Ihe Ntecha Ndị E Nwere n’Oge Baịbụl
Ihe Ntecha Ndị E Nwere n’Oge Baịbụl
Mgbe nwaanyị sachara ahụ́, ọ na-ete mmanụ na-esi ísì ụtọ. O techaa ya, ọ na-emeghe otu igbe mara mma. Ihe ndị dị n’igbe ahụ bụ ụmụ obere ololo, ọkwá ndị e ji karama, ọdụ́ enyí ma ọ bụ nkume mee. Ihe ndị dị n’ime ha bụ mmanụ na sent dị iche iche ndị e ji bọlsọm, kadamom, sinamọn, frankinsens, mmanụ aṅụ, mea, na ihe ndị ọzọ mee.
Nwaanyị ahụ na-esikwa n’igbe ahụ wepụta ụdị ngaji, efere, na ọkwá dị iche iche. Ọ na-eji ha agwakọta ihe ntecha ndị ọ chọrọ ite n’ụbọchị ahụ. Ọ na-amalite ite ihe ndị ahụ o ji achọ onwe ya mma, ya na-ete ha, ya ana-ele onwe ya n’enyo e ji ọla nchara mee.
KEMGBE ụwa, ụmụ nwaanyị ejighị ịchọ onwe ha mma egwuri egwu. Ihe ndị e sere n’ili n’oge ochie na ndị e sere n’ahụ́ ájá nakwa ná nkume gosiri na ndị Mesopotemia na ndị Ijipt na-ete ihe ntecha n’oge ochie. Ụmụ nwaanyị ndị na-ete ihe ntecha n’oge a na-etejukarị ihe n’anya ka ha yie nke ụmụ nwaanyị ndị Ijipt oge ochie e sere ese tere.
Oleekwanụ maka ụmụ Izrel oge ochie? Hà tere ihe ntecha? Ya bụrụ otú ahụ, olee ụdị nke ha tere? N’eziokwu, e nweghị ihe e sere n’ili ma ọ bụ n’ahụ́ ájá nke gosiri na ụmụ nwaanyị Izrel tere ihe ntecha ma ọ bụ na ha eteghị. Ma ihe ndị e dere na Baịbụl nakwa ihe ụfọdụ e gwupụtara n’ala Izrel mere ka anyị ghọtatụ ma hà tere ma ọ bụ na ha eteghị.
Ihe Ndị E Ji Etinye Ihe Ntecha
E nweela ọtụtụ ihe ndị e gwupụtara n’ebe dị iche iche n’ala Izrel bụ́ ndị gosiri na e nwere sent na ihe ntecha n’Izrel oge ochie. Ụfọdụ n’ime ha bụ nkume e ji egwe ihe e ji eme ihe ntecha na ndị nke e ji agwakọta ha, nakwa ololo sent, mkpọ̀ alabasta e ji etinye mmanụ, na obere enyo e ji ọla nchara mee. E nwekwara otu ngaji e ji ọdụ́ enyí mee. A tụrụ igu nkwụ n’otu akụkụ ngaji ahụ, tụọkwa isi otu nwaanyị n’akụkụ ya nke ọzọ, nduru gbakwara isi nwaanyị ahụ gburugburu.
O yiri ka ụmụ nwaanyị ndị oké ozu hà na-ejikarị ihe dị ka okpokoro mbe ma ọ bụ okpokoro anụmanụ ndị ọzọ etinye ihe ntecha ha. E gwupụtara obere ngaji ndị e ji ọdụ́ ma ọ bụ osisi mee n’ebe dị iche iche n’Ijipt nakwa na Kenan. A na-eji ngaji ndị ahụ ete ihe ntecha. A tụrụ ụfọdụ ngaji ahụ ka ha yie ụmụ agbọghọ na-egwu mmiri. Ngaji ndị nke ọzọ makwara ezigbo mma n’ụdị nke ha. Ihe niile a na-egosi na ụmụ nwaanyị ejighị ite ihe etecha egwu egwu n’oge ahụ.
Ndị nke A Na-ete n’Anya
Na Baịbụl, aha otu n’ime ụmụ agbọghọ Job mụrụ bụ “Kerin-hapọk.” Ihe aha ahụ pụtara n’asụsụ Hibru bụ “Mpi Uri (Anya) Ojii,” ya bụ, mkpọ̀ ma ọ bụ ihe e ji etinye ihe ntecha ma ọ bụ uri anya. (Job 42:14) O nwere ike ịbụ maka na Kerin-hapọk mara mma mere e ji gụọ ya aha ahụ. Ma ọ ga-abụkwa na aha ahụ na-egosi na a na-ete ihe ntecha n’oge ahụ.
