Nyere Nwa Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Ọ Hụrụ n’Anya
Nyere Nwa Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Ọ Hụrụ n’Anya
OTU nne ji iwe bata n’otu ebe na-ekwo ekwo a na-ere akwụkwọ wee gwa onye na-ere ihe n’ebe ahụ, sị: “Unu nwejuru akwụkwọ n’ebe a, ma unu enweghị nke ga-enyere nwa m aka!” Nne nwatakịrị ahụ nọ na-achọ akwụkwọ ga-enyere nwa ya aka idi ọnwụ nke onye ezinụlọ ha nwụrụ na mberede.
Ụta adịghịrị nwaanyị ahụ. Obi na-agbawa ụmụntakịrị mgbe ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ. Ụmụaka na-eme nke ọma n’ezinụlọ ebe a na-elekọta ha anya, ma, ọnwụ nwere ike igbu otu n’ime ndị ezinụlọ ha, bụ́ onye ha na ha dị n’ezigbo mma. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, olee otú ị ga-esi nyere nwa gị aka ma ọ bụrụ na onye ọ hụrụ n’anya na-aga ịnwụ ma ọ bụkwanụ na ọ nwụọla?
N’ezie, ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’anya nwụrụ, idi ọnwụ ya nwere ike isiri gị ike; o nwere ike na-ewute gị nke ukwuu, na-enye gị nsogbu n’obi. Ma, echefula na enyemaka gị dị nwa gị mkpa. Otu akwụkwọ nke ụlọ ọgwụ a na-elekọta ndị ọrịa ha na-anaghị ala ala, nke dị na Minnesota, U.S.A., kesara, kwuru, sị: “Mgbe ndị ọzọ na-akparịta ụka, ụmụaka na-anụpere ihe ha na-ekwu, ọtụtụ mgbe, ha anaghị aghọta ihe ha nụrụ, ọ naghị edochakwa ha anya.” O kwukwara, sị: “E kwesịrị ịgwa ụmụaka nke bụ́ eziokwu.” Ya mere, ọ ga-adị mma ka ị gwa ụmụ gị ihe merenụ otú ọ ga-ekwe ha nghọta. Nke a siri ike, n’ihi na otú ụmụntakịrị si aghọta ihe na-emenụ dị nnọọ iche.—1 Ndị Kọrịnt 13:11.
Otú A Ga-esi Gwa Nwata na Mmadụ Nwụrụ
Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta na-ekwu na mgbe ndị nne na nna na-agwa ụmụ ha na mmadụ nwụrụ, ha ekwesịghị ikwu na onye ahụ “arahụla,” na ọ “laala,” ma ọ bụ na ọ “gaala ebe ọzọ.” Ịgwa ụmụaka ụdị okwu ahụ n’emeghị ka ha mara ihe i bu n’obi nwere ike ime ka ha ghọtahie ihe ị na-ekwu. N’ezie, Jizọs ji ụra maa atụ ọnwụ, ndị ọ gwara ya ghọtakwara ihe o bu n’obi. Ma, cheta na ọ bụghị ụmụaka ka ọ gwara okwu ahụ. Ọ kọwakwara ihe atụ ahụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra.” Ọ bụ ezie na ndị na-eso ụzọ Jizọs abụghị ụmụaka, ha “chere na ọ na-ekwu banyere ụra efu.” Ya mere, Jizọs mere ka ha ghọta ihe o bu n’obi, wee sị: Jọn 11:11-14) Ọ bụrụ na ụdị nkọwa ahụ dị ndị okenye mkpa, ọ dị ụmụaka mkpa karị.
“Lazarọs anwụwo.” (Ndị na-ede akwụkwọ bụ́ Mary Ann Emswiler na James P. Emswiler kwuru, sị: “Nne ma ọ bụ nna nwere ike ite okwu ya mmanụ mgbe ọ na-agwa nwa ya na mmadụ nwụrụ, ma ime otú ahụ nwere ike ime ka nwatakịrị ahụ ghọta ihe na-adịbughị ya n’obi nke nwere ike ịtụwa ya ụjọ ma ọ bụ nyewe ya nsogbu.” Dị ka ihe atụ, ịgwa nwatakịrị na onye ọ hụrụ n’anya nke nwụrụ anwụ na-arahụ ụra nwere ike ime ka nwatakịrị ahụ tụwa ụjọ na ọ bụrụ na ya alaba n’abalị na ya agaghị eteta ọzọ. Ọ bụrụ na ị gwa nwatakịrị na onye ọ hụrụ n’anya nke nwụrụ anwụ “agaala ebe ọzọ,” o nwere ike iche na ọ jụrụ ya ajụ ma ọ bụ na ọ gbahapụrụ ya agbahapụ.
