BỊARUO CHINEKE NSO
Ọ ‘Na-enye Anyị Nri n’Ụba’
Jehova ọ̀ na-eche banyere anyị n’eziokwu, ka ọ̀ bụ na ọ chọghị ịma banyere ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata? Otú Baịbụl si zaa ajụjụ a na-eme ka obi tọọ anyị ụtọ. Chineke na-eche banyere ụmụ mmadụ. Ọ chọkwara ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ. Kwa ụbọchị, Chineke na-emere mmadụ niile ọtụtụ ihe ọma, ma ndị na-achọdịghị ife ya. Ka anyị leba anya n’ihe Pọl onyeozi kwuru.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:16, 17.
Mgbe Pọl na-agwa ndị Listra okwu, bụ́ ndị na-anaghị efe Chineke, ọ sịrị ha: “N’ọgbọ ndị gara aga, [Chineke] kwere ka ndị mba ọzọ niile nọgide na-eje ije n’ụzọ ha, ọ bụ ezie na ọ hapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma, na-enye unu mmiri ozuzo site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enyekwa unu nri n’ụba, na-emekwa ka unu nwee obi ụtọ.” Olee ihe ndị Listra ghọtara Pọl na-ekwu?
Ndị Listra ma na ihe a Pọl kwuru bụ eziokwu. Ha bụ ndị ọrụ ubi, ala ha na-emekwa nri nke ọma n’ihi na mmiri na-ede ala ha. Ma, Pọl chetaara ha na ọ bụ Chineke na-eme ka mmiri na-ezo, na-emekwa ka mkpụrụ na-amị. Ihe Pọl na-ekwu bụ na mgbe ọ bụla ha wetara ihe ha kụrụ n’ubi ma rie ezigbo nri, ọ bụ Chineke nyere ha ya.
lhe Pọl gwara ndị Listra na-akụziri anyị ọtụtụ ihe banyere Jehova Chineke.
Jehova kere anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Buru n’obi na Jehova kwere ka ndị Jentaịl “na-eje ije n’ụzọ ha.” Otu akwụkwọ nke na-enyere ndị na-asụgharị Baịbụl aka kwuru na ihe ihe a Pọl kwuru, ya bụ, ‘ka ha na-eje ije n’ụzọ ha’ pụtara bụ “ka ha na-eme otú masịrị ha” ma ọ bụ “ka ha na-eme ihe ọ bụla ha chere dị ha mma.” Jehova enweghị onye ọ na-amanye ka o fee ya. O kere anyị ka anyị jiri aka anyị na-ahọrọ ihe anyị ga-eme, ya bụ, ka anyị họrọ ụdị ndụ anyị ga-ebi.—Diuterọnọmi 30:19.
Jehova chọrọ ka anyị mata onye ọ bụ. Pọl kwuru na Jehova ahapụghị “onwe ya n’enweghị ihe àmà.” Akwụkwọ ahụ na-enyere ndị na-asụgharị Baịbụl aka kwuru na otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ihe a Pọl kwuru bụ “o meela ka ndị mmadụ ghọtazie ụdị Chineke ọ bụ.” Ihe ndị Chineke kere na-eme ka anyị mata “àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya,” ya bụ, obiọma ya, amamihe ya, ike ya na ịhụnanya ya. (Ndị Rom 1:20) Jehova emeela ka anyị mata ọtụtụ ihe banyere onwe ya na Baịbụl. (2 Timoti 3:16, 17) Nke a ó gosighị na Chineke chọrọ ka anyị mata onye ọ bụ?
Kwa ụbọchị, Chineke na-emere mmadụ niile ọtụtụ ihe ọma, ma ndị na-achọdịghị ife ya
Jehova chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. Pọl kwuru na Chineke ‘na-enye anyị nri n’ụba, na-emekwa ka anyị nwee obi ụtọ.’ Onye ajọ omume nke na-ekwedịghị na Jehova dị nwedịrị ike iriju nri afọ ma nwetatụ obi ụtọ ná ndụ. Ma, Chineke chọrọ ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ mgbe niile. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enwe ụdị obi ụtọ a, anyị kwesịrị ịmụta eziokwu banyere Chineke ma na-emekwa ihe anyị mụtara.—Abụ Ọma 144:15; Matiu 5:3.
Jehova na-emere anyị ihe ọma kwa ụbọchị. Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụtakwuo otú i nwere ike isi na-ekele Chineke bụ́ ‘onye na-enye anyị nri n’ụba, na-emekwa ka anyị nwee obi ụtọ’?
Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Julaị: