ṄOMIE OKWUKWE HA | DEBORA
“M Biliri Dị Ka Nne n’Izrel”
N’ỤTỤTỤ otu ụbọchị, Debora lere ndị agha Izrel gbakọtara n’elu Ugwu Tebọ anya, obi atọọ ya ụtọ. Ọ nọ na-eche gbasara otú ndị agha ahụ si nwee obi ike na otú onye ndú ha bụ́ Berak si nwee okwukwe. Ọ bụ eziokwu na ha dị puku ndị ikom iri, ihe ha ga-eme ma ha hụ ndị ha na-aga ịlụso agha taa ga-egosi ma hà nwere okwukwe na obi ike n’eziokwu. Ndị ha na-aga ịlụso agha kagburu ha akagbu ma n’ọnụ ọgụgụ ma n’inwe ngwá agha. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, okwu Debora gwara ha mere ka ha kata obi bịa ịlụso ndị iro ha agha.
Weregodị ya na ị na-ahụ Debora na Berak ka ha guzo n’ọnụ ọnụ Ugwu Tebọ na-elepụ anya, ikuku ana-ebugharị uwe Debora. Elu ugwu ahụ dị larịị. Ugwu ahụ dịkwa ihe dị ka narị mita anọ n’ịdị elu. Ị nọrọ n’elu ugwu ahụ, ị ga na-ahụ ndagwurugwu Esdraelon nke ọma. Ị ga na-ahụkwa Osimiri Kaịshọn nke na-esi n’ala ahịhịa juru sọrọ na-aga n’Osimiri Ukwu nke dị nso n’Ugwu Kamel. N’ụtụtụ ụbọchị a, ọ ga-abụ na mmiri dị n’Osimiri Kaịshọn ataala. Ma, Sisera na ndị agha ya ji ọkpọka ngwá agha ha na-egbuke egbuke na-abịa. Ha ji narị ụgbọ ịnyịnya agha itoolu ndị nwere mma. E nweghị ụgbọ ịnyịnya agha dị ka ha. Ebe ọ bụ na ndị agha Izrel enweghị ọkpọka ngwá agha, Sisera bu n’obi ịsụ ha akwụ.
Debora ma na Berak na ndị agha ya na-eche ka ọ sị ha gawa. Ma, ọ̀ bụ ya bụ naanị nwaanyị nọ ebe ahụ? Olee otú o si were nnukwu ọrụ a Jehova nyere ya ịgwa ndị agha Izrel ihe ha ga-eme? Ọ̀ nọ na-eche ihe ọ nọ ebe ahụ eme? O doro anya na o cheghị ụdị ihe ahụ. Jehova, bụ́ Chineke ya, agwala ya ka ọ gaa agha ahụ. Ọ gwakwara ya na ọ bụ nwaanyị ka ọ ga-eji merie ndị ha na-aga ịlụso agha. (Ndị Ikpe 4:9) Olee ihe anyị ga-amụta n’aka Debora na ndị agha a gbasara inwe okwukwe?
“GAA GBASAA ONWE GỊ N’UGWU TEBỌ”
Mgbe mbụ Baịbụl kwuru gbasara Debora, a kpọrọ ya “onye amụma nwaanyị.” Aha a e turu ya gosiri na ọ na-arụ ọrụ pụrụ iche. Ma, ọ bụghị naanị ya bụ nwaanyị Baịbụl kwuru rụrụ ụdị ọrụ a. * E nwere ọrụ ọzọ Debora rụrụ. Ọ na-ekpere ndị Izrel ikpe, na-agwa ha ihe Jehova chọrọ ka ha mee ma ha na ibe ha see okwu.—Ndị Ikpe 4:4, 5.
Debora bi n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu, nke dị n’agbata Betel na Rema. Ọ na-anọkarị n’okpuru nkwụ, na-arụrụ ụmụ Izrel ọrụ Jehova gwara ya ka ọ rụọ. N’eziokwu, ọrụ ya abụghị obere ọrụ. Ma, o kweghị ka ọrụ ahụ gwụ ya ike. Ọrụ a ọ na-arụ dị ezigbo mkpa. O mechadịrị soro ná ndị si n’ike mmụọ nsọ rọọ abụ. N’abụ ahụ, o kwuru banyere oge ụmụ Izrel nupụụrụ Chineke isi. Ọ sịrị: “Ha wee họrọ chi ọhụrụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka agha dara n’ọnụ ụzọ ámá.” (Ndị Ikpe 5:8) Ebe ọ bụ na ndị Izrel hapụrụ Jehova fewe chi ndị ọzọ, Jehova hapụrụ ha ka ndị iro ha na-emegbu ha. Eze Kenan aha ya bụ Jebin ji ọchịagha ya bụ́ Sisera na-echi ụmụ Izrel ọnụ n’ala.
