Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Onye Biri Akwụkwọ n’Oge Gboo Emee Ka Ọtụtụ Ndị Gụwa Baịbụl

Otu Onye Biri Akwụkwọ n’Oge Gboo Emee Ka Ọtụtụ Ndị Gụwa Baịbụl

Otu Onye Biri Akwụkwọ n’Oge Gboo Emee Ka Ọtụtụ Ndị Gụwa Baịbụl

A MALITERE iji aka ede akwụkwọ ọtụtụ puku afọ gara aga. Ma, ọ dịchabeghị anya a malitere iji ígwè ebi akwụkwọ. E biri akwụkwọ ndị mbụ a maara e biri ebi na Chaịna n’afọ 868 O.A. (Oge Anyị) site n’iji ibé osisi ndị a tụrụ mkpụrụ akwụkwọ na ha ebi ihe n’akwụkwọ. Ihe dị ka n’afọ 1455 na Jamanị, Johannes Gutenberg mepụtara ígwè obibi akwụkwọ mbụ a na-edogharị mkpụrụ akwụkwọ ya edogharị ma bipụta Baịbụl mbụ e nwere na Latịn.

Ma, ọ bụ mgbe afọ ole na ole gaferela, mgbe a maliterela ibi akwụkwọ, ka a malitere ikesa Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ ebe niile. Nurembag ghọrọ ebe bụ́ isi a na-ebi akwụkwọ na Jamani, o nwekwara ike ịbụ Anton Koberger, bụ́ onye obodo ahụ, bụ onye mbụ malitere ibipụta Baịbụl a na-ebuga n’ụwa niile n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu.

Ndị obodo niile eritela uru n’aka ndị mbụ biri Baịbụl, ndị otu n’ime ha bụ Anton Koberger. N’ihi ya, ka anyị tụlekwuo banyere Koberger na ọrụ ya.

“O Ji Otu Akwụkwọ, Bụ́ Baịbụl, Kpọrọ Ihe”

Koberger mepere ebe obibi akwụkwọ mbụ na Nurembag n’afọ 1470. Mgbe ụlọ ọrụ a na-ewu ewu, o nwere ígwè obibi akwụkwọ iri abụọ na anọ na-arụ ọrụ otu mgbe, nwee otu narị ndị na-ebi akwụkwọ, ndị ọrụ nkà, na ndị ọrụ ndị ọzọ na Bazụl, Strasbọg, Liọn, na n’obodo ndị ọzọ dị na Yurop. Koberger biri akwụkwọ ndị e dere na Latịn oge ochie na ọtụtụ akwụkwọ sayensị nke oge ahụ. N’oge ọ na-ebi akwụkwọ, o bipụtara narị akwụkwọ abụọ na iri atọ na isii dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ha nwere ihe ruru ọtụtụ narị peeji, e bikwara ha niile otu otu n’ígwè obibi akwụkwọ ndị a na-eji aka akwagharị.

Mkpụrụ akwụkwọ ndị mara mma ma dị mfe ọgụgụ Koberger ji ebi akwụkwọ ya mere ka a mara akwụkwọ ya amara. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Alfred Börckel dere, sị: “Koberger na-ahụ mgbe niile na mkpụrụ akwụkwọ ha ji ebi akwụkwọ bụ ndị a rụpụtara ọhụrụ, ndị na-akwọchabeghị akwọcha. Ọ naghị ekwe ka e jiri mkpụrụ akwụkwọ ndị kwọchara akwọcha bie akwụkwọ.” Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ akwụkwọ na Baịbụl ndị Koberger bipụtara nwere ihe osise ndị e ji osisi tụọ ma bie ha na ha.

Oscar Hase, bụ́ onye dere akụkọ ndụ Koberger, dere na malite mgbe Koberger bidoro ọrụ ya ruo mgbe ọ kwụsịrị, “ihe pụtara ìhè n’oge ahụ niile bụ na o ji otu akwụkwọ, bụ́ Baịbụl, kpọrọ ihe.” Koberger na ndị òtù ya gbara ezigbo mbọ inweta ihe odide Baịbụl ndị kacha zie ezie e nwere. Ọrụ a agaghị adịrị ha mfe, ebe ọ bụ na a na-edebe ọtụtụ ihe odide ochie nke Baịbụl n’ebe obibi ụfọdụ nke ndị mọnk, na-enyekwa ya ndị mmadụ naanị ruo nwa oge ka ha depụtaghachi ihe dị na ha—ma ọ bụdịrị na ha ekwe inye ya mmadụ enye.