Ọ dị mma ịmara na ụmụ nwaanyị ndị Baịbụl kwuru na ha tejuru uri n’anya bụcha ụmụ nwaanyị ọjọọ. Otu n’ime ha bụ Jezibel. Mgbe Jeruselem nupụụrụ Jehova isi, ndị amụma bụ́ Jeremaya na Ezikiel ji obodo ahụ tụnyere nwaanyị 2 Ndị Eze 9:30; Jeremaya 4:30; Ezikiel 23:40) E gwupụtala ọtụtụ karama na mkpọ̀ ndị e ji nkume mee bụ́ ndị e tinyechara ụmụ irighiri ihe e ji ete uri n’anya. Otú ha si dị ọtụtụ na-egosi na ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị kwụsịrị ife Chineke, karịchaa, ndị si n’ezinụlọ ndị eze na ndị aka ji akụ̀, na-etejụkarị ihe n’anya, na-etekwa ihe ntecha ndị ọzọ.
na-akwa iko nke tejuru uri n’anya. (Mmanụ Na-esi Ísì Ụtọ E Ji Eje Ozi n’Ụlọ Nsọ na nke Ndị Mmadụ Ji Eme Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Izrel oge ochie na-eji mmanụ oliv emepụta ihe na-esi ísì ụtọ. Ha na-ejikwa ihe a na-esi ísì ụtọ ha mepụtara eme ihe dị iche iche. Akwụkwọ Ọpụpụ kwuru ihe dị iche iche e ji emepụta mmanụ na-esi ísì ụtọ ndị nchụàjà na-eji ejere Chineke ozi n’ụlọ nsọ. Ihe ndị a na-agwakọta ma a chọọ imepụta mmanụ ahụ bụ sinamọn, mea, na osisi ndị ọzọ na-esi ísì ụtọ. (Ọpụpụ 30:22-25) Na Jeruselem, ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie ahụla ihe ha chere na ọ bụ ụlọ ọrụ ebe a na-emepụta ihe na-esi ísì ụtọ dị iche iche bụ́ ndị e ji eje ozi n’ụlọ nsọ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga. E nwere ọtụtụ ebe e kwuru na Baịbụl banyere mmanụ na-esi ísì ụtọ, ma ndị nke e ji eje ozi n’ụlọ nsọ ma ndị nke ndị mmadụ ji eme ihe ndị ọzọ.—2 Ihe E Mere 16:14; Luk 7:37-46; 23:56.
Rut 3:3; 2 Samuel 12:20) Tupu nwa agbọghọ Juu aha ya bụ Esta agakwuru Eze Ahazuirọs, e bu ụzọ jiri mmanụ e ji mea mee hịa ya aka n’ahụ́ ruo ọnwa isii, teekwa ya mmanụ bọlsọm n’ahụ́ ruo ọnwa isii.—Esta 2:12.
Ebe ọ bụ na ọ na-esiri ndị mmadụ ike inweta mmiri n’Izrel nakwa n’obodo ndị gbara ya gburugburu n’oge ochie, ha na-ejikarị mmanụ na-esi ísì ụtọ enyekwuru onwe ha aka ka ha na-adị ọcha. Ihe mere ha ji ete mmanụ abụghị naanị ka oké anwụ na-acha n’obodo ha ghara imebi akpụkpọ ahụ́ ha, ha na-etekwa ya ka ha dị mma n’anya, ahụ́ ha ana-akwọkwa mụrụmụrụ. (E jighị ihe na-esi ísì ụtọ na mmanụ na-esi ísì ụtọ egwuri egwu n’oge ahụ. E weere ya otú e si were ọlacha na ọlaedo. Mgbe eze nwaanyị Shiba si n’obodo ya bịa ileta Eze Sọlọmọn, onyinye pụrụ iche ndị o nyere ya bụ ọlaedo, nkume ndị dị oké ọnụ ahịa, na mmanụ bọlsọm. (1 Ndị Eze 10:2, 10) Mgbe ndị nnọchianya eze Babịlọn si Babịlọn bịa ileta Hezekaya bụ́ eze Juda, o gosiri ha akụ̀ ndị dị n’ụlọ ya. “Mmanụ bọlsọm na ezigbo mmanụ,” ọlaọcha, ọlaedo, na ngwá agha ya niile socha n’ihe ndị o gosiri ha.—Aịzaya 39:1, 2.
Ebe ọ bụ na sent ma ọ bụ mmanụ na-esi ísì ụtọ na-agbapụta n’okooko osisi, mkpụrụ osisi, mkpá akwụkwọ, na ụgbụgbọ osisi anaghị ebu ibu, sent na mmanụ na-esi ísì ụtọ na-adị oké ọnụ ahịa. E nwere ọtụtụ ahịhịa na osisi na-esi ísì ụtọ a kpọrọ aha na Baịbụl nakwa ihe ụfọdụ e ji ha mepụta. Ụfọdụ n’ime ha bụ alo, bọlsọm, esó deliọm, kalamọs, osisi kashịa, sinamọn, frankinsens, mea, safrọn, na spaịknad. A na-enweta ụfọdụ n’ime ha ná Ndagwurugwu Osimiri Jọdan. Ma a na-esi n’India, ebe ndịda Arebia, nakwa n’ebe ndị ọzọ enweta ụfọdụ n’ime ha. N’oge ahụ, e nwere ụzọ a ma ama ndị ahịa na-esi ebubata ihe ndị a na-esi ísì ụtọ.
