Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-ezisa Ozi Ọma nke Ọma

Na-ezisa Ozi Ọma nke Ọma

“Rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma, jezuo ozi gị.”—2 TIM. 4:5.

1. Gịnị mere anyị ga-eji sị na Jehova bụ onye mbụ ziri ozi ọma nakwa na ọ bụ ya kacha ezi ozi ọma?

JEHOVA CHINEKE bụ onye mbụ ziri ozi ọma, ọ bụkwa ya kacha ezi ozi ọma. Ozugbo Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi, Jehova ziri ozi ọma na ya ga-ebibi Setan bụ́ Ekwensu. (Jen. 3:15) Kemgbe ọtụtụ narị afọ, Jehova kwuru otú ọ ga-esi mee ka a kwụsị ịkọcha aha ya. O kwukwara otú ọ ga-esi mee ka nsogbu niile Setan kpatara bie, nakwa otú ụmụ mmadụ nwere ike isi dị ndụ ebighị ebi. Ihe a niile o kwuru bụ ozi ọma dị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl.

2. (a) Olee otú o si bụrụ na ndị mmụọ ozi na-ezi ozi ọma? (b) Olee otú Jizọs si bụrụ onye e kwesịrị iṅomi n’ihe gbasara ikwusa ozi ọma?

2 Ndị mmụọ ozi na-ezikwa ozi ọma. Ha na-enyekwara ụmụ mmadụ ndị na-ezi ozi ọma aka. (Luk 1:19; 2:10; Ọrụ 8:26, 27, 35; Mkpu. 14:6) Oleekwanụ maka Jizọs, ya bụ, Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi? Mgbe ọ nọ n’ụwa, o gosiri ụmụ mmadụ otú e kwesịrị isi na-ekwusa ozi ọma. Ihe o ji ndụ ya mee bụ ikwusa ozi ọma!—Luk 4:16-21.

3. (a) Gịnị bụ ozi ọma anyị na-ekwusa? (b) Olee ajụjụ ndị gbasara ozi ọma bụ́ ndị anyị kwesịrị ịchọ ịma azịza ha?

3 Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-ekwusa ozi ọma. (Mat. 28:19, 20; Ọrụ 1:8) Pọl onyeozi gwara Timoti, bụ́ onye ya na ya jekọrọ ozi, sị: “Rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma, jezuo ozi gị.” (2 Tim. 4:5) Olee ozi ọma anyị na-ekwusa? Anyị na-agwa ndị mmadụ na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, hụrụ anyị n’anya. (Jọn 3:16; 1 Pita 5:7) Nkwa Jehova kwere na anyị ga-eketa Alaeze ya bụ otu ihe gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. N’ihi ya, anyị ji obi ụtọ na-agwa ndị ọzọ na ọ bụrụ na ha ana-erubere Chineke isi, na-akpakwa àgwà dị mma, ha ga-abụ ndị enyi Chineke. (Ọma 15:1, 2) Jehova ga-eme ka ahụhụ niile anyị na-ata kwụsị. Ọ ga-emekwa ka ahụhụ ndị anyị tara n’oge gara aga gharazie ịna-ewute anyị. Ihe ndị a niile bụ ozi ọma. (Aịza. 65:17) Ebe ọ bụ na anyị na-ekwusa ozi ọma, ka anyị leba anya n’ajụjụ abụọ ndị a dị mkpa: Olee ihe mere o ji dị oké mkpa ka ndị  mmadụ nụ ozi ọma taa? Oleekwa otú anyị nwere ike isi zie mmadụ ozi ọma ya eruo onye ahụ n’obi?

GỊNỊ MERE O JI DỊ MKPA KA NDỊ MMADỤ NỤ OZI ỌMA?

Ajụjụ ndị na-eme ka mmadụ chee echiche na-enyere ndị mmadụ aka ịma ihe mere ha ji kwere n’ihe ha kweere

4. Olee ebubo ndị mmadụ na-ebo Chineke?

4 Weregodị ya na mmadụ bịara ghaara gị ụgha, sị gị na papa gị hapụrụ gị na ndị ezinụlọ unu. Onye ahụ kwukwara na papa gị achọghị ịma gbasara gị, na o nwere ihe ọ na-ezochiri gị, nakwa na obi fere ya azụ. Ọ gwakwara gị na papa gị anwụọla, na ọ dịghịzi mkpa ka ị chọwa ebe ọ nọ. Ụfọdụ ekwuola ụdị ihe ndị a banyere Chineke. Ha ekwuola na Chineke dị omimi nakwa na obi fere ya azụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị isi okpukpe ekwuola na Chineke ga-ata ndị ajọ omume ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ruo mgbe ebighị ebi. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ Chineke na-akpata ọdachi ndị na-eme ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. N’agbanyeghị na ọdachi ndị a na-egbu ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume, ha na-asị na ọ bụ otú Chineke si akwụ ndị mmadụ ụgwọ ihe ha metara.

