Ànyị Ga-amatali Chineke?
“Anyị agaghị amatali Chineke.”—Ọ bụ Filo onye Alegzandria, bụ́ ọkà mmụta n’oge ndịozi Jizọs, kwuru ihe a.
“[Chineke anọghị] n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”—Sọl onye Tasọs gwara ndị ọkà mmụta nọ́ n’Atens ihe a n’oge ndịozi Jizọs.
OLEE onye i chere kwuru eziokwu n’ime mmadụ abụọ a? Ihe ahụ Sọl onye Tasọs, onye a na-akpọkwa Pọl onyeozi, kwuru na-eme ka obi sie ọtụtụ ndị ike na ha ga-amatali Chineke. (Ọrụ Ndịozi 17:26, 27) O nwere ọtụtụ ebe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ihe na-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-amatali Chineke. Dị ka ihe atụ, ihe Jizọs kwuru n’otu ekpere o kpere mere ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike na ha ga-amatali onye Chineke bụ, Chineke agọziekwa ha.—Jọn 17:3.
Ma, ndị ọkà mmụta dị́ ka Filo ekwetaghị na ọ bụ eziokwu. Ha kwuru na anyị agaghị amatali Chineke. Oleezi nke bụ́ eziokwu?
Baịbụl kwuru na e nwere ihe ụfọdụ gbasara Chineke ndị mmadụ na-agaghị amatali. Dị ka ihe atụ, anyị agaghị amatali afọ ole Chineke dị, otú ọ na-aghọtaru ihe, na otú ọ maruru ihe. N’eziokwu, mmadụ agaghị amatali ihe ndị a. Ma, ọ gaghị eme ka anyị ghara ịmata onye Chineke bụ. Ichebara ihe ndị ahụ echiche nwedịrị ike inyere anyị aka ‘ịbịaru Chineke nso.’ (Jems 4:8) Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ anyị na-agaghị amatali gbasara Chineke. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ụfọdụ anyị ga-amatali gbasara ya.
Olee Ihe Ndị Anyị Na-agaghị Amatali Gbasara Chineke?
AFỌ OLE CHINEKE DỊ: Baịbụl kwuru na Chineke dị “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 90:2) Ihe ọ pụtara bụ na Chineke enweghị mmalite, ọ gaghịkwa enwe ọgwụgwụ. Mmadụ chọọ ikwu ya, o nwere ike ịsị na “a pụghịkwa ịchọpụta afọ ndụ [Chineke].”—Job 36:26.
Uru ọ ga-abara gị: Chineke kwere nkwa na ị ga-adị ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na ị mata ya nke ọma. (Jọn 17:3) Chineke ọ̀ ga-emeli ihe a o kwuru ma ọ bụrụ na yanwa anaghị adị ndụ ebighị ebi? Ọ bụ naanị “Eze mgbe ebighị ebi” ga-emezuli nkwa a.—1 Timoti 1:17.
OTÚ CHINEKE NA-AGHỌTARU IHE: Baịbụl kwuru na ‘nghọta Chineke enweghị nchọpụta’ n’ihi na echiche ya dị elu karịa echiche anyị. (Aịzaya 40:28; 55:9) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji jụọ, sị: “Ònye maara uche Onyenwe anyị ka o zí Ya ihe?”—1 Ndị Kọrịnt 2:16, Bible Nsọ nke Union Version.
Uru ọ ga-abara gị: Chineke na-anụ ekpere ọtụtụ nde mmadụ nọ́ n’ebe dị iche iche kpere n’otu oge. (Abụ Ọma 65:2) Ọ na-ahụdị nza ọ bụla dara n’ala. Ò nwere mgbe a ga-asị na isi Chineke ejula, o nweghịzi ike ịma gbasara gị ma ọ bụ ịnụ ekpere gị? Mbanụ. Isi Chineke enweghị ike iju eju. N’anya ya kwa, ị “dị oké ọnụ ahịa karịa ọtụtụ nza.”—Matiu 10:29, 31.
ỤZỌ CHINEKE SI EME IHE: Baịbụl kwuru na mmadụ enweghị ike “ịchọpụta ọrụ ezi Chineke rụrụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.” (Ekliziastis 3:11) Ihe ọ pụtara bụ na anyị enweghị ike ịmata ihe niile gbasara Chineke. Anyị enweghị ike “ịchọpụtacha” ụzọ Chineke si eme ihe. (Ndị Rom 11:33) Ma, Chineke dị njikere ime ka ndị chọrọ irubere ya isi mata ụzọ ya.—Emọs 3:7.
Anyị agaghị amatali afọ ole Chineke dị, otú ọ na-aghọtaru ihe, na otú ọ maruru ihe
Uru ọ ga-abara gị: Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl, ị ga na-amụta ihe ọhụrụ gbasara Chineke na ụzọ ya. Ihe ọ pụtara bụ na i nwere ike ịna-abịaru Nna anyị nke eluigwe nso ruo mgbe ebighị ebi.