Mmanụ Bọlsọm A Na-amaghị Otú Ọ Dị
Dị ka anyị kwuburu, a kpọrọ mmanụ bọlsọm aha na Baịbụl mgbe a na-akọ banyere Esta, eze nwaanyị Shiba, na Eze Hezekaya. N’afọ 1988, a hụrụ obere iko a gbanyere mmanụ na ya n’otu ọgba dị nso n’obodo Kumran. Obodo Kumran dị n’ebe ọdịda anyanwụ nke ụsọ oké osimiri a na-akpọ Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ. Ndị mmadụ kwuru ọtụtụ ihe mgbe a hụrụ iko mmanụ ahụ. Mmanụ ahụ ọ̀ bụ mmanụ bọlsọm ikpeazụ fọrọnụ? O dobeghị ndị ọkachamara anya. Ndị na-akụ osisi n’oge a ka na-agbalị ike ha niile ka ha mara ma hà ga-enwe ike ịkụ osisi bọlsọm ka o bidokwa wuwe otú o si wuo n’oge ochie.
E nwere ihe ndị gosiri na a na-akụ osisi e si na ya enweta mmanụ bọlsọm n’akụkụ obodo En-gidaị. Ndị na-egwupụta ihe n’ala ahụla ngwá ọrụ ndị dị ka ekwú, iko, na ihe dị iche iche e ji ígwè na ọkpụkpụ mee n’obodo ahụ. Ngwá ọrụ ndị a yikwara ndị nke e ji emepụta sent bụ́ ndị a hụkwara n’ebe ndị ọzọ. A rụrụ ngwá ọrụ ndị ahụ e gwupụtara n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ isii gara aga. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na ebe mbụ e si nweta osisi bọlsọm bụ n’Arebia ma ọ bụ Afrịka. Ọ bụ mmiri na-agbapụta na ya ka e si enweta ísì ụtọ ya. Mmanụ bọlsọm na-adị oké ọnụ nke na ndị ma otú e si akụ osisi ya na otú e si emepụta mmanụ ya anaghị ekwe agwa ya ndị ọzọ.
Ndị ọchịchị na-eji mmanụ bọlsọm enweta ihe ụfọdụ dị ha oké mkpa ha chọrọ inweta. Dị ka ihe atụ, ọkọ ọkụkọ ihe mere eme aha ya bụ Josifọs kwuru na Mak Antoni zụtara ubi ebe a kụjuru osisi bọlsọm na ya ma nye ya eze nwaanyị ndị Ijipt bụ́ Kliopatra. Onye Rom bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Plini kwuru na mgbe ndị Juu na ndị Rom na-alụ agha n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, ndị agha Juu fopụsịrị osisi bọlsọm niile ha nwere ka ndị agha Rom ghara iwere osisi ndị ahụ ma ha merie ha.
Ihe ndị Baịbụl kwuru na ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọpụtara enyerela anyị aka ịghọtatụ otú ndị mmadụ si ete ihe ntecha n’oge a na-ede Baịbụl. Baịbụl ekwughị na mmadụ ite ihe ntecha na iji ihe ndị ọzọ chọọ onwe ya mma bụ ihe ọjọọ, kama o kwusịrị ike na e kwesịrị imeru ya n’ókè. (1 Timoti 2:9) Pita onyeozi kwukwara na ihe “bara uru nke ukwuu n’anya Chineke” bụ mmadụ inwe “mmụọ dị jụụ, nke dịkwa nwayọọ.” O doro anya na Ndị Kraịst bụ́ nwaanyị, ma ụmụ agbọghọ ma ndị katarala ahụ́, kwesịrị ịnabata ndụmọdụ a ebe ọ bụ na anyị bi n’ụwa ebe ọ na-abụ ejiji nke a wuo taa, ọzọ ewuo echi.—1 Pita 3:3, 4.
[Foto dị na peeji nke 25]
Ihe ịchọ mma ndị a na-ete n’anya, na ndị a na-ete n’ihu, nakwa n’ahụ́ so n’ihe ụfọdụ ụmụ nwaanyị ji achọ onwe ha mma n’oge a na-ede Baịbụl
[Foto dị na peeji nke 25]
Ihe e ji ụrọ mee nke a na-etinye ihe ntecha na ya n’Izrel
[Foto dị na peeji nke 25]
Udu e ji ụrọ mee nke a na-agbanye ihe na-esi ísì ụtọ n’Izrel
[Foto dị na peeji nke 25]
Ihe e ji ọdụ́ enyí mee nke a na-etinye ihe ntecha na ya n’Izrel
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 25]
All artifacts: Erich Lessing/Art Resource, NY