Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ bụ Jizọs bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?

Ọ̀ bụ Jizọs bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ọ̀ bụ Jizọs bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?

▪ Na nkenke, azịza ya bụ ee. N’ọtụtụ obodo, ndị mmadụ na-aza ihe karịrị otu aha. Otú ahụ ka ọ dịkwa aha ndị dị na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, a kpọkwara nna ochie, bụ́ Jekọb, Izrel. (Jenesis 35:10) A kpọrọ Pita onyeozi ụzọ aha ise—Simiọn, Saịmọn, Pita, Sifas, na Saịmọn Pita. (Matiu 10:2; 16:16; Jọn 1:42; Ọrụ 15:7, 14) Olee otú anyị ga-esi jide n’aka na Maịkel bụ aha ọzọ a na-akpọ Jizọs? Ka anyị tụlee ihe akaebe a si n’Akwụkwọ Nsọ.

Baịbụl kpọrọ mmụọ ozi ahụ dị ike bụ́ Maịkel aha ugboro ise. Atọ n’ime ha dị n’akwụkwọ Daniel. Daniel 10:13, 21, kwuru na Maịkel, bụ́ onye a kpọrọ “otu n’ime ndị isi kasịnụ” na “onyeisi unu,” napụtara otu mmụọ ozi e dunyere ozi. Na Daniel 12:1, anyị mụtakwara na n’oge ikpeazụ, “Maịkel ga-ebili, bụ́ nnukwu onyeisi ahụ nke guzo ọtọ n’ihi ụmụ ndị gị.”

Ebe ọzọ a kpọrọ Maịkel aha bụ ná Mkpughe 12:7, bụ́ ebe kwuru na “Maịkel na ndị mmụọ ozi ya” lụrụ otu agha dị mkpa nke mere ka a chụpụ Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe.

Ị ga-ahụ na nke ọ bụla n’ebe ndị ahụ a kpọrọ Maịkel aha na-egosi na ọ bụ mmụọ ozi bụ́ dike n’agha, nke na-alụrụ ndị Chineke agha ma na-echebe ha, ọbụna lụso onye iro Jehova kachanụ, bụ́ Setan, agha.

Jud amaokwu 9 kpọrọ Maịkel “onyeisi ndị mmụọ ozi.” Okwu bụ́ “onyeisi” pụtara “onye kacha ndị nke ọzọ,” ọ bụkwa naanị otu onye ka a kpọrọ “onyeisi ndị mmụọ ozi” na Baịbụl. Naanị amaokwu ọzọ kpọrọ onyeisi ndị mmụọ ozi aha bụ 1 Ndị Tesalonaịka 4:16, bụ́ ebe Pọl kọwara Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ, sị: “Onyenwe anyị [Jizọs] ga-esi n’eluigwe rịdata. Ọ ga-eji olu dara ụda kpọọ òkù, bụ́ olu onyeisi ndị mmụọ ozi, jirikwa opi nke Chineke.” Ya mere, ebe a gosiri na ọ bụ Jizọs Kraịst ka a kpọrọ onyeisi ndị mmụọ ozi ma ọ bụ mmụọ ozi kachanụ.

Olee ihe anyị nwere ike ikwubi n’ihe niile a e kwurula? Ihe anyị ga-ekwubi bụ na Jizọs Kraịst bụ Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi. Ma Maịkel (nke pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?”) ma Jizọs (nke pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta”) na-ekwu banyere ọrụ ya dị ka onye na-ebute ụzọ n’ịkwado ọbụbụeze Chineke. Ndị Filipaị 2:9 kwuru, sị: “Chineke buliri ya [Jizọs e mere ka ọ dị ebube] elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu, o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ.”

Ọ dị mkpa iburu n’uche na ọ bụghị mgbe a mụrụ Jizọs dị ka mmadụ ka ọ malitere ịdị ndụ. Tupu a mụọ Jizọs, otu mmụọ ozi letara Meri ma gwa ya na ọ ga-atụrụ ime nwa nwoke site n’ike mmụọ nsọ nakwa na ọ ga-agụ ya Jizọs. (Luk 1:31) Mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, o kwuru ọtụtụ ugboro banyere ndụ ọ dịrị tupu ya aghọọ mmadụ.—Jọn 3:13; 8:23, 58.

Ya mere, Maịkel bụ́ onyeisi ndị mmụọ ozi bụ Jizọs tupu ya aghọọ mmadụ. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ya alaghachi n’eluigwe, ọ maliteghachiri ọrụ ya dị ka Maịkel, bụ́ onyeisi ndị mmụọ ozi, “iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.”—Ndị Filipaị 2:11.