Rubere Chineke Isi Ma Rite Uru Ná Nkwa Ya
Rubere Chineke Isi Ma Rite Uru Ná Nkwa Ya
‘Ebe Chineke na-apụghị iji onye ọ bụla ka ya onwe ya ukwuu ṅụọ iyi, o ji onwe ya ṅụọ iyi.’—HIB. 6:13.
LEE MA Ị̀ GA-AZALI AJỤJỤ NDỊ A:
Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na nzube Chineke ga-emezu?
Olee nkwa Chineke kwere mgbe Adam na Iv mehiechara?
Olee otú anyị si erite uru ná nkwa Chineke kwere Ebreham?
1. Olee otú nkwa Jehova si dị iche na nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè?
JEHOVA bụ “Chineke nke eziokwu.” (Ọma 31:5) Ebe ọ bụ na ndị mmadụ ezughị okè, anyị enweghị ike ịtụkwasị ha obi mgbe niile. Ma, ‘ọ gaghị ekwe omume na Chineke ga-agha ụgha.’ (Hib. 6:18; gụọ Ọnụ Ọgụgụ 23:19.) Ọ na-emezu nzube ya ka ọ baara ụmụ mmadụ uru. Dị ka ihe atụ, ihe ọ bụla Chineke kwuru na ya ga-eme n’ụbọchị nke ọ bụla o ji kee ihe mezuru “otú ahụ.” N’ihi ya, mgbe ụbọchị nke isii gwụchara, “Chineke hụrụ ihe niile o mere, ma, lee! ha dị nnọọ mma.”—Jen. 1:6, 7, 30, 31.
2. Gịnị bụ ụbọchị izu ike Chineke, gịnịkwa mere o ji “mee ka ọ dị nsọ”?
2 Mgbe Jehova Chineke kwuchara na ihe niile o kere dị mma, o kwuru ihe gosiri na ụbọchị nke asaa amalitela. Ọ bụghị ụbọchị nkịtị, kama ọ bụ ogologo oge Chineke ji ezu ike mgbe o kechara ihe ndị o kere n’ụwa. (Jen. 2:2) Ụbọchị izu ike Chineke agwụbeghị. (Hib. 4:9, 10) Baịbụl ekwughị kpọmkwem mgbe ọ malitere. Ọ malitere obere oge ka e kechara nwunye Adam, bụ́ Iv, ihe dị ka puku afọ isii gara aga. Ọchịchị Puku Afọ Kraịst ga-amalite n’oge na-adịghị anya. N’oge ahụ, Chineke ga-emezu ihe o bu n’obi kee ụwa, ya bụ, ka ụwa bụrụ paradaịs ebe ndị mmadụ zuru okè ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. (Jen. 1:27, 28; Mkpu. 20:6) Obi kwesịrị isi gị ike na ị ga-enwe ụdị obi ụtọ ahụ n’ọdịnihu. ‘Chineke gọziri ụbọchị nke asaa ma mee ka ọ dị nsọ.’ Nke a mere ka obi sie anyị ike na n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla, nkwa Chineke ga-emezurịrị mgbe ụbọchị izu ike ya ga-agwụcha.—Jen. 2:3.
3. (a) Gịnị mere mgbe ụbọchị izu ike Chineke malitechara? (b) Olee otú Jehova si mee ka a mata otú ọ ga-esi dozie nsogbu ahụ?
1 Tim. 2:14) Iv mechara mee ka di ya soro ya nupụrụ Jehova isi. (Jen. 3:1-6) Nnupụisi ahụ bụ ihe kacha njọ metụrụlanụ. Ma n’agbanyeghị na Setan boro Jehova ebubo na ọ naghị ekwu eziokwu, Jehova echeghị na ọ dị mkpa ịṅụ iyi iji gosi na ya ga-emezu ihe ya bu n’obi maka ụwa. Kama nke ahụ, o kwere nkwa a ga-aghọta mgbe oge ruru. O kwuru otú ọ ga-esi dozie nsogbu ahụ. Ọ gwara Setan, sị: “M ga-emekwa ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị ahụ nakwa n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya. Ọ ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.”—Jen. 3:15; Mkpu. 12:9.
