Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jizọs Nyere Ndụ Ya Maka Ọtụtụ Mmadụ

Jizọs Nyere Ndụ Ya Maka Ọtụtụ Mmadụ

Jizọs Nyere Ndụ Ya Maka Ọtụtụ Mmadụ

Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya na ya bịara n’ụwa, “ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) O ji obi ya niile nye ndụ ya maka abamuru ndị ọzọ.

Olee otú Jizọs si jiri ọnwụ ya nye ihe mgbapụta? Olee ihe mere nke a ji dị mkpa? Ole ndị ka Jizọs nwụrụ maka ha? Oleekwa ihe ọnwụ ya nwere ike ịpụtara gị?

Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ka i soro ha zukọọ iji nyochaa otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị a. N’afọ a, ncheta ọnwụ Jizọs dabara na Tuzdee, Mach 30, mgbe anyanwụ dachara. Ná nnọkọ ahụ, a ga-eji Akwụkwọ Nsọ zaa ajụjụ ndị ahụ a jụrụ n’elu.

I nwere ike ịga ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kacha gị nso. Biko, jụta Ndịàmà Jehova bi gị nso ebe a ga-eme ya na oge ọ ga-abụ.