Ọtụtụ ndị nne na nna achọpụtala na ụmụaka na-aghọta okwu a kapịrị ọnụ nke na-adịghị mgbagwoju anya mgbe a na-agwa ha na mmadụ nwụrụ karịa ịmara ha atụ ma ọ bụ itere ha okwu mmanụ. (1 Ndị Kọrịnt 14:9) Ndị na-eme nchọpụta na-atụ aro na ọ dị mma ka ị gbaa nwa gị ume ka ọ jụọ gị ajụjụ, kwuokwa ihe na-enye ya nsogbu n’obi. Gị na nwa gị ịkparịta ụka mgbe mgbe ga-enyere gị aka ime ka ọ ghọta ihe ndị na-edochaghị ya anya, meekwa ka ị chọpụta ụzọ ndị ọzọ ị ga-esi nyere ya aka.
Nduzi E Kwesịrị Ịtụkwasị Obi
N’oge unu na-eru uju, nwa gị ga-achọ ka i duzie ya, ka i nyere ya aka, ma zaa ya ajụjụ ndị o nwere. Olee ebe ị ga-esi nweta ihe bụ́ eziokwu ị ga-agwa ya banyere ọnwụ? Ọtụtụ ndị achọpụtala na Baịbụl na-akasi ndị mmadụ obi, na-emekwa ka ha nwee ezigbo olileanya. O kwuru ihe bụ́ eziokwu banyere otú ọnwụ si malite, ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, nakwa olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ. Eziokwu bụ́ na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị” kwesịrị inyere nwa gị aka ịghọta na onye ọ hụrụ n’anya nke nwụrụ anwụ anaghị ata ahụhụ ọ bụla. (Ekliziastis 9:5) Chineke kwekwara anyị nkwa na Baịbụl na anyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ na paradaịs nke ga-adị n’ụwa.—Jọn 5:28, 29.
Site n’ịgụ Akwụkwọ Nsọ, i nwere ike inyere nwa gị aka ka ọ mara na Baịbụl na-enye nduzi e kwesịrị ịtụkwasị obi, nakwa na ọ na-akasi anyị obi ná nsogbu anyị niile. Nwa gị ga-ahụkwa na Okwu Chineke na-eduzi gị n’ihe ndị dị mkpa ná ndụ.—Ilu 22:6; 2 Timoti 3:15.
Azịza nke Ajụjụ Ndị I Nwere Ike Ịjụ
Mgbe ị na-enyere nwa gị aka ka o die ọnwụ onye ọ hụrụ n’anya, o nwere ihe ụfọdụ nwere ike isiri gị ike. Gịnị ka i nwere ike ime? * Ka anyị tụlee ajụjụ ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụkarị bụ́ ndị i nwere ike ịjụ.
• M̀ kwesịrị izochiri nwa m uju m na-eru? Ịchọ ichebe ụmụ anyị dị anyị n’ọbara. Ma, ọ̀ dị njọ ma nwa gị mara na ị na-eru uju? Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ achọpụtala na ọ kacha mma ime ka ụmụ ha mara na ha na-eru uju, ha na-esi otú a egosi ụmụ ha na mmadụ iru uju adịghị njọ. Ụfọdụ na-akọrọ ụmụ ha banyere ụmụ mmadụ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl bụ́ ndị kwara ákwá n’ihu ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwara ákwá mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ. Jizọs ezoghị otú obi dị ya ezo.—Jọn 11:35.
• Obere nwa m ò kwesịrị ịnọ n’ebe a ga-eli ozu ma ọ bụ ịga n’ebe a ga-ekwu okwu olili ozu? Ọ bụrụ na nwatakịrị ga-aga ebe ahụ, ọ ga-adị mma ka e buru ụzọ gwa ya ihe ndị ga-eme n’ebe ahụ, na ihe mere a ga-eji kwuo okwu olili ozu ahụ. Ndị mụrụ ụmụ nwere ike ikpebi, n’ihi ihe ụfọdụ, na ọ ga-adị mma ka ụmụ ha ghara ịga olili ozu ma ọ bụ ịnọ ruo mgbe e lichara ozu. Ụmụaka ndị bịara n’ebe Ndịàmà Ndị Rom 12:10, 15; Jọn 13:34, 35.