Ajụjụ ndị na-eme ka mmadụ chee echiche na-eme ka eziokwu ruo ha n’obi, meekwa ka ha nabata ya

5, 6. Olee nsogbu nkụzi ụgha na-akpatara ndị mmadụ?

5 Ndị ọzọ na-ekwu na Chineke adịghịdị adị nakwa na anyị si n’anụmanụ pụta. Ndị kweere na mmadụ si n’anụmanụ na-ekwu na ihe ndị dị ndụ nọkatara pụta, na e nweghị onye kere ha. Ụfọdụ na-ekwudị na ihe mere ụmụ mmadụ ji eme ihe ike ma ọ bụ na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru bụ n’ihi na ha si n’anụmanụ pụta. Ha na-ekwu na ọ dị ndị siri ike n’ọbara ịna-emegbu ndị na-esighị ike. Ọ bụ ihe mere na o kwesịghị iju anyị anya na ọtụtụ ndị kweere na mmegbu agaghị ala ala. N’ihi ya, ndị kweere na mmadụ si n’anụmanụ pụta enweghị olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.

6 Ihe so eme ka nsogbu ụmụ mmadụ ka njọ n’oge ikpeazụ a bụ na ihe ndị isi chọọchị na-akụziri ha abụghị eziokwu. Ihe ọzọkwa bụ na ụfọdụ ekweghị na Chineke. (Rom 1:28-31; 2 Tim. 3:1-5) Ihe ndị a ụmụ mmadụ na-akụzi abụghị ozi ọma. Kama, dị ka Pọl onyeozi kwuru, ihe ndị ahụ ha na-akụzi emeela ka ndị mmadụ nọrọ “n’ọchịchịrị n’uche, bụrụkwa ndị e kewapụrụ ná ndụ nke si n’aka Chineke.” (Efe. 4:17-19) Ozizi ụgha ndị ahụ emeekwala ka ndị mmadụ ghara ịna-ege ozi ọma si n’aka Chineke.—Gụọ Ndị Efesọs 2:11-13.

Ajụjụ ndị na-eme ka mmadụ chee echiche na-eme ka ha chebara ihe Baịbụl kwuru echiche ka ha nwee ike iji aka ha kpebie na ọ bụ eziokwu

7, 8. Gịnị bụ otu ihe ndị mmadụ nwere ike ime iji mụta eziokwu banyere Chineke na nzube ya?

7 Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ na Jehova ga-adị ná mma, ha kwesịrị ibu ụzọ kweta na Jehova dị adị nakwa na e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ịmata ya. Ihe anyị nwere ike ime iji nyere ha aka ịmụta banyere Chineke bụ ịgwa ha ka ha na-echebara ihe ndị Chineke kere echiche. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ewetuo obi chebara ihe Chineke kere echiche, ha ga-amụta banyere amamihe Chineke nwere na ike ya. (Rom 1:19, 20) Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị mmadụ aka ịghọta na ihe niile Chineke kere dị ebube? Anyị nwere ike iji akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? na Bịaruo Jehova nso nyere ha aka. Ma, e nwere ajụjụ ndị anyị na-agaghị amata azịza ha ma ọ bụrụ naanị ihe ndị e kere eke ka anyị na-amụ. Ụfọdụ ajụjụ ndị ahụ bụ: Gịnị mere Chineke ji kwe ka anyị na-ata ahụhụ? Gịnị mere Chineke ji kee ụwa? Ihe gbasara m ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi?

8 Naanị otu ihe ndị mmadụ nwere ike ime iji mata eziokwu banyere Chineke na nzube ya bụ ịmụ Baịbụl. Inyere ndị mmadụ aka ka ha mata azịza nke ajụjụ ndị na-enye ha nsogbu n’obi bụ ihe ùgwù Chineke nyere anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ inyere ndị mmadụ aka ka ha kweta na Chineke dị ma bụrụ enyi ya, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịgwa ha ihe Baịbụl kwuru. Anyị ga-eme ka ha kwere ihe Baịbụl kwuru, ya bụ, nyere ha aka ịghọta ihe mere ha ga-eji kwere ihe dị na Baịbụl. (2 Tim. 3:14) Ihe ga-enyere anyị aka ime otú ahụ bụ iṅomi Jizọs. Olee otú Jizọs si  mee ka ndị mmadụ kwere ihe ọ na-akụzi? Otu ihe o mere bụ ịjụ ha ajụjụ. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie ya?