Ihe Ndị Ị Ga-amatali Gbasara Chineke
Na anyị enweghị ike ịmata ihe ụfọdụ gbasara Chineke apụtaghị na anyị agaghị amatali Chineke. Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe ga-enyere anyị aka ịmata Chineke nke ọma. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha:
AHA CHINEKE: Baịbụl gwara anyị na Chineke gụrụ onwe ya aha. Chineke sịrị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.” Ugboro ole aha Chineke gbara na Baịbụl karịrị ugboro ole aha ndị ọzọ gbara. Ọ gbara ihe dị ka ugboro puku asaa.—Aịzaya 42:8.
Uru ọ ga-abara gị: Mgbe Jizọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, ọ sịrị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) I kwesịkwara ịkpọ aha Chineke mgbe ị na-ekpe ekpere. Jehova dị njikere ịzọpụta onye ọ bụla ji aha ya kpọrọ ihe.—Ndị Rom:10:13.
EBE CHINEKE BI: Baịbụl kwuru na e nwere ebe abụọ ndị dị ndụ bi. Otu bụ ụwa a anyị bụ́ ụmụ mmadụ bi, nke ọzọ abụrụ ebe ndị mmụọ bi. (Jọn 8:23; 1 Ndị Kọrịnt 15:44) Ihe Baịbụl kpọrọ ebe ndị mmụọ bi bụ “eluigwe.” Onye kere anyị bikwa “n’eluigwe.”—1 Ndị Eze 8:43.
Uru ọ ga-abara gị: Ị ga-amata onye Chineke bụ nke ọma. Onye kere anyị abụghị ikike a na-anaghị ahụ anya nke dị́ ebe niile nakwa n’ihe niile. O nwere Ndị Hibru 4:13.
onye bụ Jehova, o nwekwara ebe o bi. “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya.”—ÀGWÀ CHINEKE: Baịbụl kwuru na Jehova nwere àgwà ndị mara mma. “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) ‘Ọ pụghị ịgha ụgha.’ (Taịtọs 1:2) Ọ dịghị ele mmadụ anya n’ihu, ọ na-eme ebere, na-eme amara, ọ naghịkwa ewe iwe ọsọ ọsọ. (Ọpụpụ 34:6; Ọrụ Ndịozi 10:34) O nwere ike iju ọtụtụ ndị anya na ọ na-agụ Onye kere anyị agụụ ka ya na ndị na-akwanyere ya ùgwù “na-enwe mmekọrịta chiri anya.”—Abụ Ọma 25:14.
Uru ọ ga-abara gị: Gị na Jehova nwere ike ịbụ enyi. (Jems 2:23) Ka ị na-amụtakwu àgwà Jehova, ị ga na-aghọtakwukwa Baịbụl.
“CHỌỌ YA”
Baịbụl kọwara onye Jehova Chineke bụ nke ọma. Ọ bụghị onye anyị na-agaghị amatali. Ọ chọdịrị ka anyị mata onye ọ bụ. Okwu ya, bụ́ Baịbụl, gwara anyị, sị: “Ọ bụrụ na ị chọọ ya, ọ ga-ekwe ka ị chọta ya.” (1 Ihe E Mere 28:9) Gbalịa na-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe ị gụrụ echiche, ka i wee mata Chineke. Ị na-eme ya, Baịbụl kwuru na Chineke ‘ga-abịaru gị nso.’—Jems 4:8.
Ma, i nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ebe ọ bụ na enweghị m ike ịmata ihe niile gbasara Onye kere anyị, oleezi otú mụ na ya ga-esi bụrụ enyi?’ Chebara ihe a echiche: Ọ̀ bụ iwu na ezigbo enyi onye dọkịta na-awa ahụ́ ga-abụrịrị onye dọkịta? Mbanụ! Enyi ya nwere ike ịbụ onye nwere aka ọrụ ọzọ. Ma, ya na onye ahụ ka nwere ike ịbụ enyi. Naanị ihe ka mkpa bụ na enyi onye dọkịta ahụ ga-amata àgwà ya nakwa ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-anaghị amasị ya. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ị ga-eme ma ị chọọ ka gị na Jehova bụrụ enyi. Ị ga-amụ Baịbụl mata ụdị onye Jehova bụ. Ọ gwụla ihe ọ dị mkpa ka i mee ka gị na ya bụrụ enyi.
Baịbụl agwaghị anyị ihe na-edochaghị anya gbasara Onye kere anyị. Kama, ọ gwara anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ịmata onye Chineke bụ. Ị̀ ga-achọ ịmatakwu Jehova Chineke? Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl na-anaghị ha ego. Ị chọọ ka gị na ha mụwa Baịbụl, gbalịa gwa Ndịàmà Jehova nọ́ n’ebe i bi ma ọ bụkwanụ gị agaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.mt1130.com/ig.