Ihe Kacha Egosi na Chineke Hụrụ Anyị n’Anya
Bịaruo Chineke Nso
Ihe Kacha Egosi na Chineke Hụrụ Anyị n’Anya
EBREHAM hụrụ Chineke n’anya. Nwoke a kwesịrị ntụkwasị obi hụkwara Aịzik nwa ya n’anya, bụ́ nwa ọ mụrụ n’agadi. Ma, mgbe Aịzik dị ihe dị ka afọ iri abụọ na ise, Chineke gwara Ebreham ka o mee ihe ga-esiri nna ọ bụla ike ime. Ọ gwara ya ka o jiri nwa ya chụọ àjà. Ma, Aịzik emechaghị nwụọ. N’oge Ebreham gaara egbu ya, Chineke ji mmụọ ozi ya gbochie ya. Akụkọ a Baịbụl kọrọ na Jenesis 22:1-18 mere ka anyị hụpere otú Chineke hụruru anyị n’anya.
Amaokwu 1 kwuru na “Chineke lere Ebreham ule.” Ebreham nwere okwukwe, ma ugbu a, a ga-ele okwukwe ya ule otú a na-eletụbeghị ya. Chineke kwuru, sị: “Biko, kpọrọ nwa gị nwoke, nwa ị mụrụ naanị ya, onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu, bụ́ Aịzik, . . . chụọ ya dị ka àjà nsure ọkụ n’otu n’ime ugwu m ga-akpọrọ gị aha.” (Amaokwu nke 2) Cheta na Chineke anaghị ekwe ka a nwaa ndị ohu ya karịa otú ha nwere ike idi. N’ihi ya, ule a Chineke lere Ebreham gosiri na Chineke tụkwasịrị ya obi.—1 Ndị Kọrịnt 10:13.
Ebreham rubeere Chineke isi ozugbo. Anyị na-agụ, sị: “Ebreham wee bilie n’isi ụtụtụ dokwasị ihe e ji anọkwasị n’ịnyịnya ibu ya wee kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị na-ejere ya ozi, tinyere Aịzik nwa ya; ọ wakwara nkụ ọ ga-eji chụọ àjà nsure ọkụ ahụ. O wee bilie gawa.” (Amaokwu nke 3) O doro anya na o nweghị onye Ebreham kọọrọ ihe niile gbasara àjà ahụ ọ na-aga ịchụ.
Ha mere njem abalị atọ, nke a nyere Ebreham ohere iche echiche nke ọma. Ma, Ebreham agbanweghị obi ya. Okwu o kwuru gosiri na o nwere okwukwe. Mgbe o lepụrụ anya hụ ugwu ahụ, ọ gwara ndị na-ejere ya ozi, sị: “Nọrọnụ n’ebe a . . . , ma mụ na nwa okoro a ga-aga n’ebe ahụ fee ofufe ma lọghachikwute unu.” Mgbe Aịzik jụrụ maka atụrụ ha ga-eji achụ àjà, Ebreham gwara ya, sị: “Chineke ga-ewetara onwe ya atụrụ.” (Amaokwu nke 5 na nke 8) Ebreham tụrụ anya na ya na nwa ya ga-eso lọta. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na “o weere ya na Chineke nwere ike ịkpọlite ya [ya bụ, Aịzik] ọbụna site ná ndị nwụrụ anwụ.”—Ndị Hibru 11:19.
N’elu ugwu ahụ, mgbe Ebreham weere ‘mma ka o gbuo nwa ya,’ otu mmụọ ozi gbochiri ya. Chineke gwaziri Ebreham ka o were otu ebule osisi jichiri chụọrọ ya àjà “n’ọnọdụ nwa ya nwoke.” (Amaokwu nke 10 ruo nke 13) N’anya Chineke, Ebreham ejirila Aịzik chụọ àjà. (Ndị Hibru 11:17) Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru, sị: “Ebe Ebreham dị njikere ịchụ nwa ya n’àjà, Chineke weere ya na ọ chụọla ya n’àjà.”
Ebreham emechughị Jehova ihu n’obi Jehova tụkwasịrị ya. A gọziri Ebreham maka obi ike o nwere na Jehova, n’ihi na Chineke kwughachiri ọgbụgba ndụ ya na Ebreham, meekwa ka o dokwuo anya na ọgbụgba ndụ ahụ ga-agọzi ndị mba niile.—Amaokwu nke 15 ruo nke 18.
N’ikpeazụ, Chineke ekweghị ka Ebreham jiri nwa ya chụọ àjà, ma Yanwa ga-eji nwa nke ya chụọ àjà ma e mechaa. Njikere Ebreham dị ịchụ nwa ya n’àjà gosiri na Chineke ga-eji Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, bụ́ Jizọs, chụọ àjà maka mmehie anyị. (Jọn 3:16) Àjà Jehova ji Kraịst chụọ bụ ihe kacha egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya. Ebe ọ bụ na Chineke meere anyị ụdị ihe a, anyị kwesịziri ịjụ onwe anyị, sị, ‘Olee ihe m dị njikere ime iji mee ka obi dị Chineke ụtọ?’