3 Ma, mgbe ụbọchị izu ike Chineke malitechara, ụfọdụ ndị Chineke kere nupụụrụ ya isi. Setan, onye bụ́bu mmụọ ozi Chineke, gbalịrị ime ka e fewe ya kama ife Chineke. Ọ ghara ụgha mbụ ma duhie Iv, nke mere ka Iv nupụrụ Jehova isi. (ỊṄỤ IYI BỤ IHE IWU KWADORO E JI EKWE NKWA
4, 5. Gịnị ka Ebreham mere mgbe ụfọdụ iji gosi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu?
4 N’isi mbụ ahụ, ọ dịghị ihe gosiri na ọ dị mkpa ka Adam na Iv ṅụọ iyi iji gosi na ihe ha na-ekwu bụ eziokwu. N’oge ahụ, ndị hụrụ Chineke n’anya zuru okè ma na-eṅomi ya. Ọ dịghị mkpa ka ha ṅụọ iyi n’ihi na ha na-ekwu eziokwu mgbe niile, tụkwasịkwa ibe ha obi. Ma, mgbe Adam na Iv mehiechara ma ghọọ ndị na-ezughị okè, ọtụtụ ndị mechara malite ịgha ụgha na ịghọ aghụghọ. N’ihi ya, o mechara dị mkpa ka ndị mmadụ ṅụọ iyi mgbe a na-ekwu ihe dị mkpa iji gosi na ihe ha kwuru bụ eziokwu.
5 Nna ochie, bụ́ Ebreham, ṅụrụ iyi ugboro atọ ma ọ dịkarịa ala mgbe ọ na-ekwe nkwa. (Jen. 21:22-24; 24:2-4, 9) Dị ka ihe atụ, ọ ṅụrụ iyi mgbe o merichara eze Ilam na ndị òtù ya ma na-alọta. Eze Selem na eze Sọdọm pụtara izute Ebreham. Melkizedek, bụ́ eze Selem, bụkwa “onye nchụàjà nke Chineke bụ́ Onye Kasị Elu.” N’ihi ya, ọ gọziri Ebreham ma too Chineke maka ime ka Ebreham merie ndị iro ya. (Jen. 14:17-20) Mgbe eze Sọdọm chọrọ ịkwụ Ebreham ụgwọ maka ịnapụta ndị ya n’aka ndị ahụ bịara buso ha agha, Ebreham ṅụrụ iyi, sị: “M na-eweli aka m ṅụọrọ Jehova Chineke bụ́ Onye Kasị Elu, Onye kere eluigwe na ụwa, iyi na agaghị m ewere ihe ọ bụla bụ́ nke gị ma ọlị, malite n’eri ruo n’eriri akpụkpọ ụkwụ, ka i wee ghara ịsị, ‘Ọ bụ m mere ka Ebram baa ọgaranya.’”—Jen. 14:21-23.
NKWA JEHOVA KWERE EBREHAM
6. (a) Gịnị ka Ebreham mere nke anyị ga-eṅomi? (b) Olee uru anyị ga-erite n’ihi na Ebreham rubeere Chineke isi?
6 Jehova Chineke ṅụkwara iyi iji mee ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè tụkwasị nkwa ya obi. Mgbe Jehova na-aṅụ iyi, ọ na-ekwu ihe dị ka “‘Dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.” (Ezik. 17:16) Baịbụl kọwara na Jehova Chineke ṅụrụ iyi ihe karịrị ugboro iri anọ. O yiri ka nke a kacha mara ọ̀ bụ nke ọ ṅụụrụ Ebreham. Ruo ọtụtụ afọ, Jehova kwere Ebreham ọtụtụ nkwa ndị gosiri na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-esi n’agbụrụ Ebreham, site na nwa ya bụ́ Aịzik. (Jen. 12:1-3, 7; 13:14-17; 15:5, 18; 21:12) Jehova lekwara Ebreham ule siri ike. O nyere Ebreham iwu ka o jiri nwa ya ọ hụrụ n’anya chụọ àjà. N’egbughị oge, Ebreham rubere isi. Ma, mgbe ọ fọrọ obere ka o jiri Aịzik chụọ àjà, mmụọ ozi Jehova kwụsịrị ya. Chineke ṅụrụ iyi, sị: “Eji m onwe m na-aṅụ iyi . . . na ebe ọ bụ na i mewo ihe a, ị jụghịkwa inye m nwa gị nwoke, bụ́ onye ị mụrụ naanị ya, aghaghị m ịgọzi gị, aghaghịkwa m ime ka mkpụrụ gị mụbaa dị ka kpakpando nke eluigwe nakwa dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri; mkpụrụ gị ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ámá ndị iro ya. Ọ bụkwa site ná mkpụrụ gị ka mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha n’ihi na i gewo ntị n’olu m.”—Jen. 22:1-3, 9-12, 15-18.