Jehova na-ekwu okwu olili ozu na-erite uru n’okwu sitere na Baịbụl a na-ekwu. “Obi ọmịiko” na ịhụnanya ndị bịara ebe ahụ na-egosi ibe ha nwere ike ịgụgụ ma ụmụaka ma ndị ọzọ mmadụ nwụnahụrụ obi nke ukwuu.—• M̀ kwesịrị ịgwa nwa m banyere onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ? Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta na-ekwu na ọ bụrụ na ị chọghị ikwu ihe ọ bụla banyere onye ahụ nwụrụ anwụ, nwa gị nwere ike iche na ọ dị ihe ị na-ezo ezo banyere ya ma ọ bụ na ị chọrọ ka e chezọọ onye ahụ kpamkpam. Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Julia Rathkey kwuru, sị: “Ọ dị mkpa ka e nyere ụmụaka aka ịmara ihe ha ga-eme mgbe ọ bụla ha chetara onye ahụ nwụrụ anwụ, ọ bụghị ịtụ ụjọ.” Ikwu okwu mgbe mgbe banyere onye ahụ nwụrụ anwụ, tinyere àgwà ọma ya na ihe ndị dị mma o mere ná ndụ, nwere ike inye aka mgbe a na-eru uju ọnwụ ya. Ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà na-eji olileanya dị na Baịbụl akasi ụmụ ha obi, ya bụ, olileanya ibilite n’ọnwụ banye na paradaịs ga-adị n’ụwa, ebe ọrịa na ọnwụ na-agaghịkwa adị ọzọ.—Mkpughe 21: 4.
• Olee otú m ga-esi nyere nwa m aka mgbe ọ na-eru uju? Nwa gị nwere ike malite ịrịa ọrịa mgbe ọ na-eru uju. O nwere ike na-ewe iwe ma ọ bụ na-enwe nchegbu n’ihi na ọ maghị ihe ọ ga-eme eme. Ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na obi nwa gị na-ama ya ikpe, ma ọ bụrụ na ọ na-arakụrụ gị n’ahụ́, ma ọ bụ na-atụ ụjọ ma ọ bụrụ na ị lọtaghị ebe ị gara ngwa ngwa ma ọ bụ mgbe ahụ́ na-adịghị gị. Olee ihe ị ga-eme maka nsogbu a nwa gị nwere? Ekwela ka nwa gị chewe na ị maghị na e nwere ihe na-enye ya nsogbu. Ya mere, ka anya ruo gị ala, lebakwara ya anya. Gbalịa ka ị ghara iche na ọnwụ onye nwa gị hụrụ n’anya eruchaghị ya n’ahụ́. Na-emesi ya obi ike mgbe niile, gbaa ya ume ka ọ na-ajụ gị ajụjụ nakwa ka ọ na-agwa gị ihe dị ya n’obi. I nwere ike iji okwu “nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ” mee ka olileanya gị na nwa gị sikwuo ike.—Ndị Rom 15:4.
• Olee mgbe anyị ga-amaliteghachi ime ihe dị iche iche ezinụlọ anyị na-eme? Ndị ọkachamara na-ekwu na i kwesịrị ịnọgide na-eme ọtụtụ n’ime ha kwere gị omume. Mmadụ ime ihe ndị kwesịrị ekwesị ọ na-emebu bụ ụzọ dị mma ọ ga-esi die ihe mwute mere ya. Ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ Ndịàmà Jehova achọpụtala na ime ihe ndị metụtara ofufe Chineke, ndị dị ka ezinụlọ ịmụchi Baịbụl anya na ịgachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya, nwere ike ime ka ezinụlọ ha nweta onwe ha ma sie ike ọzọ.—Diuterọnọmi 6:4-9; Ndị Hibru 10:24, 25.
Site n’oge ruo n’oge, ọnwụ ka ga na-enye ụmụaka nsogbu n’ahụ́ ruo mgbe Jehova bụ́ Chineke ga-ewepụ ọrịa na ọnwụ. (Aịzaya 25:8) Ma, ọ bụrụ na e mesie ụmụaka obi ike ma nyere ha aka nke ọma, ha ga-enwe ike idi ọnwụ nke onye ha hụrụ n’anya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 13 Ihe e dere n’isiokwu a abụghị iwu. Ọ dị mma ịmara na ọnọdụ na omenala ndị mmadụ nwere ike ịdị iche na nke ndị ọzọ.
[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo dị na peeji nke 19]
Gbaa nwa gị ume ka ọ jụọ gị ajụjụ, kwuokwa ihe na-enye ya nsogbu n’obi
[Foto dị na peeji nke 20]
Maliteghachi ihe dị iche iche unu na-eme, tinyere ọmụmụ Baịbụl ezinụlọ unu