Ibu Ọnụ Ọ̀ Na-eme Ka Mmadụ Bịarukwuo Chineke Nso?
Ibu Ọnụ Ọ̀ Na-eme Ka Mmadụ Bịarukwuo Chineke Nso?
‘Ibu ọnụ na-enyere mmadụ aka ichebara mmekọrịta ya na Chineke echiche, ọ na-echetakwara onye ahụ na ihe anụ ahụ́ abụghị ihe kacha mkpa ná ndụ.’—NWAANYỊ KATỌLIK.
‘Ibu ọnụ na-eme ka mmadụ na Chineke dịrị ná mma.’—RABAỊ NDỊ JUU.
‘N’okpukpe m, ibu ọnụ bụ iwu, ọ bụ ihe dị mkpa na-egosi na m na-erubere Chineke isi ma na-ekele ya. M na-ebu ọnụ n’ihi na m hụrụ Chineke n’anya.’—ONYE OKPUKPE BAHA’I.
ỌTỤTỤ okpukpe dị n’ụwa na-ebu ọnụ, ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Buddha, ndị Hindu, ndị Alakụba, ndị Jain, na ndị okpukpe ndị Juu. Ọtụtụ ndị kweere na mmadụ ibu ọnụ ga-eme ka onye ahụ bịarukwuo Chineke nso.
Gịnị ka i chere? Ì kwesịrị ibu ọnụ? Olee ihe Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, kwuru n’okwu a?
Ibu Ọnụ n’Oge Baịbụl
N’oge Baịbụl, e nwere ihe dị iche iche dị Chineke mma mere ndị mmadụ ji buo ọnụ. Ụfọdụ buru ọnụ iji gosi na ha nọ n’oké mwute ma ọ bụ na ha echegharịala ná mmehie ha (1 Samuel 7:4-6), iji rịọ Chineke ka o meere ha ihe ọma ma ọ bụ duzie ha (Ndị Ikpe 20:26-28; Luk 2:36, 37), ma ọ bụkwanụ iji mee ka uche ha dịrị nkọ mgbe ha na-atụgharị uche.—Matiu 4:1, 2.
Ma, Baịbụl kwukwara banyere ọnụ ndị mmadụ buru bụ́ ndị Chineke na-anabataghị. Eze Sọl buru ọnụ tupu ya agakwuru onye na-ajụ ndị mmụọ ase. (Levitikọs 20:6; 1 Samuel 28:20) Ndị ajọ mmadụ, ndị dị ka Jezibel nakwa ndị ahụ bu okpukpe n’isi kpara nkata igbu Pọl onyeozi, buchara ọnụ. (1 Ndị Eze 21:7-12; Ọrụ 23:12-14) A ma ndị Farisii ama na ha na-ebukarị ọnụ. (Mak 2:18) N’agbanyeghị ya, Jizọs katọrọ ha, ọnụ ha buru amasịghịkwa Chineke. (Matiu 6:16; Luk 18:12) Jehova ejighịkwa ọnụ ụfọdụ ndị Izrel buru kpọrọ ihe n’ihi àgwà ọjọọ ha na ihe ọjọọ ha bu n’obi.—Jeremaya 14:12.
Ihe atụ ndị a gosiri na ihe na-eme Chineke
obi ụtọ abụghị ọnụ ahụ e buru. N’agbanyeghị ya, ọtụtụ ezigbo ndị ohu Chineke buru ọnụ, Chineke anabatakwa ya. Ọ̀ pụtaranụ na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-ebu ọnụ?Ọ̀ Bụ Iwu na Ndị Kraịst Ga Na-ebu Ọnụ?
Iwu Mozis kwuru na ndị Juu “ga-emekpa mkpụrụ obi [ha] ahụ́,” ya bụ, ha ga na-ebu ọnụ, otu ugboro n’afọ, n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. (Levitikọs 16:29-31; Abụ Ọma 35:13) Ọ gwụla ya bụ ọnụ Jehova gwara ndị Juu ka ha na-ebu. * Ọ ga-abụ na ndị Juu ndị dịrị ndụ n’oge a na-edebe Iwu Mozis rubere isi n’Iwu ahụ. Ma, e nyeghị Ndị Kraịst iwu idebe Iwu Mozis.—Ndị Rom 10:4; Ndị Kọlọsi 2:14.