7, 8. (a) Gịnị mere Chineke ji ṅụọrọ Ebreham iyi? (b) Olee otú “atụrụ ọzọ” nke Kraịst ga-esi rite uru n’iyi Chineke ṅụrụ?
7 Gịnị mere Chineke ji ṅụọrọ Ebreham iyi na nkwa o kwere ya ga-emezu? Ọ bụ iji mee ka obi sie ndị ha na Kraịst ga-eso chịa ike, ya bụ, ndị so ná “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa, ma mee ka okwukwe ha sie ike. (Gụọ Ndị Hibru 6:13-18; Gal. 3:29) Pọl onyeozi kwuru na Jehova “ji ịṅụ iyi mesie ya ike, ka anyị . . . wee nwee agbamume siri ike iji jigide olileanya ahụ e debere n’ihu anyị, site n’ihe abụọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe [ya bụ, nkwa ya na iyi ọ ṅụrụ], bụ́ ndị ọ na-agaghị ekwe omume na Chineke ga-agha ụgha na ha.”
8 Ọ bụghị naanị Ndị Kraịst e tere mmanụ na-erite uru n’iyi Chineke ṅụụrụ Ebreham. Jehova ṅụrụ iyi na ‘mba niile nke ụwa ga-esi ná mkpụrụ Ebreham gọzie onwe ha.’ (Jen. 22:18) “Atụrụ ọzọ,” bụ́ ndị na-erubere Kraịst isi, so ná ndị ahụ a gọziri agọzi. Ha nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’ụwa. (Jọn 10:16) Ma ì nwere olileanya ịga eluigwe ma ì nwere olileanya ibi n’ụwa, “jigide” olileanya gị ma na-erubere Chineke isi mgbe niile.—Gụọ Ndị Hibru 6:11, 12.
IYI NDỊ ỌZỌ CHINEKE ṄỤRỤ
9. Olee iyi Chineke ṅụrụ mgbe ụmụ Ebreham bụ ndị ohu n’Ijipt?
9 Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, Jehova ṅụrụ iyi ọzọ na ya ga-emezu nkwa ndị o kwere Ebreham. Ọ ṅụrụ iyi ahụ mgbe o zigara Mozis ka ọ gaa gwa ụmụ Ebreham ndị bụ́ ohu n’Ijipt okwu. (Ọpụ. 6:6-8) Chineke kwuru banyere oge ahụ, sị: “N’ụbọchị m họọrọ Izrel, . . . m weliri aka m ṅụọrọ ha iyi na m ga-akpọpụta ha n’ala Ijipt kpọga ha n’ala m ledooro ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.”—Ezik. 20:5, 6.
10. Olee nkwa Chineke kwere ndị Izrel mgbe ọ napụtachara ha n’Ijipt?
10 Mgbe Jehova napụtachara ụmụ Izrel n’Ijipt, o kwere ha nkwa ọzọ, sị: “Ọ bụrụ na unu ga-erube nnọọ isi n’ihe m kwuru ma debe ọgbụgba ndụ m n’ezie, unu ga-aghọ ihe onwunwe m pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ, n’ihi na elu ụwa dum bụ nke m. Unu onwe unu ga-aghọrọ m alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ.” (Ọpụ. 19:5, 6) Ọ bụ ihe ùgwù pụrụ iche Chineke nyere ndị Izrel! Ọ pụtara na ọ bụrụ na ha erubere Jehova isi, ọ ga-eme ka ndị si ná mba ahụ ghọọ alaeze ndị nchụàjà, bụ́ ndị a ga-esi n’aka ha gọzie ndị ọzọ. Jehova mechara kwuo banyere ihe o meere ndị Izrel n’oge ahụ, sị: “M ṅụkwaara gị iyi, mụ na gị wee gbaa ndụ.”—Ezik. 16:8.