Ọ na-abụ ụmụ Izrel nụ na Sisera na-abịa, obi awụnye ha n’afọ. Omenala ndị Kenan na otú ha si efe chi ha jọgburu onwe ya. Ha na-eji ụmụ ha Ndị Ikpe 5:6, 7) Weregodị ya na ị na-ahụ ka ndị Izrel na-ezo n’ọhịa na n’ugwu. Ụjọ ịpụta kọọ ugbo na ụjọ ibi n’obodo na-enweghị mgbidi na-atụ ha. Ụjọ anaghịkwa ekwe ha si n’okporo ụzọ gaa ebe ha chọrọ ịga ka a ghara ịwakpo ha, kpọnara ha ụmụaka ha ma dinaa ụmụ nwaanyị ha n’ike. *
achụ àjà, na-agbakwa akwụna n’ụlọ arụsị ha. Olee otú ihe dịịrị ndị Izrel ebe ọ bụ na ha nọ n’okpuru onyeisi ndị agha Kenan na ndị agha ya? Abụ Debora gosiri na ime njem adịghịziri ndị Izrel mfe nakwa na obodo dị iche iche n’Izrel tọgbọzi chakoo. (Ndị Kenan chiri ndị Izrel a na-enupụ isi ọnụ n’ala ruo afọ iri abụọ, ruo mgbe Jehova hụrụ na ha adịla njikere ịgbanwe. Ma ọ bụkwanụ, dị ka Debora na Berak bụrụ n’abụ, sị, “Ruo mgbe mụ onwe m, bụ́ Debora, biliri, ruo mgbe m biliri dị ka nne n’Izrel.” Anyị amaghị ma Debora nwunye Lapidọt ọ̀ mụrụ nwa. Ma, ihe mere e ji kpọọ ya nne bụ na Jehova nyere ya ọrụ ilekọta ụmụ Izrel otú nne si elekọta ụmụ ya. Ọ gwara ya ka o zie Berak Onyeikpe, bụ́ nwoke nwere okwukwe, ka ọ gaa lụso Sisera agha.—Ndị Ikpe 4:3, 6, 7; 5:7.
Jehova gwara Debora ka ọ gwa Berak ka ọ ‘gaa gbasaa onwe ya n’Ugwu Tebọ’ nakwa ka o si n’ebo abụọ n’Izrel kpọrọ puku ụmụ nwoke iri ga-eso ya. Debora gwara ha na Chineke kwere nkwa na ya ga-eme ka ha merie Sisera, bụ́ nwoke siri ezigbo ike, na narị ụgbọ ịnyịnya agha itoolu ya na ìgwè ndị agha ya. O doro anya na nkwa a Chineke kwere riri Berak ọnụ. Ụmụ Izrel enweghị ndị agha a zụrụ azụ, ngwá agha ha ehighịkwa nne. Ma, Berak kwetara na ya ga-aga agha ahụ ma ọ bụrụ na Debora ga-eso ha gaa n’Ugwu Tebọ.—Ndị Ikpe 4:6-8; 5:6-8.
Ụfọdụ ndị ekwuola na ihe mere Berak ji gwa Debora ka o soro ha bụ n’ihi na o nweghị okwukwe. Ma ọ bụghị eziokwu. A sị ka e kwuwe, ọ rịọghị Chineke ka o nyekwuo ha ngwá agha. Kama, okwukwe o nwere nyeere ya aka ịghọta na ọ bụrụ na onye nnọchianya Jehova anọrọ n’etiti ya na ndị agha ya, ọ ga-eme ka obi sikwuo ha ike. (Ndị Hibru 11:32, 33) Jehova meere Berak ihe ahụ ọ rịọrọ. O kwere ka Debora soro ha gaa. Ma, Jehova sikwa n’ọnụ Debora kwuo na ọ bụghị nwoke ga-enweta otuto n’agha ahụ ha ga-aga. (Ndị Ikpe 4:9) Chineke ekpebiela na ọ bụ nwaanyị ga-egbu nwoke ọjọọ a bụ́ Sisera.