Ọ bụ eziokwu na Jizọs buru ọnụ otú ahụ Iwu Mozis kwuru, ma e jighị ibu ọnụ mara ya. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-eme omume ma ọ bụrụ na ha achọọ ibu ọnụ, ma o nweghị mgbe o nyere ha iwu ka ha buwe ọnụ. (Matiu 6:16-18; 9:14) Oleezi ihe mere Jizọs ji kwuo na ndị na-eso ụzọ ya ga-ebu ọnụ mgbe ya nwụrụ? (Matiu 9:15) Ihe a abụghị iwu. Okwu Jizọs na-egosi na mgbe ọ ga-anwụ, ndị na-eso ụzọ ya ga-enwe ezigbo mwute nke na ihe oriri agaghị agụ ha.
Akụkọ abụọ Baịbụl kọrọ banyere Ndị Kraịst oge mbụ bụ́ ndị buru ọnụ gosiri na ọ bụrụ na mmadụ bu ezi ihe n’obi kpebie na ya agaghị eri ihe, Chineke na-anabata ya. (Ọrụ 13:2, 3; 14:23) * N’ihi ya, ọ bụghị iwu na Ndị Kraịst ga na-ebu ọnụ. Ma, ọ dị ihe ụfọdụ onye chọrọ ime ya kwesịrị izere.
Ihe Ndị A Ga-ezere
Otu ihe a ga-ezere ma a na-ebu ọnụ bụ mmadụ ịbụ onye ezi omume n’anya onwe ya. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị zere ‘ịdị umeala n’obi ụgha.’ (Ndị Kọlọsi 2:20-23) Ihe atụ ahụ Jizọs mere banyere onye Farisii dị mpako, bụ́ onye chere na ya bụ onye ezi omume karịa ndị ọzọ n’ihi ọnụ ọ na-ebu mgbe niile, gosiri nnọọ na Chineke anaghị anabata ụdị omume ahụ.—Luk 18:9-14.
Ọ gaghịkwa adị mma ma i mewe ka ọha na eze mara na ị na-ebu ọnụ ma ọ bụkwanụ buwe ọnụ maka na onye ọzọ gwara gị buo ya. Na Matiu 6:16-18, Jizọs dọrọ aka ná ntị na ibu ọnụ bụ okwu dịịrị naanị gị na Chineke, nakwa na i kwesịghị ịkọsawara ya ndị ọzọ.
Mmadụ ekwesịtụghị iche na ọ ga-eji ibu ọnụ akwụ ụgwọ mmehie o mere. Ka Chineke nwee ike ịnabata ọnụ mmadụ na-ebu, onye ahụ ga na-edeberịrị iwu Chineke. (Aịzaya 58:3-7) Ihe na-eme ka Chineke gbaghara mmadụ mmehie abụghị ibu ọnụ, kama ọ bụ nchegharị si onye ahụ n’obi. (Joel 2:12, 13) Baịbụl mere ka o doo anya na ọ bụ obiọma Jehova na-erughịrị mmadụ, bụ́ nke o gosiri site n’izite Kraịst ka o jiri ndụ ya chụọ àjà, mere e ji agbaghara anyị mmehie anyị. Mmadụ agaghị ejili aka ya meta ihe Chineke ga-eji agbaghara ya mmehie, ibu ọnụ agaghịdị emeli ya.—Ndị Rom 3:24, 27, 28; Ndị Galeshia 2:16; Ndị Efesọs 2:8, 9.
Aịzaya 58:3 kwuru banyere ihe ọzọ na-adịghị mma ndị na-ebu ọnụ na-emekarị. Ndị Izrel mere ka à ga-asị na Jehova ji ha ụgwọ imere ha ihe n’ihi ọnụ ha na-ebu, ka hà na-emere Chineke ihe ọma. Ha jụrụ, sị: “Gịnị mere anyị ji buo ọnụ ma ị hụghị ya, gịnịkwa mere anyị ji mekpaa mkpụrụ obi anyị ahụ́ ma ị maghị?” Taakwa, ọtụtụ ndị na-eche na ebe ọ bụ na ha na-ebu ọnụ, na Chineke kwesịrị imere ha ihe ọma. Ka anyị ghara iṅomi ụdị omume enweghị nsọpụrụ a Akwụkwọ Nsọ katọrọ!