Baịbụl Latịn na Jaman

Koberger biri Biblia Latina (Baịbụl Latịn) ugboro iri na ise, bipụta nke mbụ ya n’afọ 1475. Mbipụta ụfọdụ ya nwere ihe osise nke ụgbọ Noa, Iwu Iri ahụ, na ụlọ nsọ Sọlọmọn. N’afọ 1483, Koberger biri Biblia Germanica (Baịbụl Jaman) ya, bipụta ya ihe dị ka otu puku na narị ise—bụ́ ọnụ ọgụgụ buru ibu n’oge ahụ. Baịbụl a nwere ihe karịrị otu narị ihe osise a tụrụ n’osisi bie na ya iji dọta mmasị ndị na-agụ ya, mee ka ihe odide ya doo anya, chetakwara ndị na-anaghị agụli Baịbụl akụkọ ndị ha ma ama dị na Baịbụl. Ndị sere ihe osise na Baịbụl mgbe e mechara, karịsịa Baịbụl Jaman, leere anya n’ihe osise ndị dị na Baịbụl a.

Baịbụl Jaman ahụ Koberger bipụtara n’afọ 1483 malitere iwu ewu, ma o mechara bụrụ naanị Baịbụl Jaman Koberger ga-ebipụta. Ọ bụ ezie na ndị na-edeziri ya ihe leziri anya mee ka okwu ndị o ji sụgharịa ya kwekọọ ná nsụgharị Vulgate Latịn chọọchị kwadoro, o si ná nsụgharị ndị Waldo nke a sụgharịrị na narị afọ nke iri na anọ, bụ́ nke a machibidoro iwu, sụgharịa ya. * N’afọ sochiri ya, Poopu Innocent nke Asatọ tụrụ aro ka e bibie ndị Waldo. Mgbe nke ahụ gasịrị, mmegide chọọchị na-emegide ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ dị iche iche nọgidere na-aka njọ. Na Mach 22, 1485, Achịbishọp Berthold nke Maịnts, Jamanị, tiri iwu megidere ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Jaman. Na Jenuwarị 4 nke afọ sochiri ya, Berthold nyeghachiri iwu ahụ. N’ihi ọgba aghara ahụ, Koberger anwaghị anwa bie Baịbụl ọzọ n’asụsụ Jaman.

N’agbanyeghị nke ahụ, mbọ Anton Koberger gbara efughị ọhịa. O butere ụzọ n’iji nkà ibi akwụkwọ pụtara ọhụrụ mee ka ọtụtụ ụdị akwụkwọ ruo ndị mmadụ aka na Yurop n’ọnụ ego dị ala. N’ihi ya, ọrụ Koberger nyere aka mee ka ndị nkịtị nweta Baịbụl.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Òtù Waldo—Site n’Ịjụ Okwukwe Gaa n’Okpukpe Protestant,” nke dị n’Ụlọ Nche March 15, 2002.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Malite n’aka ekpe gaa n’aka nri: Ihe osise a tụrụ atụ nke ebe Daniel nọ n’olulu ọdụm; Mkpụrụ akwụkwọ mmalite a chọrọ mma; Mkpụrụ akwụkwọ ndị na-akwọchaghị akwọcha

[Foto dị na peeji nke 26]

Koberger

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ihe ndị dị na Baịbụl Latịn na nke Jaman Koberger, ndị na-egosi ihe ịchọ mma pụtara ìhè na nkọwa ndị e nyere na Jenesis 1:1

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 26]

Foto Baịbụl niile: A natara Ọ́bá Akwụkwọ American Bible Society ikike; Koberger: Mit freundlicher Genehmigung der Linotype GmbH