AJỤJỤ NDỊ NA-EME KA MMADỤ CHEE ECHICHE NA-EME KA OZI ỌMA RUO NDỊ MMADỤ N’OBI

9. Ọ bụrụ na anyị ga-enyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu, gịnị ka anyị kwesịrị ime?

9 Olee ihe mere anyị ga-eji na-ajụ ndị anyị na-ezi ozi ọma ajụjụ otú ahụ Jizọs mere? Weregodị ya na ị gara ụlọ ọgwụ, dọkịta agwa gị na ọ bụrụ na ya awaa gị ahụ́, ọrịa gị ga-ala. I nwere ike ikwere ihe o kwuru. Ma, ọ bụrụ na o bu ụzọ gwa gị na ya ga-awa gị ahụ́ tupu ya ajụọ gị ihe na-arịa gị, ị̀ ga-ekwere ihe o kwuru? O nwere ike ị gaghị ekwe ka ọ waa gị ahụ́. Dọkịta ọ bụla kwesịrị ịjụ onye ọrịa ajụjụ ma gee ya ntị nke ọma tupu ya enwee ike ịma otú ọ ga-esi agwọ onye ahụ, ọ sọgodị ya ya bụrụ dọkịta bụ́ aka ochie. Ọ bụrụkwa na anyịnwa chọrọ inyere ndị mmadụ aka ikweta ihe dị na Baịbụl, anyị kwesịrị ịma otú e si ajụ ajụjụ ga-eme ka mmadụ chee echiche. Ọ bụ mgbe anyị ghọtara ndị mmadụ nke ọma ka anyị ga-enwe ike inyere ha aka.

Iji mee ka ihe anyị na-ekwu ruo ndị mmadụ n’obi, anyị kwesịrị ime ka ha ghọta ihe mere ha ga-eji kweta ihe Baịbụl kwuru

10, 11. Ọ bụrụ na anyị na-ajụ ndị anyị na-ezi ozi ọma ajụjụ otú ahụ Jizọs mere, olee uru ọ ga-abara anyị?

10 Jizọs ma na onye nkụzi nwere ike iji ajụjụ mata ihe dị onye ọ na-akụziri ihe n’obi, jirikwa ya mee ka onye ahụ ọ na-akụziri ihe tinye ọnụ n’ihe a na-ekwu. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs chọrọ ịkụziri ndị na-eso ụzo ya otú ha ga-esi dị umeala n’obi, o bu ụzọ jụọ ha ajụjụ ga-eme ka ha chee echiche. (Mak 9:33) E nwere mgbe Jizọs jụrụ Pita ajụjụ, kwuo ihe abụọ nwere ike ịbụ azịza ya, ma gwazie Pita ka ọ họrọ nke kwesịrị ịbụ azịza ajụjụ ahụ. Ihe ahụ Jizọs mere nyeere Pita aka ịmụta ihe. (Mat. 17:24-26) N’oge ọzọ, mgbe Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya gwa ya ihe dị ha n’obi, ọ jụrụ ha ajụjụ ole na ole ga-eme ka ha kwuo ihe ha chere. (Gụọ Matiu 16:13-17.) Jizọs agwaghị ndị mmadụ naanị ihe ha ga-eme. Ọ jụrụ ha ajụjụ, kwuokwa ihe ruru ha n’obi nke mere ka ha kweta ihe ọ kụziiri ha ma gbanwee ndụ ha.

11 Ọ bụrụ na anyị na-ajụ ndị anyị na-ezi ozi ọma ajụjụ otú ahụ Jizọs mere, anyị ga-amata ụzọ kacha mma anyị ga-esi ruo ha n’obi. Anyị ga-amata ihe anyị ga-agwa ndị na-achọghị ige anyị ntị. Anyị ga-akụzikwara ndị chọrọ ịmụta ihe ihe ga-abara ha uru. Ka anyị tụlee ihe atụ atọ gbasara otú anyị nwere ike isi jiri ajụjụ nyere ndị mmadụ aka.

12-14. Olee otú i nwere ike isi nyere nwa gị aka ịkata obi na-ekwusa ozi ọma? Nye ihe atụ.