11. Gịnị ka ndị Izrel kwuru mgbe Chineke gwara ha ka ya na ha gbaa ndụ ka ha bụrụ ndị ọ họọrọ?
11 N’oge ahụ, Jehova amanyeghị ndị Izrel ịṅụ iyi na ha ga na-erubere ya isi; ọ manyeghịkwa ha ka ya na ha gbaa ndụ. Kama nke ahụ, ha ji obi ha niile kwuo, sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru.” (Ọpụ. 19:8) Mgbe ụbọchị atọ gachara, Jehova Chineke gwara ndị Izrel ihe ọ chọrọ ka mba ọ họọrọ na-eme. O bu ụzọ nye ha Iwu Iri, meekwa ka Mozis gwa ha iwu ndị ọzọ e dere malite n’Ọpụpụ 20:22 ruo n’Ọpụpụ 23:33. Gịnị ka ndị Izrel kwuru mgbe ha nụrụ iwu ahụ niile? “Mmadụ niile wee jiri otu olu zaa, sị: ‘Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru.’” (Ọpụ. 24:3) Mozis deziri iwu ahụ niile ‘n’akwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ’ ma gụpụta ya ka ndị Izrel niile nụ ya ọzọ. Mgbe e mechara, ndị Izrel kwere nkwa nke ugboro atọ, sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru, anyị ga-erubekwa isi.”—Ọpụ. 24:4, 7, 8.
12. Gịnị ka Jehova mere mgbe o kwechara ndị Izrel nkwa na ya ga-eme ka ha bụrụ mba ya? Gịnị ka ndị Izrel mere mgbe ha kwechara Chineke nkwa ime uche ya?
12 Ozugbo ahụ, Jehova malitere imezu ihe o kwere ná nkwa n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Otú o si mee ya bụ ime ka e nwee ụlọikwuu a ga-anọ na-efe ya, nweekwa ndị nchụàjà ga na-enyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè aka ka ha na ya dị ná mma. Ma, ndị Izrel chefuru ozugbo na ha raara onwe ha nye Chineke. “Ha mekwara ihe wutere Onye Nsọ Izrel.” (Ọma 78:41) Dị ka ihe atụ, ka Mozis nọ na-anata iwu Chineke na-enye ya n’Ugwu Saịnaị, ike gwụrụ ndị Izrel iche Mozis, ha enweghịzi okwukwe na Chineke. Ha chere na Mozis ahapụla ha. N’ihi ya, ha kpụrụ nwa ehi ọlaedo ma gwa ndị Izrel ibe ha, sị: “Izrel, ihe a bụ Chi gị, nke dupụtara gị n’ala Ijipt.” (Ọpụ. 32:1, 4) Ha malitere ime ihe ha kpọrọ ‘ememme a na-emere Jehova.’ Ha kpọkwaara ihe ahụ ha kpụrụ isiala, chụọkwara ya àjà. Mgbe Jehova hụrụ ihe ha mere, ọ gwara Mozis, sị: “Ha emewo ngwa ngwa hapụ ụzọ m nyere ha n’iwu ka ha na-agbaso.” (Ọpụ. 32:5, 6, 8) Ọ dị mwute na malite mgbe ahụ, ndị Izrel ṅụụrụ Chineke iyi ugboro ugboro, ma ha emezughị nke ọ bụla.—Ọnụ Ọgụ. 30:2.
IYI ABỤỌ ỌZỌ JEHOVA ṄỤRỤ
13. Olee iyi Chineke ṅụụrụ Eze Devid? Olee otú o si gbasa Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa?
13 Mgbe Devid bụ eze Izrel, Jehova ṅụrụ iyi abụọ ndị ọzọ ga-abara ndị niile ga-erubere ya isi uru. Nke mbụ bụ iyi ọ ṅụụrụ Devid na ocheeze ya ga-adịru mgbe ebighị ebi. (Ọma 89:35, 36; ) Ọ pụtara na a ga-akpọ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa “Nwa Devid.” ( 132:11, 12Mat. 1:1; 21:9) Devid ji obi umeala kpọọ onye ahụ ga-esi n’agbụrụ ya “Onyenwe” ya n’ihi na Kraịst ga-anọ n’ọkwá dị elu.—Mat. 22:42-44.
