Ụwa Ọ̀ Ga-ala n’Iyi?
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ
Ụwa Ọ̀ Ga-ala n’Iyi?
O nweghị ọdachi ọ bụla ga-eme ka Ụwa anyị a bibie. Gịnị mere anyị ga-eji jide n’aka na nke a bụ eziokwu? Ọ bụ n’ihi na Chineke kwere nkwa na ụwa ‘agaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 104:5) Ọ bụ ezie na “otu ọgbọ na-ala, ọgbọ ọzọ na-abịakwa,” dị ka Baịbụl kwuru, “ma ụwa na-adịru ọbụna mgbe ebighị ebi.”—Ekliziastis 1:4.
Okwu Hibru abụọ dị n’Abụ Ọma 104:5 n’oge e dere ya, bụ́ ʽoh·lamʹ, nke a sụgharịrị “mgbe ebighị ebi,” na ʽadh, nke a sụgharịrị “mgbe niile ebighị ebi,” na-egosi nke ọma na ụwa ga-adịgide. E nwere ike ịsụgharị ʽoh·lamʹ “ọtụtụ afọ” ma ọ bụ “mgbe na-enweghị ọgwụgwụ.” Dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Students’ Hebrew and Chaldee Dictionary, nke Harkavy dere, si kwuo, ʽadh pụtara “oge ihe were, mgbe niile ebighị ebi, mgbe niile, mgbe ebighị ebi.” Okwu Hibru abụọ a na-egosi na o nweghị ihe ga-eme ka ụwa ghara ịdịgide adịgide. Tụlee ihe atọ ọzọ Baịbụl kwuru mere anyị ga-eji kwere na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi.
Nke mbụ bụ na Chineke kere ụwa ka ụmụ mmadụ biri n’ime ya—ka ọ bụrụ paradaịs zuru ụwa dum nke mara mma ma dị ụtọ obibi, ọ bụghị ala tọgbọ n’efu. Aịzaya 45:18 kwuru na Jehova bụ: “Onye kere eluigwe, Onye bụ́ ezi Chineke, Onye kpụrụ ụwa na Onye kere ya, Onye mere ka o guzosie ike, onye na-ekeghị ya n’efu, onye kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.”
Nke abụọ bụ na Chineke kwere nkwa kemgbe na ụmụ mmadụ ndị rubeere ya isi ga-ebi n’ụwa a n’udo ruo mgbe ebighị ebi. Maịka 4:4 kwere nkwa, sị: “Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji; n’ihi na ọnụ Jehova nke ụsụụ ndị agha ekwuwo ya.” Ya mere, ụwa a aghaghị ịdịgide ruo mgbe ebighị ebi ka ụmụ mmadụ wee nwee ike ibi na ya dị ka Chineke zubere, ma ọ́ bụghị ya, nkwa niile o kwere agaghị enwe isi.—Abụ Ọma 119:90; Aịzaya 55:11; 1 Jọn 2:17.
Nke atọ bụ na ọ bụ ụmụ mmadụ ka Chineke nyefere ụwa a ka ha lekọtawa. Okwu Chineke sịrị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova, ma ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ.” (Abụ Ọma 115:16) Ò nwere nna hụrụ nwa ya n’anya nke ga-enye nwa ya onyinye mara mma, ma tụgharịa nara nwa ahụ onyinye ahụ bibie? Mbanụ! Otú ahụkwa ka ọ dị Jehova, ọ gaghị eme ụwa na ndị bi n’ime ya ụdị ihe ahụ, n’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:8.
Jizọs Kraịst kwuru okwu na-emesi obi ike banyere Nna ya, sị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) Chineke, bụ́ onye na-apụghị ịgha ụgha, kwere nkwa, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29; Taịtọs 1:2.
[Ebe E Nweta Foto dị na peeji nke 31]
Ụwa: Foto ụlọ ọrụ NASA sere