12 Ihe atụ nke mbụ: Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nwa gị alọta akwụkwọ gwa gị na ụmụ akwụkwọ ibe ya nọ na-ekwu na a na-ata ndị mmehie ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ, ma, ya amaghị otú ya ga-esi gwa ha ihe Baịbụl kwuru banyere ndị nwụrụ anwụ, olee otú i nwere ike isi nyere ya aka? Kama ịbawara ya mba ma ọ bụ gwawa ya ozugbo ihe ọ ga-ekwu, ọ ga-adị mma ka i mee ka Jizọs, jụọ ya ajụjụ ole na ole ga-eme ka o kwuo otú o nwere ike isi gwa ha ihe Baịbụl kwuru. Olee otú ị ga-esi eme ya?

13 Dị ka ihe atụ, gị na nwa gị nwere ike ịgụ paragraf ole na ole n’isi nke isii n’akwụkwọ Bible Na-akụzi. I nweziri ike ịjụ ya ihe ọ gụtara n’isiokwu ahụ nke mere  ka obi sie ya ike na a naghị ata ndị nwụrụ anwụ ahụhụ n’ọkụ mmụọ. Gwa ya ka o kwuo ihe mere o ji kweta na ihe Baịbụl kwuru banyere ndị nwụrụ anwụ bụ eziokwu. (Rom 12:2) Gwakwa ya na ihe mere o ji kweta ihe Baịbụl kwuru nwere ike ịdị iche n’ihe mere gịnwa ji kweta ihe Baịbụl kwuru.

14 Gwa nwa gị na o nwere ike isi otú ahụ i si kọwaara ya ihe ahụ kọwaakwara ya ụmụ akwụkwọ ibe ya. I nwere ike ịgwa nwa gị ka ọ kọwaara gị ihe ahụ otú ọ ga-esi akọwara ya ụmụ akwụkwọ ha. Nwa gị nwere ike imere ha ihe atụ ma jụọ ha ajụjụ iji mata ihe ha chere. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịgụ ihe dị na paragraf nke iri na asaa n’isi nke isii n’akwụkwọ Bible Na-akụzi. Ya gụchaa, o nwere ike ịjụ ha, sị: “È nwere nna ga-etinye aka nwa ya n’ọkụ n’ihi na o nupụụrụ ya isi?” Ụmụ akwụkwọ ha zachaa ya, o nwere ike ịjụ ha, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ agaghị esi otú ahụ taa nwa ya ahụhụ, olee otú Chineke, bụ́ onye kere mmadụ, ga-esi na-ata ụmụ mmadụ ahụhụ n’ọkụ mmụọ ruo mgbe ebighị ebi?” Gị na nwa gị nwere ike ịmụgharị ihe a ugboro ugboro ka o nwee ike ịkata obi gwa ụmụ akwụkwọ ha ihe Baịbụl na-akụzi. Ọ bụrụ na ị kụziere nwa gị otú e si eji ajụjụ enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi, ọ ga-eme ka ọ mara otú e si ekwusa ozi ọma.

15. Olee otú anyị nwere ike isi jiri ajụjụ nyere onye na-ekweghị na Chineke aka?

15 Ihe atụ nke abụọ: Anyị nọrọ n’ozi ọma, anyị nwere ike ịhụ onye ọ na-eme obi abụọ ma Chineke ọ̀ dịkwa ma ọ bụ onye na-ekweghịdị na Chineke dị. Anyị hụ ụdị onye ahụ, anyị nwere ike ịgbalị izi ya ozi ọma. Anyị nwere ike iwetu obi jụọ onye ahụ mgbe ọ malitere iche otú ahụ na ihe mere o ji kpebie na Chineke adịghị. Onye ahụ zachaa ajụjụ ahụ, anyị nwere ike ịgwa ya na ọ gbalịala n’otú o si chebara ihe o kweere echiche. Anyị nweziri ike ịjụ ya ma ọ̀ ga-achọ ịgụ akwụkwọ kwuru ihe ndị  gosiri na Chineke dị. Ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu, o nwere ike ikweta ịgụ akwụkwọ kwuru ụdị ihe ahụ. Ya kweta ịgụ ya, anyị nwere ike inye ya akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na anyị ewetuo obi jụọ onye anyị na-ezi ozi ọma ajụjụ ndị ga-eme ka o chee echiche, ihe anyị ga-agwa ya nwere ike iru ya n’obi.