14. Olee iyi Jehova ṅụrụ banyere Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, oleekwa otú anyị si erite uru na ya?
14 Nke abụọ bụ na Jehova si n’ike mmụọ nsọ mee ka Devid buo amụma na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-abụ ma Eze ma Nnukwu Onye Nchụàjà maka ụmụ mmadụ. N’Izrel oge ochie, onye bụ́ eze anaghị abụ onye nchụàjà. Ọ bụ ndị si n’ebo Livaị na-abụ ndị nchụàjà. Ma, ndị eze na-esi n’ebo Juda. Ma Devid buru amụma banyere Eze ahụ dị ebube a ga-amụ n’ọdịnihu, sị: “Ihe Jehova gwara Onyenwe m bụ: ‘Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m debere ndị iro gị ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ gị.’ Jehova aṅụwo iyi (ọ gaghịkwa akwa ụta): ‘Ị bụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek ruo mgbe ebighị ebi!’” (Ọma 110:1, 4) Dị ka Devid buru n’amụma, Jizọs Kraịst, bụ́ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, bụ eze ugbu a n’eluigwe. Ọ bụkwa Nnukwu Onye Nchụàjà maka ụmụ mmadụ, na-enyere ndị chegharịrị aka ka ha na Chineke dịrị ná mma.—Gụọ Ndị Hibru 7:21, 25, 26.
IZREL ỌHỤRỤ NKE CHINEKE
15, 16. (a) Olee Izrel abụọ Baịbụl kwuru banyere ha, oleekwa nke Chineke na-agọzi taa? (b) Olee iwu Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya banyere ịṅụ iyi?
15 Ebe ọ bụ na mba Izrel jụrụ Jizọs Kraịst, Chineke mechara jụ ha, ha enweghịzi olileanya ịbụ “alaeze nke ndị nchụàjà.” Jizọs gwara ndị isi ndị Juu, sị: “A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.” (Mat. 21:43) A mụrụ mba ọhụrụ ahụ n’ụbọchị Pentikọst afọ 33, mgbe Chineke wụkwasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs dị ihe dị ka otu narị na iri abụọ mmụọ nsọ ya n’ebe ha zukọtara na Jeruselem. Ha ghọrọ “mba” ọhụrụ, nke a kpọrọ “Izrel nke Chineke.” N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ puku ndị si ná mba ndị ọzọ so ha bụrụ Izrel nke Chineke.—Gal. 6:16.
16 Izrel ọhụrụ ahụ emeghị ka mba Izrel, bụ́ ndị nupụụrụ Chineke isi. Mba ọhụrụ ahụ nọgidere na-erubere ya isi. Otu n’ime iwu ndị niile so ná mba ọhụrụ ahụ na-erubere isi gbasara ịṅụ iyi. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ndị mmadụ na-eji ịṅụ iyi egwuri egwu. Ha na-aṅụ iyi ụgha ma ọ bụ na-aṅụ iyi banyere ihe na-enweghị ihe ọ bụ. (Mat. 23:16-22) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Aṅụla iyi ma ọlị . . . Naanị ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, ka Ee e unu kwuru bụrụ Ee e; n’ihi na ihe karịrị ihe ndị a si n’aka ajọ onye ahụ.”—Mat. 5:34, 37.
17. Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu ọzọ anyị ga-amụ?
17 Ọ̀ pụtara na ịṅụ iyi dị njọ mgbe niile? Ajụjụ ka mkpa bụ, gịnị ka ime ka Ee anyị kwuru bụrụ Ee pụtara? A ga-aza ajụjụ abụọ a n’isiokwu na-esonụ. Ka anyị na-atụgharị uche n’Okwu Chineke, anyị kwesịrị ikwe ka o mee ka anyị na-erubere Jehova isi mgbe niile. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-agọzi anyị ruo mgbe ebighị ebi, dị ka o kwere ná nkwa, ṅụọkwa iyi na ya ga-eme.
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 26]
Nkwa niile Jehova kwere na-emezu
[Foto dị na peeji nke 24]
N’oge na-adịghị anya, Ebreham ga-ahụ ka nkwa Jehova mezuru