N’ụwa taa, a na-emegbu ụmụ nwaanyị, na-eti ha ihe, na-akparị ha, na-emetọkwa ha. Ọtụtụ ndị anaghị akwanyere ha ùgwù otú Chineke chọrọ. Ma, n’anya Chineke, nwoke na nwaanyị bachara uru, Ndị Rom 2:11; Ndị Galeshia 3:28) Ọrụ pụrụ iche Chineke nyere Debora gosiri na ọ tụkwasịrị ụmụ nwaanyị obi, na-akwanyere ha ùgwù, na-emekwara ha amara. Ọtụtụ ndị taa na-eleda ụmụ nwaanyị anya. Ma, anyị ekwesịtụghị ime ka ha.
o nweghị onye nke bara uru karịa ibe ya, o nweghịkwa onye nke o ji kpọrọ ihe karịa ibe ya. (“ALA MARA JIJIJI, MMIRI SIKWA N’ELUIGWE ZOO”
Berak gawara ịkpọkọta ndị agha ya. Ọ kpọkọtara puku ụmụ nwoke iri ndị obi siri ike ịga lụso ndị agha Sisera agha n’agbanyeghị na ndị agha a siri ezigbo ike. Ka Berak du ndị agha ya na-aga n’Ugwu Tebọ, obi dị ya ụtọ na e nwere ihe ga-eme ka obi sikwuo ha ike. Baịbụl gwara anyị, sị: “Debora sokwa ha gbagoo.” (Ndị Ikpe 4:10) Chegodị otú obi ga-adị ndị agha Berak ịhụ na nwaanyị ahụ obi kara so ha na-aga n’Ugwu Tebọ, dịkwa njikere ime ihe nwere ike ịta isi ya n’ihi okwukwe o nwere n’ebe Jehova Chineke nọ.
Sisera mere ihe ozugbo ọ nụrụ na ụmụ Izrel ejikerela ịlụso ya agha. Ọtụtụ ndị eze Kenan ndị ọzọ sonyeere Eze Jebin bịa ịlụ agha a. Ọ dị ka ọ̀ bụ ya kacha ha niile ike. Otú ndị agha Sisera na ụgbọ ịnyịnya agha ha si wụrụ na-abịa mere ka ebe niile na-ama jijiji. N’obi ndị Kenan, ha ga-ememila ndị agha Izrel a na-enweghị ngwá agha n’otu ntabi anya.—Ndị Ikpe 4:12, 13; 5:19.
Gịnị ka Berak na Debora ga-eme ugbu a ndị iro ha rutewere nso? Ọ bụrụ na ndị agha Izrel anọrọ na ndagwurugwu Ugwu Tebọ lụso ndị Kenan agha, ha nwere ike imeri ha, n’ihi na ọ bụ n’ala dị larịị ka ndị agha ji ụgbọ ịnyịnya agha na-aka akpa ike. Ma, Berak chọrọ ịlụ agha a otú Jehova chọrọ. Ọ bụ ya mere o ji chere ka ọ nụ ihe Debora ga-agwa ya. Debora mechakwara gwa ya ihe ọ ga-eme. Ọ gwara ya, sị: “Bilie, n’ihi na taa ka Jehova ga-enyefe Sisera n’aka gị. Ọ́ bụghị Jehova buteere gị ụzọ?” Baịbụl kwukwara, sị: “Berak wee si n’Ugwu Tebọ gbadaa, ya na puku ndị ikom iri so ya.”—Ndị Ikpe 4:14. *
Ndị agha Izrel si n’ugwu ahụ gbadaa n’ala ahụ dị larịị, chụrụ ndị agha ahụ ji ọkpọka ngwá agha gawa. Jehova ò buteere ha ụzọ dị ka Debora kwuru? Jehova egbughị oge ọ bụla. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ala mara jijiji, mmiri sikwa n’eluigwe zoo.” Ndị agha Sisera dị́ mpako amaghị ihe ha ga-eme eme. Mmiri zosiwere ike nke na e nwere ike ịsị na mmiri bịara tojuo ebe niile n’otu ntabi anya. O teghị aka, ha enwelighịzi ike iji ụgbọ ịnyịnya agha ha na ngwá agha ha lụọ agha. Ha mikpuru n’apịtị.—Ndị Ikpe 4:14, 15; 5:4.
