Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 BỊARUO CHINEKE NSO

“Onye Na-akwụ Ndị Na-achọsi Ya Ike Ụgwọ Ọrụ”

“Onye Na-akwụ Ndị Na-achọsi Ya Ike Ụgwọ Ọrụ”

Jehova ò ji mbọ ndị na-efe ya na-agba ka ha na-eme ihe dị ya mma kpọrọ ihe? Ụfọdụ ndị nwere ike ịsị na azịza ajụjụ a bụ mba ma kwuo na Chineke enweghị mmasị n’ebe anyị nọ. Ihe a ha na-ekwu na-eme ka ndị mmadụ ghara ịghọta ụdị onye Chineke bụ. Ma, Okwu ya, bụ́ Baịbụl, na-eme ka anyị ghọta nke bụ́ eziokwu. Ihe Baịbụl kwuru na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ejighị mbọ ndị na-efe ya na-agba egwuri egwu. Ka anyị leba anya n’ihe Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Hibru 11:6.

Gịnị ka anyị ga na-eme ka obi dị Jehova mma? Pọl dere, sị: ‘Ọ bụrụ na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị Chineke ezi mma.’ Ị̀ hụrụ na Pọl ekwughị na ọ ga-esiri mmadụ ike ime ihe dị Chineke mma ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe? Kama o kwuru na ọ gaghị ekwe onye ahụ omume. Ihe nke a pụtara bụ na okwukwe so n’ihe dị mkpa ga-eme ka Chineke nabata ofufe anyị.

Ma olee ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị dị Jehova mma? Ọ dị ụzọ ihe abụọ. Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị “ikwere na ọ dị adị.” Ò nwere otú ihe anyị na-eme ga-esi adị Chineke mma ma ọ bụrụ na anyị ekwetaghị na ọ dị adị? Ma, ọ bụghị ikwere na Chineke ka okwu biri n’ihi na ndị mmụọ ọjọọ kwedịrị na Jehova dị. (Jems 2:19) Kama okwukwe anyị kwesịrị ime ka anyị na-ebi ndụ otú ga-eme ka obi dị Chineke mma.—Jems 2:20, 26.

Nke abụọ bụ na anyị kwesịrị ‘ikwere na Chineke na-akwụ ndị na-efe ya ụgwọ ọrụ.’ Obi siri onye nwere ezigbo okwukwe ike na mbọ niile ọ na-agba ka o mee ihe dị Chineke mma agaghị efu ọhịa. (1 Ndị Kọrịnt 15:58) Ànyị ga-achọ ime ihe dị Jehova mma ma ọ bụrụ na obi esighị anyị ike na ọ ga-akwụ anyị ụgwọ ọrụ? (Jems 1:17; 1 Pita 5:7) Ọ bụrụ na mmadụ ekwuo na Chineke ahụghị ụmụ mmadụ n’anya, na ọ dị aka ntagide ma ọ bụ na mbọ niile ndị na-efe ya na-agba anaghị emetụ ya n’obi, ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ amaghị onye Chineke ahụ a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl bụ.

Olee ndị Jehova na-akwụ ụgwọ ọrụ? Pọl sịrị na ọ bụ “ndị na-achọsi ya ike.” Otu akwụkwọ na-enyere ndị na-asụgharị Baịbụl aka kwuru na okwu Grik a sụgharịrị “na-achọsi ya ike” apụtaghị “ịga chọgharịwa Chineke.” Kama, ọ pụtara mmadụ ịgba mbọ ‘na-efe Chineke.’ Akwụkwọ ọzọ kwuru na okwu Grik a pụtara mmadụ ịgbalịsi ike mee ihe ma legide anya n’ihe ahụ ọ na-eme. N’eziokwu, Jehova na-akwụ ndị niile nwere okwukwe n’ebe ọ nọ ụgwọ, bụ́ ndị ji obi ha dum hụ ya n’anya ma na-efe ya.—Matiu 22:37.

Ànyị ga-achọ ime ihe dị Jehova mma ma ọ bụrụ na obi esighị anyị ike na ọ ga-akwụ anyị ụgwọ ọrụ?

Olee ụgwọ ọrụ Jehova ga-akwụ ndị na-efe ya? O kwere ha nkwa na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. Nkwa ọma a o kwere gosiri na ọ na-emesapụ aka ma hụ anyị n’anya nke ukwuu. (Mkpughe 21:3, 4) O nwedịrị ọtụtụ uru ndị na-achọsi Jehova ike na-erite ugbu a. Mmụọ nsọ Chineke na ihe ndị ha na-amụta na Baịbụl na-eme ka obi na-atọ ha ụtọ, meekwa ka ndụ ha baa ezigbo uru.—Abụ Ọma 144:15; Matiu 5:3.

N’eziokwu, Jehova ji ofufe nke ndị ji obi ha niile na-efe ya kpọrọ ihe. Ọ̀ bụ na nke a ekwesịghị ime ka ị gbalịa ka gị na ya dịkwuo ná mma? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-adị mma ka ị mụtakwuo ihe ị ga-eme ka okwukwe gị sie ike, ka Jehova wee gọzie gị.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Nọvemba

Taịtọs 1-3; Faịlimọn 1-25; Ndị Hibru 1-13Jems 1-5