Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Gịnị mere ndị mmadụ n’oge Baịbụl ji jiri bitumen mere ụrọ?
▪ Baịbụl kwuru na ndị rụrụ ụlọ elu Bebel ‘ji brik mere nkume, ma jiri bitumen mere ụrọ.’—Jenesis 11:3.
Bitumen na-esi n’ime ala apụta. A na-esi na mmanụ dị n’ime ala enweta ya. Mmanụ a dị n’ọtụtụ ebe na Mesopotemia. Ọ na-esi n’ime ala agbapụta ma kpụkọọ. N’oge Baịbụl, a chọpụtara na bitumen dị mma iji ya anyakọta ihe. Otu akwụkwọ kwuru na “ọ bụrụ na a chọrọ iji brik arụ ụlọ, ihe dị mma iji doo brik ahụ bụ bitumen.”
Otu isiokwu gbara na magazin a kpọrọ Archaeology kọrọ na n’oge na-adịbeghị anya, e nwere ndị ọkà mmụta ndị gara n’obodo Ọọ, nke dị na Mesopotemia. Ha gara kirie otu nnukwu ụlọ a rụrụ n’oge ochie nke dakasịrịla adakasị. Onye dere magazin ahụ kwuru, sị: “Bitumen e ji doo brik ụlọ ahụ ka dị n’agbata brik ndị ahụ. Iji bitumen edo brik so n’ihe mbụ e ji ihe si na mmanụ dị n’ala mee. Mmanụ a juru ebe niile n’ebe ndịda Ịrak. Bitumen ahụ e ji ejikọta brik n’oge ochie bụzi ya na-akpata esemokwu nakwa ọgụ ndị a na-alụ n’ebe ndị ahụ taa. Bitumen ahụ ndị Babịlọn ji doo brik n’oge ochie ma jirikwa ya rụọ okporo ụzọ mere ka brik ndị ahụ ghara ịdakasị, meekwa ka ha dịrị ruo ọtụtụ puku afọ.”
Olee ụdị akwụkwọ e ji dee ihe n’oge Baịbụl?
▪ Ihe butere ajụjụ a bụ ihe Jọn, onye so dee Baịbụl, dere. O dere, sị: “Ọ bụ ezie na m nwere ọtụtụ ihe idetara unu, achọghị m iji akwụkwọ na ink dee ya.”—2 Jọn 12.
Okwu Grik bụ́ kharʹtes, nke a sụgharịrị “akwụkwọ” n’amaokwu a, bụ akwụkwọ e ji papaịrọs mee. Papaịrọs bụ ahịhịa nwere okporo, ọ na-etokwa n’akụkụ mmiri. Otu akwụkwọ kọwara otú e si eji okporo papaịrọs emepụta akwụkwọ e ji ede ihe. Akwụkwọ ahụ sịrị: “Okporo papaịrọs na-adị ihe dị ka mita atọ n’ogologo. E gbute ya, a na-ekpepụsị azụ ya ma kpọwasịa ya ogologo ogologo. Ihe a na-emezi bụ ido ha n’ahịrị, e were otu a tụkwasị ya n’elu ibe ya. A na-edebe ụfọdụ okporo ndị ahụ ogologo ogologo, debe ndị nke ọzọ uhie uhie. A na-ejizi nnukwu osisi dị ka hama na-akụ okporo ndị ahụ ruo mgbe ha dị mbadamba ka akwụkwọ. E mechazie, e were ihe kpụchasịa elu ya.”
Ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie ahụla ọtụtụ akwụkwọ ndị e ji papaịrọs mee n’oge ochie. Ha hụrụ ha n’Ijipt nakwa n’ebe ndị dị nso n’osimiri a na-akpọ Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ụfọdụ akwụkwọ Baịbụl ndị a hụrụ n’ebe ndị ahụ bụ ndị e dere n’oge Jizọs nọ n’ụwa ma ọ bụdị tupu a mụọ ya. Ọ bụ papaịrọs ka e ji mee akwụkwọ ndị ahụ. Ọ dị ka ọ̀ bụkwa papaịrọs ka e ji mee akwụkwọ ndịozi Jizọs ji dee akwụkwọ ozi ndị dị na Baịbụl.
[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 11]
Spectrumphotofile/ photographersdirect.com
© FLPA/David Hosking/age fotostock