nke ịchịkọta ọka mee ihe bụ́ nke e mere maka abamuru nke ndị ala ọzọ na ndị e wedara n’ala. Ọ dị umeala n’obi. Onye Kraịst nọ ná mkpa ekwesịghị ịdị oké mpako ịnakwere enyemaka ịhụnanya nke ndị kwere ekwe ibe ya ma ọ bụ enyemaka ọ bụla o ruru eru inweta site n’aka ndị ọchịchị.

2:7. N’agbanyeghị na ọ bụ ihe ruuru ya ịchịkọta ọka, Rut buru ụzọ nata ikike tupu ya emee otú ahụ. (Levitikọs 19:9, 10) Nke a na-egosi na ọ dị umeala n’obi. Anyị ga-abụ ndị maara ihe ‘ịchọ ịdị umeala n’obi’ n’ihi na “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Zefanaịa 2:3; Abụ Ọma 37:11.

2:11. Rut gosiri na ya abụghị nanị onye ikwu nke Naomi. Ọ bụ ezigbo enyi ya. (Ilu 17:17) Ọbụbụenyi ha siri ike n’ihi na ọ dabeere n’àgwà ndị dị ka ịhụnanya, iguzosi ike n’ihe, mmetụta ọmịiko, obiọma na mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Nke kasị mkpa, ọ dabeere n’ọnọdụ ime mmụọ ha—ọchịchọ ha ijere Jehova ozi na iso ná ndị na-efe ya ofufe. Anyị onwe anyị kwa nwere ohere ndị magburu onwe ha iji zụlite ezi ọbụbụenyi n’ebe ndị na-efe ezi ofufe nọ.

2:15-17. Ọbụna mgbe Boaz nyere Rut ohere ịkwụsịlata ọrụ, ‘ọ nọgidere na-achịkọta ihe n’ubi ruo anyasị.’ Rut bụ onye na-arụsi ọrụ ike. E kwesịrị iji ịdị uchu n’ọrụ mara Onye Kraịst.

2:19-22. Naomi na Rut nwere mkparịta ụka ndị dị mma n’oge mgbede, nke okenye ana-egosi mmasị n’ọrụ nke nwata, ha abụọ ana-ekwupụta echiche na mmetụta ha n’ezoghị ọnụ. Ọ́ bụghị otú a ka o kwesịrị ịdị n’ezinụlọ Ndị Kraịst?

2:22, 23. N’adịghị ka ada Jekọb bụ́ Daịna, Rut sooro ndị na-efe Jehova kpakọrịta. Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke a bụụrụ anyị!—Jenesis 34:1, 2; 1 Ndị Kọrint 15:33.

AKA NAOMI ‘EJU’

(Rut 3:1–4:22)

Naomi emeela nnọọ agadi ịmụ ụmụ. N’ihi ya, ya agwa Rut ka ọ mụchitere ya nwa site n’ịlụ onye mgbapụta Naomi, ma ọ bụ ịlụ nwanne di ya. N’ịgbaso nduzi Naomi, Rut agwa Boaz ka ọ bụụrụ ya onye mgbapụta. Boaz ekwere ime nke ahụ. Otú ọ dị, e nwere onye ikwu ka nso nke e kwesịrị ibu ụzọ nye ohere ahụ.

Boaz egbughị oge n’idozi nsogbu ahụ. N’ụtụtụ echi ya, ya akpọkọọ ndị okenye iri nke Betlehem ma nọrọ n’ihu ha jụọ onye ikwu ahụ ma ọ̀ dị njikere ịrụ ọrụ mgbapụta ahụ. Nwoke ahụ ajụ ime otú ahụ. N’ihi ya, Boaz arụọ ọrụ dị ka onye mgbapụta ma lụọ Rut. Ha amụta nwa nwoke, bụ́ Obed, nna ochie nke Eze Devid. Ụmụ nwanyị Betlehem agwazie Naomi, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova bụ, . . . Ọ ga-abụkwara gị onye na-enyeghachi ndụ, na onye ga-azụ gị n’isi awọ: n’ihi na nwunye nwa gị, nke hụrụ gị n’anya, nke dịịrị gị mma karịa ụmụ ndị ikom asaa, amụwo ya.” (Rut 4:14, 15) Nwanyị nke ‘gba aka’ lọghachi na Betlehem abụrụwo onye ‘aka juru’ ọzọ!—Rut 1:21.

A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

3:11—Gịnị nyere Rut ezi aha nke ịbụ “nwanyị mara mma”? Ọ bụghị “ịkpa isi efu” ma ọ bụ “iyikwasị ihe ịchọ mma ọlaedo ma ọ bụ iyi uwe elu” mere ndị ọzọ ji nwee mmasị n’ebe Rut nọ. Kama, ọ bụ “mmadụ zoro ezo nke obi”—iguzosi ike n’ihe na ịhụnanya ya, ịdị umeala n’obi, na ịdị nwayọọ n’obi ya, ịdị uchu na mmụọ ịchụ onwe onye n’aja ya. Nwanyị ọ bụla na-atụ egwu Chineke nke chọrọ inwe ezi aha yiri nke Rut aghaghị ịgbalịsi ike ịzụlite àgwà ndị a.—1 Pita 3:3, 4; Ilu 31:28-31.

3:14—Gịnị mere Rut na Boaz jiri bilie tupu chi abọọ? Nke a abụghị n’ihi na o nweela ihe ọjọọ merelanụ n’abalị nke na ha chọrọ ikpuchi ya. Ihe Rut mere n’abalị ahụ kwekọrọ n’ihe nwanyị na-achọ ka nwanne di ya lụọ ya na-emekarị. O mere ihe Naomi gwara ya mee. Ọzọkwa, mmeghachi omume Boaz gosiri na ọ hụghị ihe ọ bụla dị njọ n’ihe Rut mere. (Rut 3:2-13) Ihe àmà na-egosi na Rut na Boaz biliri n’oge ka ndị mmadụ ghara inwe ihe mere ha ga-eji malite ibugharị akụkọ na-enweghị ihe ndabere.

3:15—Gịnị ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọka bali isii Boaz nyere Rut pụtara? O yiri ka nke a ọ̀ pụtara na dị nnọọ ka otu ụbọchị ezumike si esochi ụbọchị isii ndị e ji rụọ ọrụ, ụbọchị izu ike Rut eruola nso. Boaz ga-ahụ na ọ ga-enwe “ebe izu ike” n’ụlọ di ya. (Rut 1:9; 3:1) Ọ pụkwara ịbụ na ọ̀tụ̀tụ̀ ọka bali isii bụ nanị ihe Rut ga-ebuli n’isi.—Lee ihe odide ala ala peeji.

3:16—Gịnị mere Naomi ji jụọ Rut, sị: “Ònye ka ị bụ, nwa m?” Ọ̀ bụ na ọ mataghị nwunye nwa ya? Nke a pụrụ ịbụ ya kpatara ya, n’ihi na mgbe Rut lọghachikwutere Naomi, ọ pụrụ ịbụ na ọchịchịrị ka gbara. Otú ọ dị, ajụjụ ahụ nwekwara ike ịpụta na Naomi na-ajụ Rut onye ọ bụzi n’ihe banyere mgbapụta ya.

4:6—N’ụzọ dị aṅaa ka onye mgbapụta pụrụ isi “bibie” ihe nketa ya site n’ịgbapụta mmadụ? Nke mbụ, ọ bụrụ na onye dara ogbenye rere ala o ketara, onye mgbapụta ga-azụtaghachi ala ahụ n’ọnụ ego a gwara ya na-adabere n’afọ ole fọdụrụnụ tupu e nwee Jubile ọzọ. (Levitikọs 25:25-27) Ime otú ahụ ga-ebelata uru nke ala na ụlọ ya. Ọzọkwa, ya bụrụ na ọ mụọrọ Rut nwa nwoke, ọ bụ nwa nwoke ahụ, ọ bụghị onye ikwu ka nọrọ onye mgbapụta ahụ nso ugbu a, ga-enwe ala ahụ a zụtaghachiri.

Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị:

3:12; 4:1-6. Boaz gbasochiri ndokwa Jehova anya. Ànyị na-agbasochi usoro ọchịchị Chineke anya?—1 Ndị Kọrint 14:40.

3:18. Naomi nwere obi ike n’ebe Boaz nọ. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe obi ike yiri nke ahụ n’ebe ndị kwere ekwe ibe anyị nọ? Rut dị njikere ịlụ nwanne di ya ọ na-amabughị, nwoke Bible na-ekwughị aha ya. (Rut 4:1) N’ihi gịnị? N’ihi na o nwere obi ike ná ndokwa Chineke. Ànyị nwere obi ike yiri nke ahụ? Dị ka ihe atụ, mgbe a bịara n’ihe banyere ịchọta onye òtù ọlụlụ, ànyị na-agbaso ịdọ aka ná ntị nke ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị”?—1 Ndị Kọrint 7:39.

4:13-16. Ọ bụ ezie na Rut bụ onye Moab na-efebu chi Kemọsh, lee oké ihe ùgwù o nwetara! Nke a na-egosi ụkpụrụ ahụ bụ́ na “ọ na-adabere, ọ bụghị n’onye ahụ ọ bụ ọchịchọ ya ma ọ bụ n’onye na-agba ọsọ, kama na Chineke, onye na-eme ebere.”—Ndị Rom 9:16.

Chineke ‘Ga-ebuli Gị Elu Mgbe Oge Ya Ruru’

Akwụkwọ Rut na-ekpughe Jehova dị ka Chineke nke obi ebere ịhụnanya, onye na-arụ ọrụ maka ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe. (2 Ihe E Mere 16:9) Mgbe anyị chere echiche banyere otú e si gọzie Rut, anyị na-ahụ uru ọ bara iji okwukwe siri nnọọ ike nwee obi ike na Chineke, kwenyesie ike “na ọ dị adị, nakwa na ọ bụ onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.

Rut, Naomi na Boaz nwere ntụkwasị obi zuru ezu ná ndokwa Jehova, ihe gakwaara ha nke ọma. N’otu aka ahụ, “Chineke na-eme ka ọrụ ya nile kwenyekọọ maka ọdịmma nke ndị hụrụ Chineke n’anya, bụ́ ndị ahụ a kpọrọ dị ka nzube ya si dị.” (Ndị Rom 8:28) Mgbe ahụ, ka anyị buru ịdọ aka ná ntị a Pita onyeozi nyere n’obi: “Ya mere, wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee bulie unu elu mgbe oge ya ruru; ka unu na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere unu.”—1 Pita 5:6, 7.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ị̀ maara ihe mere na Rut agbahapụghị Naomi?

[Foto dị na peeji nke 27]

Gịnị nyere Rut ezi aha nke ịbụ “nwanyị mara mma”?

[Foto dị na peeji nke 28]

Gịnị bụ “ụgwọ ọrụ zuru ezu” sitere n’aka Jehova nke Rut nwetara?