Ndị ọzọ kweere na ha nwere ike inweta ihu ọma Chineke ma ha jiri ibu ọnụ na-ata onwe ha ahụhụ, na-apịa onwe ha ihe, ma ọ bụ na-eme ihe ndị yiri ya. Okwu Chineke katọrọ ụdị echiche a, kwuo na ‘ịta onwe onye ahụhụ abaghị uru n’ịlụso ọchịchọ anụ ahụ́ ọgụ.’—Ndị Kọlọsi 2:20-23.
Otú E Kwesịrị Isi Lee Ya Anya
Ibu ọnụ abụghị iwu, ọ bụghịkwa ihe ọjọọ. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịba uru ma ọ bụrụ na mmadụ ezere ihe ndị ahụ anyị kwurula. Ma, ọ bụghị ibu ọnụ ga-eme ka ofufe anyị dị Chineke mma. Jehova bụ ‘Chineke onye obi ụtọ,’ ọ chọkwara ka ndị na-efe ya na-enwe obi ụtọ. (1 Timoti 1:11) Okwu ya sịrị: “Ọ dịghị ihe dịịrị ha mma karịa . . . ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile. Ọ bụ onyinye Chineke.”—Ekliziastis 3:12, 13.
Ofufe anyị na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme anyị obi ụtọ, ma ọ dịghị mgbe Baịbụl kwuru na ibu ọnụ na-eme mmadụ obi ụtọ. Ọ bụrụkwa na ibu ọnụ emee ka anyị daa ọrịa ma ọ bụ mee ka anyị ghara inwe ike anyị ga-eji rụọ ọrụ obi ụtọ Onye kere anyị nyere ezi Ndị Kraịst, nke bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke, ọ ga-emebiri anyị ihe kama ịbara anyị uru.
Ma ànyị kpebiri ibu ọnụ ma ọ bụ na anyị ekpebighị, anyị ekwesịghị ikpe ndị ọzọ ikpe. Ibu ọnụ ekwesịghị isere ezi Ndị Kraịst okwu, “n’ihi na alaeze Chineke abụghị iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, kama ọ bụ ezi omume na udo na ọṅụ nke na-esite na mmụọ nsọ.”—Ndị Rom 14:17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 12 Ọ bụghị Chineke nyere Esta iwu ka o buo ọnụ ahụ o buru tupu oge Ememme Purim, ọ bụ ezie na o yiri ka Chineke ọ̀ nabatara ya.
^ par. 14 Ụfọdụ nsụgharị Baịbụl tinyere ibu ọnụ n’ebe ụfọdụ, ma, ha adịghị n’ihe odide Grik ndị kacha ochie.—Matiu 17:21; Mak 9:29; Ọrụ 10:30; 1 Ndị Kọrịnt 7:5, Baịbụl King James Version.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 28]
Ndị Farisii gosiri umeala n’obi ụgha mgbe ha na-ebu ọnụ
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 29]
“Alaeze Chineke abụghị iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, kama ọ bụ ezi omume na udo na ọṅụ nke na-esite na mmụọ nsọ”
[Igbe dị na peeji nke 29]
Oleekwanụ Maka Lent?
A sịrị na a na-eji ibu ọnụ Lent nke na-ewe abalị iri anọ echeta ọnụ Kraịst buru abalị iri anọ. Ma, ọ dịghị mgbe Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha chetawa ọnụ ahụ o buru, ọ dịghịkwanụ ihe gosiri na ha mere otú ahụ. E chere na ebe mbụ doro anya e kwuru banyere obubu ọnụ abalị iri anọ a na-ebu tupu Ista bụ n’akwụkwọ ozi ndị Athanasius, bụ́ achịbishọp chọọchị ọtọdọks, dere n’afọ 330 Oge Anyị.
A ghọtabeghị ihe mere ụfọdụ chọọchị ji ebu ọnụ Lent tupu Ista ebe ọ bụkwanụ na mgbe Jizọs buru ọnụ bụ tupu e mee ya baptizim ọ bụghị tupu ya anwụọ. Otú ọ dị, ibu ọnụ abalị iri anọ ná mmalite afọ bụ ihe e ji mara ndị Babịlọn oge ochie, ndị Ijipt, na ndị Gris. O doro anya na ọ bụ mba ndị a ka e si n’aka ha mụta ime ihe a a sị na ọ bụ omenala Ndị Kraịst.