Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee ihe bụ́ ọnụ ahụ a gụrụ ndị mmadụ bụ́ nke mere ka a mụọ Jizọs na Betlehem?

Oziọma Luk kwuru na mgbe Siza Ọgọstọs tiri iwu ka a gụọ ndị mmadụ ọnụ n’ebe niile Alaeze Ukwu Rom na-achị, “mmadụ niile [gara] ka e deba aha ha n’akwụkwọ, onye ọ bụla n’obodo nke ya.” (Luk 2:1-3) Obodo Josef, bụ́ nna Jizọs n’ụwa, bụ Betlehem, njem Josef na Meri mekwara iji rubere iwu ahụ isi mere ka a mụọ Jizọs na Betlehem. Isi otú ahụ edeba aha ndị mmadụ n’akwụkwọ na-eme ka ọ dịkwuo mfe ịnakọta ụtụ isi na inweta ndị ga-aga agha.

Tupu ndị Rom emerie Ijipt n’afọ 30 Tupu Oge Anyị, ndị Ijipt agụwalarị ndị mmadụ ọnụ kemgbe ọtụtụ afọ. Ndị ọkà mmụta kweere na ndị Rom mụụrụ otú ahụ ndị Ijipt si agụ ndị mmadụ ọnụ ma malite ime ya n’ebe ndị ọzọ ha na-achị.

Iwu onye Rom bụ́ gọvanọ Ijipt nyere n’afọ 104 Oge Anyị gosiri na ndị Rom si otú ahụ deba aha ndị mmadụ n’akwụkwọ. Akwụkwọ iwu ahụ, bụ́ nke e chekwara otu ya n’Ọ́bá Akwụkwọ Britain, kwuru, sị: “Gaius Vibius Maximus, Onye Ọchịchị Ijipt (kwuru, sị): Ebe ọ bụ na oge eruola ka a gụọ ndị mmadụ ọnụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ọ dị mkpa ka a manye ndị niile na-ebighị n’obodo ha, n’agbanyeghị ihe mere ha ji biri n’ebe ọzọ, ka ha laghachi n’obodo ha, ka ha nwee ike ime ihe iwu ịgụ ndị mmadụ ọnụ kwuru ma gbaa mbọ kọọ ihe n’ala ha.”

Olee ihe mere Josef ji chewe echiche inye Meri akwụkwọ ịgba alụkwaghịm ebe ọ bụ naanị nkwa ọlụlụ ka o kwere ya?

Oziọma Matiu kwuru na Josef matara na Meri dị ime n’oge ‘e kwere Meri nkwa na Josef ga-alụ ya,’ tupu e jikọọ ha. Ebe ọ bụ na Josef amaghị na ime ahụ Meri dị bụ “site n’ike mmụọ nsọ,” ọ ga-abụrịrị na o chere na Meri akwaala iko, n’ihi ya kwa, o bu n’uche ịgba ya alụkwaghịm.—Matiu 1:18-20.

Ndị Juu na-ele mmadụ abụọ kwere onwe ha nkwa ọlụlụ anya ka ndị lụrụla alụ. Ma, ha abụọ anaghị ebikọta ọnụ dị ka di na nwunye ruo mgbe ha gbachara akwụkwọ. Nkwa ọlụlụ na-ejikọ nnọọ nwoke na nwaanyị nke na ọ bụrụ na ha alụghị n’ihi na nke nwoke gbanwere obi ya ma ọ bụ n’ihi ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ, nwa agbọghọ ahụ enwereghị onwe ya ịlụ onye ọzọ ruo mgbe ọ natara akwụkwọ ịgba alụkwaghịm. Ọ bụrụ na nwoke nke kwere nwaanyị nkwa ọlụlụ anwụọ tupu ha agbaa akwụkwọ, a na-ele nwaanyị ahụ anya ka nwaanyị di ya nwụrụ. Ya bụrụkwanụ na ọ kwaa iko n’oge e kwere ya nkwa ọlụlụ, a na-ele ya anya ka nwaanyị lụrụ di nke kwara iko, a na-amakwa ya ikpe ọnwụ.—Diuterọnọmi 22:23, 24.

O yiri ka Josef ò chere echiche otú ihe ga-adịrị Meri ma a gbaa ihe ahụ merenụ n’anwụ. Ọ bụ ezie na o chere na ọ dị mkpa ka ya kọọrọ ndị isi, ọ chọghị ime ihe ga-emenye Meri ihere ma mee ka e jiri ya gbawa asịrị. N’ihi ya, o kpebiri ịgba ya alụkwaghịm na nzuzo. E kwuwerị, ọ bụrụ na nwaanyị na-anọghị na di nke nwere nwa nwere akwụkwọ ịgba alụkwaghịm, ọ ga-egosi na ọ lụbuola di.

[Foto dị na peeji nke 16]

Iwu ịgụ ndị mmadụ ọnụ nke onye Rom bụ́ gọvanọ Ijipt nyere, 104 oge anyị

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Òtù Na-ahụ Maka Ọ́bá Akwụkwọ Britain, naanị ha ka ikike ibipụtaghachi ya dị n’aka (P.904)