16. Gịnị mere anyị ga-eji hụ na onye anyị na-amụrụ ihe anaghị agụpụta ihe ọ na-aza agụpụta?

16 Ihe atụ nke atọ: Mgbe anyị na-amụrụ mmadụ ihe, o nwere ike ịbụ na anyị na-ahapụ onye ahụ ka o si n’akwụkwọ anyị na-amụ na-agụpụta azịza ya. Ma, ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị anaghị enyere onye ahụ aka. Maka gịnị? Maka na ọ bụrụ na onye anyị na-amụrụ Baịbụl na-agụpụta azịza ya n’echebaraghị ya echiche, ọ ga-adị ka osisi mgbọrọgwụ ya na-esighị ike. O nwere ike ịda mbà ma a malite ịkpagbu ya. (Mat. 13:20, 21) Iji nyere onye anyị na-amụrụ ihe aka, anyị kwesịrị ịjụ ya ihe o chere banyere ihe ndị ọ na-amụta. Chọpụta ma ò kwetara ihe Baịbụl kwuru. Jụọkwa ya ihe mere o ji kweta ma ọ bụ ihe mere o ji ghara ikweta. Nyeziere ya aka ichebara ihe Baịbụl kwuru echiche ka o nwee ike iji aka ya kpebie na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. (Hib. 5:14) Ọ bụrụ na anyị na-ajụ ndị anyị na-amụrụ ihe ajụjụ ndị ga-eme ka ha chee echiche, o nwere ike ime ka okwukwe ha sie ike, ha agharakwa ịda mbà mgbe a malitere ịkpagbu ha ma ọ bụ chọọ iduhie ha. (Kọl. 2:6-8) Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ime ka anyị nwee ike ịna-ezi ozi ọma ya eruo ndị mmadụ n’obi?

NDỊ NA-EKWUSA OZI ỌMA NA-ENYERE IBE HA AKA

17, 18. Gị na onye nkwusa ọzọ gaa ozi ọma, olee ihe ị ga-eme iji nyere ya aka mgbe ọ na-ezi mmadụ ozi ọma?

17 Jizọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya abụọ abụọ ka ha gaa kwusaa ozi ọma. (Mak 6:7; Luk 10:1) Pọl onyeozi mechakwara kwuo banyere “ndị ọrụ ibe” ya, ‘bụ́ ndị ya na ha gbakọrọ mbọ ọnụ n’ozi ọma.’ (Fil. 4:3) N’afọ 1953, nzukọ Jehova malitere ịhazi otú onye nkwusa ọ bụla nwere ike isi na-akụziri onye nkwusa ibe ya ihe n’ozi ụlọ n’ụlọ.

18 Ọ bụrụ na gị na onye nkwusa ọzọ agaa ozi ọma, olee ihe ị ga-eme iji nyere ya aka mgbe ọ na-ezi mmadụ ozi ọma? (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 3:6-9.) Ọ kpọọ Baịbụl a ga-agụ, sapeta ebe ahụ ma na-ele anya ka a na-agụ ya. Na-ele onye ọ bụla na-ekwu okwu anya, ma ọ̀ bụ onye gị na ya so ma ọ̀ bụkwanụ onye ọ na-ezi ozi ọma. Na-ege ntị n’ihe a na-ekwu ka i nwee ike itinye ọnụ mgbe ọ bụla onye gị na ya so chọrọ ka ị kọwakwuoro onye ọ na-ezi ozi ọma ihe Baịbụl kwuru. (Ekli. 4:12) Ma, kpachara anya ka ị ghara ịnapụ onye ọ bụla n’ime ha okwu n’ọnụ. Ọ bụrụ na ị napụ ha okwu n’ọnụ, i nwere ike ịkpasu onye gị na ya so iwe ma ọ bụ megharịa onye ọ na-ezi ozi ọma anya. Ọ dịghị njọ ikwu ihe ole na ole mgbe onye gị na ya so chọrọ ka i tinye ọnụ, ma i kwesịrị ịhapụ ya ka o kwuru gawa.

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-echeta? Oleekwa ihe mere anyị ga-eji na-echeta ya?

19 Mgbe gị na onye nkwusa ọzọ na-aga ozi ọma, olee otú unu ga-esi na-enyere ibe unu aka tupu unu eruo n’ụlọ mmadụ? Jirinụ oge ahụ kwuo otú ka mma unu nwere ike isi zie ozi ọma. Kpachara anya ka ihe ị na-ekwu banyere ndị bi n’ókèala unu ghara ịbụ ihe ga-eme ka ike izi ha ozi ọma gwụ unu. Anọkwala na-ekwu banyere ihe ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-anaghị emeta. (Ilu 18:24) Anyị kwesịrị ịna-echeta na anyị niile ezughị okè. Ikwusara ndị ọzọ ozi ọma bụ onyinye pụrụ iche Jehova ji obiọma ya nye anyị. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:1, 7.) N’ihi ya, ka onye ọ bụla n’ime anyị na-agbalịsi ike ekwusa ozi ọma otú ọ ga-eru ndị mmadụ n’obi, si otú ahụ gosi na anyị ji onyinye a Chineke nyere anyị kpọrọ ihe.