ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE CHINEKE MEERE GỊ
Ihe Ị Na-ekwesịghị Ikwe Ka Ọ Kwaa Gị
N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta àjà ọ ga-eji ndụ ya chụọ. O ji achịcha na-ekoghị eko na mmanya na-acha ọbara ọbara mee ihe a na-akpọ Nri Anyasị Ikpeazụ ma ọ bụ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.”—Luk 22:19.
N’afọ ọ bụla, Ndịàmà Jehova na-ezukọ n’ebe dị iche iche n’ụwa iji cheta ọnwụ Jizọs. N’afọ 2014, a ga-echeta ọnwụ Jizọs n’abalị iri na anọ nke ọnwa Eprel, mgbe anyanwụ dachara.
Anyị ji ohere a na-akpọ gị òkù ka ị bịa n’ebe Ndịàmà Jehova ga-ezukọ n’ụbọchị ahụ. N’ụbọchị ahụ, a ga-akọwa uru ọnwụ Jizọs baara ụmụ mmadụ. Ị gaghị akwụ ụgwọ tupu gị abata, o nweghịkwa onye ga-ana gị ego. Onyeàmà Jehova nke nyere gị magazin a ga-agwa gị ebe dị gị nso a ga-eme ya nakwa oge ọ ga-abụ. I nwekwara ike ịga na www.mt1130.com/ig ka ị mata ebe ga-adịrị gị nso. Biko, chọta otu ebe dee ya edee na ị chọrọ iso Ndịàmà Jehova zukọọ n’ụbọchị ahụ ka ị ghara ichefu ya n’ihi na anyị achọghị ka ọ kwaa gị.