Ma, oké mmiri ozuzo ahụ enyeghị Berak na ndị agha ya nsogbu n’obi. Ha ma na Jehova ji ya na-alụrụ ha agha. Ha chụụrụ ndị agha Kenan gawa. O nweghị onye ọ bụla n’ime ndị agha ahụ ha hapụrụ ndụ dị ka Jehova gwara ha. Iyi Kaịshọn tojuru, sọpụta, sọrọ ozu ndị agha ahụ sọba n’Osimiri Ukwu.—Ndị Ikpe 4:16; 5:21.
Jehova anaghịzi edunye ndị ohu ya agha nkịtị. Ma, ọ gwara ha ka ha na-alụso Setan ọgụ. (Matiu 26:52; 2 Ndị Kọrịnt 10:4) Otú anyị si alụso Setan ọgụ taa bụ ịna-erubere Chineke isi. Anyị kwesịrị ịna-akata obi n’ihi na mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ na-abịara ndị na-erubere Chineke isi. Ma Jehova agbanwebeghị. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’ebe ọ nọ ma tụkwasị ya obi, ọ ga-agbatara anyị ọsọ enyemaka dị ka ọ gbataara Debora, Berak, na ndị agha Izrel ahụ obi kara.
“ONYE A GỌZIRI AGỌZI KARỊSỊA, N’IME NDỊ INYOM”
Onye obi kacha fee azụ ná ndị agha ndị Kenan gbanahụrụ ndị agha Izrel. Ọ bụ Sisera, onye kacha emegbu ndị Chineke. O ji ụkwụ si n’ihu agha rie mbọ mbọ. Ọ chọghị ịma ma ndị agha ya tọrọ n’apịtị hà ga-adị ndụ ka hà ga-anwụ anwụ. O si n’etiti ndị agha ụmụ Izrel mịpụ, si n’ebe ahụ apịtị dị gbapụ, gbara gawa n’ebe kacha nso o chere na ya ga-anọ zere isi ya. Ọ gbara ezigbo ọsọ gbafere ebe ndị mmadụ nwere ike ịhụ ya, na-atụ ezigbo ụjọ na aka ndị agha Izrel nwere ike ịkpara ya. Ọ gbagara n’ụlọikwuu Hiba. Hiba bụ onye Kenaịt kewapụrụ onwe ya n’ebe ndị Kenaịt ibe ya nọ ma mee ka ya na Eze Jebin dịrị n’udo.—Ndị Ikpe 4:11, 17.
Mgbe Sisera na-erutela na nke Hiba, ezigbo ike agwụla ya. Ọ chọpụtara na Hiba anọghị n’ụlọ. Ma,
Jeel nwunye Hiba nọ ya. Ọ ga-abụ na Sisera chere na o nweghị ihe Jeel ga-eme ya ebe di ya na Eze Jebin dị ná mma. O nwekwara ike ịbụ na o cheghị na nwaanyị ga-echetụdị n’echiche ime ihe di ya na-agaghị achọ ime. O doro anya na Sisera amaghị ụdị onye Jeel bụ. Jeel ejirila anya ya hụ otú ndị Kenan obi fere azụ si emegbu ndị mmadụ. Ọ ga-abụkwa na ọ ma na o nwere ihe o kwesịrị ime ugbu a. O nwere ike ịzọ nwoke ọjọọ a ndụ ma ọ bụkwanụ gosi na ya kwụ n’akụkụ Jehova ma gbuo nwoke a bụ́ onye iro ndị Chineke. Olee nke ọ ga-eme eme? Olee otú nwaanyị ga-esi egbu onye agha a bụ́ a kwaa akwụrụ?Jeel chetara ihe ọ ga-eme ozugbo. O gosiri Sisera ebe ọ ga-anọ zuru ike. Sisera gwara ya ka ọ ghara ịgwa onye ọ bụla na-achọ ya na ya nọ ebe ahụ. Mgbe o dinara ala, Jeel ji ákwà kpuchie ya. Mgbe ọ gwara Jeel ka o kunyetụ ya mmiri, o nyere ya mmiri ara ehi. Obere oge, ezigbo ụra eburu Sisera. Jeel ewerezie mkpọ́ ụlọikwuu na hama, bụ́ ngwá ụlọ ụmụ nwaanyị ndị bi n’ụlọikwuu ma otú e si eji ha arụ ọrụ, jiri nwayọọ gbere igbe rute nso n’ebe Sisera dowere isi. Oge eruola ka o gbuo onye Jehova chọrọ ka e gbuo. O mewe ya obi abụọ ugbu a, ma ọ bụ, ya gbutụ oge, o nwere ike ịta isi ya. Ọ̀ ga-abụ na o chetara otú nwoke a sirila mekpọọ ndị Chineke ọnụ kemgbe ọtụtụ afọ? Ka ọ̀ ga-abụ na o chewere nnukwu ihe ọma meere ya ma o mee Jehova obi ụtọ? Baịbụl agwaghị anyị. Naanị ihe anyị ma bụ na o teghị aka, kpọtọkpọtọ agbaa n’ihu ehi, Jeel egbuo Sisera.—Ndị Ikpe 4:18-21; 5:24-27.
Berak mechara chọrọ Sisera rute n’ụlọ Hiba. Jeel gosiri ya ozu Sisera ebe mkpọ́ ahụ o ji gbuo ya ka dị n’agba ntị ya, ya amata na ihe ahụ Debora kwuru emezuola. Nwaanyị egbuola Sisera bụ́ dike n’agha. O nweghị ụdị aha ọjọọ ndị nkatọ na-akpọbeghị Jeel n’ihi ihe a o mere. Ma, Berak na Debora ma na ihe ahụ Jeel mere abụghị ihe ọjọọ. N’abụ ha si n’ike mmụọ nsọ rọọ, ha toro Jeel, sị na ọ bụ “onye a gọziri agọzi karịsịa, n’ime ndị inyom” n’ihi otú o si kata obi mee ihe o mere. (Ndị Ikpe 4:22; 5:24) Debora abịaghị mewere Jeel anyaụfụ. Kama, ihe bụ́ mkpa ya agwụla na okwu Jehova mezuru.
Ebe ọ bụ na Sisera anwụọla, Eze Jebin enweghịzi ike ime ụmụ Izrel ihe ọ bụla. Mmegbu ndị Kenan na-emegbu ụmụ Izrel emechaala kwụsị. Obi ruru ụmụ Izrel ala si mgbe ahụ ruo afọ iri anọ. (Ndị Ikpe 4:24; 5:31) Jehova gọziri Debora, Berak, na Jeel maka na ha nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe otú Debora nwere, kata obi na-eme ihe Jehova kwuru, ma na-agba ndị ọzọ ume ka ha mee otú ahụ, Jehova ga-eme ka anyị merie onye ọ bụla chọrọ ka anyị kwụsị ife ya, obi ga na-erukwa anyị ala mgbe niile.
^ para. 7 Ndị ọzọ bụ́ ndị amụma nwaanyị bụ Miriam, Họlda na nwunye Aịzaya.—Ọpụpụ 15:20; 2 Ndị Eze 22:14; Aịzaya 8:3.
^ para. 9 Abụ Debora gosiri na ụmụ nwaanyị so n’ihe nkwata Sisera na-ejikarị alọta n’agha. Mgbe ụfọdụ, ndị agha ya na-eketacha ihe karịrị otu nwaanyị n’ime ndị ọ kpọ lọta. Ihe a kpọrọ ụmụ nwaanyị ná Ndị Ikpe 5:30 bụ “akpa nwa.” Ihe a a kpọrọ ha gosiri na ndị Kenan weere na ụmụ nwaanyị ndị ahụ bara uru naanị n’ihi akụkụ ahụ́ ha e ji enwe mmekọahụ. O yikarịrị ka o nweghị ihe e ji idina nwaanyị n’ike kpọrọ na Kenan.
^ para. 17 A kọrọ akụkọ gbasara otú e si lụọ agha a ná Ndị Ikpe isi anọ, nakwa n’abụ Debora na Berak rọrọ n’isi nke ise. Ihe ụfọdụ a na-akọghị ná Ndị Ikpe isi anọ dị n’abụ ahụ dị n’isi nke ise, ndị nke na-adịghịkwa n’isi nke ise dị n’isi nke anọ.